Uncama

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Uncama bụ dike akụkọ ifo ọdịnala Zulu.[1] A maara ya maka njem I na aga n'okpuru ụwa na nloghachi ya mgbe o chọpụtara ihe gbasara ya.[2]

Ihe nnọchianya[dezie | dezie ebe o si]

Nkọwa nke Uncama na abukari site na ihe ọ gabigara n'okpuru ụwa, nke ọ gàrà n"ihi iwe ya na-ebe porcupine nke na'aga n' ogige ọka ya. A maara na o nwere nwunye, Mana ekwuputaghị aha ya n'akụkọ ifo ya.[2]

Njem n'okpuru ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Uncama na nwunye ya biri n'otu obodo ma na-elekọta ubi ọka ya kwa ụbọchị. Otu ụbọchị, ọ chọpụtara na ọka ya, nke a na-eche na ha erugo maka owuwe ihe ubi, bụ nke porcupine riri. Nke a gara n'ihu ruo ọtụtụ ụbọchị, Uncama were wee iwe n"ebe porcupine ahụ nọ.[3]

Mgbe oge ụfọdụ gasirị, o kpebiri na ọ ga-eteta n'oge ka ya nwee ike ma soro porcupine ahụ laghachi ebe o si bịa. O jisiri ike mee nke a site n'enyemaka nke igirigi ụtụtụ. N'otu akụkọ, Uncama sooro ụzọ nke porcupine site n'ịchọta ụzọ ebe igirigi ụtụtụ gbasagoro.[4]

Na njedebe nke ụzọ porcupine gáfèrè, Uncama hụrụ oghere n'ala. O chere na ọ bụ olulu na-adịghị omimi, mana ka ọ na'agbadata, ọ dịghị njedebe ọ hụrụ.N'ikpeazụ, ọ ruru na njedebe nke oghere ahụ, wee chọpụta otu obodo, ebe ụmụaka na-ebe ákwá na anwụrụ ọkụ na agbagọ 'elu. Uncama tụrụ egwu na ọ nwere ike ịchọta onwe ya n'ebe obi ọjọọ, ya mere ọ gbapụrụ.[1]

Uncama mechara laghachi n'obodo ya. Mgbe ndị obodo ahụ na nwunye ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha n'anya, ebe ọ bụ na ha chere na Uncama anwụọla ma lie ihe ya niile n"ọnọdụ ozu ya.[4]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Kwase Benefo
  • Uhlakanyana
  • Okpukpe ọdịnala ndị Zulu

Edemsibia[dezie | dezie ebe o si]