Ukelle people (Nigeria)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ndị Ukelle
agburu
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaȮra Cross River Dezie

Ndị Ukelle (Ba'kelle) mejupụtara ihe dịka ọkara nke ndị bi na mpaghara Gọọmentị Yala na Cross River State, Nigeria. [Tinye edensibịa]Ndị Ukelle bikwa na Utonkon nke dị na Benue State. Asụsụ ndị Ukelle bụ Kukelle.[Tinye edensibịa]

Ndị isi otu n'etiti Ukelle bụ:

  • Ukelle nke dị n'ebe ugwu Cross River State: Ndị otu nọ ebe a bụ Wanihem (gụnyere Wanibolor), Wanikade (gụnyere Uzenyi), Wanokom (gụnyere Otikili) na Uzekwe (gụnyere Okom)[Tinye edensibịa]
  • Ukelle nke dị ndịda dị kwa na Cross River State: Ndị otu nke a bụ Uzilagar (Ijiraga), Uzikatom, Uzokom (Ujokom) na Otiligom (Ntrigom)[Tinye edensibịa]
  • Effiom, Uffiom, Amuda(Idzem) na Okpoto, ndị nke nọ na Ebonyi State[Tinye edensibịa]
  • Uffia (Wanffia) ndị nke nọ na Benue State.

Asụsụ[dezie | dezie ebe o si]

Ụfọdụ ndị ọchịchị na-nchịkọta asụsụ na ekwu na asụsụ Kukelle dị ka nke sonye na otu asụsụ nke Benue-Congo dị ka esi ekewa asụsụ n'Afrika.[1] Mana, E. Alagoa na akwụkwọ ya Groundwork of Nigerian History kọwakwuru ndị Ukelle dị ka ndị na-asụ otu n'ime asụsụ Cross River.[Tinye edensibịa]

Chọọchị Lutheran nke Naịjirịa, site na Literature Centre ya na Wanikade, sụgharịrị Agba Ọhụrụ nke Bible n'asụsụ Kukelle na afọ 1979.[Tinye edensibịa]

Ntọala n'akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Ntọala n'akụkọ ihe mere eme nke Ukelle ka dị obere. Ụfọdụ na-ekwu na ndị nna nna ha si na Benue steeti gbadaa, ndị ọzọ na-ekwu na ndị nna nna ha nwere ike isi n'ala Igbo, ma ọ bụ ndị nke nọgharị anọgharị ma ọ bụ achụpụrụ maka mbata nke ndị Igbo.[Tinye edensibịa] Ndị Ukelle na ndị agbata obi ha Igede nke Benue steeti na ndị Yala nke Cross River steeti nwere ọdịiche ọdịbendị nke yiri onwe ha.[2] Emume ha ndị dị mkpa dị ka agbamakwụkwọ, olili ozu na ịgba egwú yiri nke ọma.[Tinye edensibịa] Ndị Ukelle na akpọ ndị Yala ndị Ollah, ndị Igede dị ka Olah-ewoh na ndị Idoma nke Benue dị ka Oloh-akpoto.[Tinye edensibịa]

Ebe ha nọ ma ọ bụ ebe a pụrụ ịchọta ha[dezie | dezie ebe o si]

Mpaghara Ukelle nke bụ isi (gụnyere Ukelle nke ugwu, Ukelle ndịda na Uffia) bụ nke nwere oke site n'akụkụ ndị Igede nke Benue steeti dị n'ebe ugwu, ma nwee oke ya na ndị Izzi nke Ebonyi Steeti nke dị n'ebe ndịda na ọdịda anyanwụ, na oke n'akụkụ ndị Yala na Yatche nke Cross River Steeti.[Tinye edensibịa] Ọtụtụ n'ime ala Ukelle na Cross River State bụ maka ọrụ ugbo. Mana, mmepe ime obodo na-abata ngwa ngwa na Ukelle. Inye ọkụ eletrik n'ebe ugwu Ukelle na iwu àkwà mmiri n'ime ime obodo Ukelle bụ ihe ịrịba ama nke imepe obodo.[Tinye edensibịa] Ji (ụdị dị iche iche), akpu, osikapa na idowe anụ ụlọ bụ isi ọrụ ugbo nke ndị Ukelle.[Tinye edensibịa]

