Ukamaka Olisakwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ukamaka Olisakwe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Ọktoba 1982 Dezie
Ebe ọmụmụKano Dezie
Ọrụ ọ na-arụode akwukwo ifo, onye nhazi ederede Dezie
Ọrụ ama amaEyes of a goddess. Dezie
Odee akwụkwọEyes of a goddess., Ogadinma: Or, Everything Will Be All Right. Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Ukamaka Evelyn Olisakwe (amụrụ 24 Oktoba 1982) bụ onye ode akwukwo banyere ikike nwaanyi nke Naijiria, onye ode akwukwo nkpirikpi, na onye ederede ihe ngosi. N’afọ 2014, ahoputara ya ka otu n’ime mmadu iri-ato na itolu ndi edemede kachasi mma ma n'erubeghi afọ anọ na Sub-Saharan Afrika nke egosiri na ọrụ Africa39 ma tinye na Africa39: New Writing from Africa South of the Sahara (nke Ellah Allfrey doziri).[1][2][3]

Ukamaka Evelyn Olisakwe amuru ma zulite na Kano Steetị, Naijiria. Ndị mụrụ ya bụ ndị Igbo Naijiria. Ọ gụsịrị ụlọ akwụkwọ sekọndrị na-ugwu Hausa wee nweta nzere mmụta sayensị na Kọmputa site na Mahadum Abia State Polytechnic, na Aba, Nigeria.[4]

Ọ lụrụ George Nwanosike Olisakwe ma ha na ụmụ ha atọ biri na ala Igbo Naijiria.

Ọrụ edemede[dezie | dezie ebe o si]

Edere akwụkwọ Olisakwe nke izizi, Eyes of a Goddess, pụtara n’afọ 2012.[5]

O deela ọtụtụ akụkọ na isiokwu dị mkpirikpi, ọtụtụ n'ime ha pụtara na blọọgụ na akwụkwọ akụkọ n'ịntanetị, gụnyere Olisa.tv, Saraba, Sentinel Nigeria na Short Story Day Africa.[6] E gosiputala ya na BBC. Edemede ya apụtawo na The New York Times na akwụkwọ akụkọ dị iche iche gụnyere Nigerian Telegraph na African Hadithi.[7] O dere ihe ngosi maka Calabash,[8] ihe onyonyo telivishọn nke Obi Emelonye mepụtara ma duzie ma gosipụta ya na Jenụwarị 2015 na Africa Magic Showcase.[9] Olisakwe na-elekọta blọgụ ahụ maka "Writivism Mentorship Programme", bụ ọrụ nke Centre for African Cultural Excellence, bụrụkwa onye na-akwado nkwado na Lagos Workshop.[10] Ọ bụ onye ọbịa na onye soò na Ake Arts and Books Festival[11] emere na 2014[12] na Hay Festival[13]. Ọ bụkwa onye nnọchi anya na 8th Pan African Congress, nke e mere na Ghana.

A họpụtara ya dika otu n'ime ndị ederede akwụkwọ iri atọ na itoolu ga-eme ofụma ma erubeghi afọ iri anọ site na Sub-Saharan Africa na obodo oyibo. Ọ bụ ndi Africa39 [14]- ụlọ orụ nke mmekọ Hay Festival na Rainbow Book Club - haziri maka ememe nke UNESCO World Book Capital 2014. Otu onye tụlere kọwara ọrụ Olisakwe, "This Is How I Remember it" ka "akụkọ doro anya banyere edemede ihunanya nwa agbọghọ na Naịjirịa" na akụkọ "nke di ezigbo mma mere na ọ hapụrụ anyị ịchọ karịa"[15], ma onye nyocha ọzọ kọwara ya dị ka "akụkọ na-ejide mmụọ banyere mmekọrịta agbogho, aghụghọ na ochicho''.[16]

