Umu Obiligbo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Umu Obiligbo
musical duo
mba o sịNaijiria Dezie
Ebe ọmụmụAnambara Steeti Dezie
Ọrụ ọ na-arụrecording artist, performing artist Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2014 Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
ụdịhighlife Dezie

Umu Obiligbo bu ndi egwu mmadụ abụọ na-agụkọ egwu ọnụ na Naijiria akpọrọ Chukwuebuka Akunwafor Obiligbo na Ifeanyichukwu Okpuozor Obiligbo. E ji egwu ọdinala nke bekee kpọrọ hilife, arụmọrụ na ụzọ Igbo si eme egwu mara ha. [1] Ha nwetara Ihe nrite "Otu ndị Afrika kacha mma” na oge “Afrikan Muzik Magazine Awards” (AFRIMMA) nke afọ 2020. [2]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Umu Obiligbo bụ ndị Nteje na Gọọmenti Ime Obodo Oyi na Steeti Anambra , nke Naijiria. A mụrụ ha ma zụlitekwa ha na Nkpor, obodo di Onitsha nso, ebe ha gụrụ akwụkwọ nke ogo praịmarị na sekọndịrị.[3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Umu Obiligbo bipụtara abọm mbụ ha nke ha kpọrọ “Ife Di Mma” na abalị iri na otu nke ọnwa Febrụwarị afọ puku abụọ na ịrị na anọ (11 February 2014), ma zipụtakwa Ep (Extended playlist) ọzọ nke ha kpọrọ “Udo Ga Di” na abalị iri atọ ọnwa Decemba na afọ ahụ.. Ha wepụtara EP ọzọ nke a kpọrọ “Awele” na ọnwa Decemba afọ puku abụọ na ịrị na asatọ (December 2018) nke Flavour pụtara na egwu nke akpọrọ ‘Awele’ na ihe oyoyo ya pụtara ka e mesịrị .[4][5] Na abalị iteghete nke ọnwa atọ na afọ puku abụọ na ịrị na iteghete ( April 9 2019), ndị ọgụ egwu a mepụtara egwu ọzọ a kpọrọ ‘Culture’ nke Flavour na Phyno.[6][7] pụtara na ya. Na abalị iri na isii ọnwa Nọvemba afọ puku abụọ na ịrị abụọ (16 November 2020) ha zipụtara abọm “Signature (Ife Chukwu Kwulu).”[1] Ha pụtara na egwu Basketmouth's Yabasi saụndtrak abọm [8] pụtakwa na egwu abụọ maka Rattlesnake saụndtrak ha na Larry Gaaga.[9]

Ihe ngosi[dezie | dezie ebe o si]

Abọm/EP

  • Ife Di Mma (2014)
  • Udo Ga Di (2014)
  • Awele (2018)
  • Signature (Ife Chukwu Kwulu) (2020)

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Ihe nrite Otu Onye ahọpụtara/ọrụ Nsonaazụ Ref
2020 African Muzik Magazine Awards Ihe nrite otu ndị Africa kacha mma style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie [2]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Alake (2020-11-22). Umu Obiligbo - Signature [Ife Chukwu Kwulu [Album Review]] (en). Pulse Nigeria. Retrieved on 2021-09-18.
  2. 2.0 2.1 Umu Obiligbo recognised at AFRIMMA 2020, See complete list of winners (en-US). Sidomex Entertainment (2020-11-24). Retrieved on 2021-09-18.
  3. Igwenagu (2020-01-17). Biography & Net Worth Of Umu-Obiligbo (en-US). Nigerian Informer. Retrieved on 2021-09-18.
  4. Debola (2018-12-13). See Flavour in "Awele", featuring high-life duo, Umu Obiligbo (en-US). The NATIVE. Retrieved on 2021-09-18.
  5. DAMILOLA (2018-12-12). Watch "Awele" By Flavour Featuring Umu Obiligbo (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News. Retrieved on 2021-09-18.
  6. Njideka (13 April 2019). Umu Obiligbo Features Phyno And Flavour In "Culture" | The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News — Guardian Life — The Guardian Nigeria News – Nigeria and World News (en-US). m.guardian.ng. Retrieved on 2021-09-18.
  7. Jennifer (11 April 2019). Umu Obiligbo features Phyno & Flavour in Culture - P.M. News (en-US). Retrieved on 2021-09-18.
  8. [Album Basketmouth – “Yabasi” ft. Duncan Mighty, Ice Prince, Oxlade, & Many More] (en-US). tooXclusive (2020-11-30). Retrieved on 2021-12-01.
  9. Alake (2020-12-04). ALBUM REVIEW: Larry Gaaga - Rattle Snake: The Ahanna Story [Soundtrack]. Pulse Nigeria. Retrieved on 2021-09-20.