Gọọmentị na ọdịbendị[dezie | dezie ebe o si]

Na mpaghara Ukelle, ikike gọọmentị kwa ụbọchị dị na aka nzukọ obodo (nke a na-akpọ ojilla).[Tinye edensibịa] Ndị mejupụtara nzukọ obodo ahụ bụ eze ma ọ bụ otu ndị isi ya, ndị okenye na ndị ntorobịa. N'oge gara aga, obodo Ukelle nwere ọgbọ ma ọ bụ ogige ọgbakọ nke ojilla nọ n'etiti ya.[Tinye edensibịa] Obodo ọ bụla nke ndị Ukelle bi na ya ga-enwerịrị ojilla ma ọ bụ ewere ha dị ka ihe mgbakwunye n'ebe ndị Ukelle ndị ọzọ bi ndị nke nwere ojilla.[Tinye edensibịa] N'ezie, a na-eji okwu ojilla n'agbanwe okwu pụtara ọgbọ ma ọ bụ ogige ọgbakọ obodo.

Otu ìgwè obodo nta mejupụtara otu agbụrụ (nke a na-akpọ essam). Dịka ọmụmaatụ, na Wanikade, e nwere essam atọ: Ogumogum, Otuka na Opuolom n'otu n'otu.[Tinye edensibịa] Nzukọ ahụ na-ekpebi esemokwu n'ime obodo ọ bụla, ebe nzukọ nke ezinụlọ ahụ na-edozi esemokwu n'etiti obodo nta dị n'ime otu agbụrụ. A na-edozi esemokwu dị n'etiti obodo nta dị n'ihe karịrị otu essam yana ihe ndị dị ka ntaramahụhụ ọnwụ, ojiji akụ na ụba nke osisi, ọhịa, osimiri na nzukọ a na-akpọ lutse. Eze (ubet) ma ọ bụ onyeisi (uyini) nwere ike dị ka nanị n'aha na abughị ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị.[Tinye edensibịa]

Emume olili ozu (kulu) maka ndị nwụrụ anwụ na Ukelle bụ ọrụ ọdịnala nke ezinụlọ na obodo ahụ.[Tinye edensibịa]

Ajikọtara ndị Ukelle site na gọọmentị kansụl mpaghara abụọ na ngalaba anọ nke gọọmentị ime obodo Yala na ngalaba abụọ nke gọọmentụ ime obodo Ishielu na Ebonyi.[Tinye edensibịa] Ukelle nwekwara onye nnọchi anya na ụlọ ọgbakọ iti iwu nke Cross River State.[Tinye edensibịa]

Emume[dezie | dezie ebe o si]

Ndị Ukelle na-eme emume dị iche iche, nke kachasị ewu ewu bụ emume Ji ọhụrụ (likpee) nke a na-eme iji gosi mmalite nke oge owuwe ihe ubi. Tupu likpee, ha nwere ike ewere obere owuwe ihe ubi dị ka iwere akwụkwọ nri na ịkpata nri site n'ugbo dị nso n'ụlọ.[Tinye edensibịa]

Esemokwu[dezie | dezie ebe o si]

Afọ iri abụọ gara aga ahụla mmụba nke esemokwu n'ime ihe ike maka ala na ihe onwunwe n'etiti ndị Ukelle.[Tinye edensibịa] Esemokwu ndị a ma ama gụnyere nsogbu nke dị n'etiti Ukelle - Izzi na nke Wanihem na Wanikade.[3] Nrịwanye elu agha na esemokwu nwere ike isite na ịmekọrịta, na ọnụ ọgụgụ na-arịbawanye elu. Enweghị ndị agha ma ọ bụ ndị uwe ojii dị ukwuu n'ime ala nna Ukelle nwekwara ike ịso ma na-enye aka na esemokwu[Tinye edensibịa]. Na mgbakwunye, ndị ọrụ National Boundary Commission emebeghị ka ókèala kwesịrekwesị doo anya.[4]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Greenberg (1966). The Languages of Africa. Indiana University. 
  2. E. J. Alagoa, Groundwork of Nigerian History; Obaro Ikime (ed) Heinemann Books, 1980.
  3. Cross River - Ebonyi communal conflict escalates.
  4. FG wades into Cross River - Ebonyi land dispute.