Na 2016, Olisakwe bi na Mahadum Iowa maka mmuta International Writing Program[17] a haziri ebe ahụ. Na 2018, Ukamaka meriri ohere agụmakwụkwọ nke Vermont College of Fine Arts haziri maka iji nweta nzere mastas na Ederede na Mbipụta.[18]

Olisakwe bụ onye ọbịa na 2015 Writivism Festival a haziri na Kampala, Uganda, ebe ọ kuziri maka akụkọ ifo na klas ndị ọkachamara.[19] Na 28 Mee 2015, o kwuru okwu gbasara isiokwu nke “You Could Stop The Next Maternal Death Statistic” na TEDxGarki.[20]

Nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

  • 2014: Otu niime ndị odịde akwụkwọ na-erubeghi afọ iri anọ nke Africa39 mata.
  • 2014: depụtara ọrụ ya dika otu niime akwụkwọ nari kachasi mma n'afọ 2010 ruo 2014 maka Eyes of a Goddess.[21]

Ederede ya[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

Obere akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Ukamaka Olisakwe. "Girl to Woman", Sentinel Nigeria, May 2011.[22]
  • Ukamaka Olisakwe. "This is how I remember it", Africa39: New Writing from Africa South of the Sahara, October 2014.[23]

Edemede Isiokwu[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Africa39 "list of artists", Hay Festival.
  2. "Africa39 list of promising writers revealed", The Bookseller, 8 April 2014.
  3. Africa39 Authors Biographies, hayfestival.com.
  4. Mikael Mulugeta. "'I was able to be the main subject of my writing': Ukamaka Olisakwe on becoming a writer, the new generation of female Nigerian authors", Iowa Now, 1 November 2016. Retrieved on 18 March 2017.
  5. Hay Festival.
  6. cacedirector (2014-10-30). 2015 Writivism Mentors (en).
  7. (2014) in Allfrey, Ellah Wakatama: Africa39: New Writing from Africa South of the Sahara. Bloomsbury, PT512. ISBN 978-1-62040-780-6. 
  8. Akinseye, Isabella. "Spotlight on Ukamaka Olisakwe", 14 January 2015. Retrieved on 3 February 2015.
  9. "Exciting January for Africa Magic Viewers!" Africa Magic, 14 January 2015.
  10. "Nigeria: Writivism to Engage Readers and Writers in 2015", The Guardian, 7 January 2015.
  11. "Soyinka, Obasanjo, Amaechi, others for Ake Festival", Nigerian Tribune. Retrieved on 3 February 2015.
  12. Ukamaka Olisakwe. Ake Arts & Book Festival. Retrieved on 3 February 2015.
  13. Ukamaka Olisakwe. Hay Festival 2014. Retrieved on 3 February 2015.
  14. Abodunrin, Akintayo. "Africa39 Writers Unveiled at London Book Fair", Nigerian Tribune, 13 April 2014.
  15. Forbes, Malcolm. "Continental drift: Africa39, an anthology of writing from south of the Sahara, is too good to miss", The National, 23 October 2014.
  16. Walia, Shelley. "Creativity and dissidence", The Hindu, 4 March 2015.
  17. Mikael Mulugeta. "'I was able to be the main subject of my writing': Ukamaka Olisakwe on becoming a writer, the new generation of female Nigerian authors", Iowa Now, 1 November 2016. Retrieved on 18 March 2017.
  18. Internationally acclaimed Nigerian author earns VCFA’s 2018 Emerging Writer Scholarship (en-US) (2018-05-16).
  19. http://writivism.com/?page_id=2603
  20. "You could stop the next maternal death statistic | Ukamaka Olisakwe | TEDxGarki". YouTube
  21. "The TIA 100 – Best Books, 2010-2014", This Is Africa, 24 December 2014.
  22. "A Girl from Montana", The Enigma Woman, UNP - Nebraska, pp. 11–30, ISBN 978-0-8032-0692-2, retrieved 2020-05-30
  23. Continental drift: Africa39, an anthology of writing from south of the Sahara, is too good to miss (en).