United Nations Security Council Resolution 2331

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

United Nations Security Council Resolution 2331
United Nations Security Council resolution
na-esochiUnited Nations Security Council Resolution 2330 Dezie
ndị sotereUnited Nations Security Council Resolution 2332 Dezie
afọ/ụbọchị mbipụta20 Disemba 2016 Dezie
full work available at URLhttps://undocs.org/S/RES/2331(2016) Dezie
voted on byUnited Nations Security Council meeting Dezie
series ordinal2331 Dezie
law identifierS/RES/2331 Dezie
United Nations Security Council Resolution 2331

Mkpebi nke afọ 2331 nke otú United Nations Security Council kwadoro n'otu olu site na United Nations Security Council n'ọnwa Disemba 20, 2016. Ndị otu Kansụl Nchebe katọrọ, n'okwu siri ike, ọnọdụ niile nke ịzụ ahịa mmadụ na mpaghara ndị agha metụtara. Mkpebi ahụ na-ekwusi ike na ịzụ ahịa mmadụ na-emebi iwu ma na-enye aka n'ụdị mpụ ndị ọzọ a haziri ahazi, nke òtù ndị na-eyi ọha egwu nwere ike inweta ego, mee ka ọkwa ha sie ike ma nweta mmekọahụ na ndị ohu ọrụ. Islamic State, ọkachasị, anwaala ibibi okpukpe na agbụrụ dị nta dị ka Yezidis nke Iraq.[1][2]

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

A na-arụrịta ụka banyere ịzụ ahịa mmadụ n'ụbọchị ahụ dum. Mba United Kingdom tụrụ aro na a ga-eme ihe n'ụwa niile dịka ịnakọta ihe akaebe nke mpụ ndị IS mere na mba Iraq. Odeakwụkwọ ukwu Ban Ki-moon kpọrọ ya nsogbu zuru ụwa ọnụ ma kwuo na ụmụnwanyị, ụmụaka, na ndị gbara ọsọ ndụ nọ na mpaghara esemokwu bụ ndị kachasị nwee nsogbu na nke a. Maazị Moon gosipụtara ihe atụ. O kwuru banyere otu ndị na-eyi ọha egwu na mba Naịjirịa, Boko Haram, bụ ndị mere ka ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ bụrụ ndị ohu mmekọahụ, na Steeti Okpụkperechi Alakụba nke a kpọrọ Islamic State n'asụsụ bekee, bụ ndị tụrụ ụmụagbọghọ a tọọrọ n'aka ndị okpukpe Yezidi na na mba Iraq ma ree ha n'ahịa ndị ohu. Onye nnọchi anya ya pụrụ iche maka ime ihe ike mmekọahụ n'ọnọdụ esemokwu, Zainab Hawa Bangura, kwuru na ọtụtụ ndị otu na-eme ihe ike na-eji ime ihe ike mmekọahụ dị ka ụzọ iji tụọ ndị mmadụ ụjọ. Ụlọ ọrụ ya kọwara ọnọdụ isii iji chọpụta ikpe ahụ:

  • Ndị na-eme ihe ike na ndị na-eyi egwu na-eme ya n'usoro;
  • A na-eji ya eme ihe iji gbasaa egwu;
  • A na-akwụ ụgwọ iyi ọha egwu site na ya;
  • A na-elekwasị anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, agbụrụ na okpukpe;
  • Ọ bụ atụmatụ iji mee ka ndị agha dị egwu, nweta, jide ma ọ bụ kwụọ ndị agha ụgwọ;
  • Ọ bụ akụkụ nke echiche iji chịkwaa ahụ ụmụnwanyị, mmekọahụ na ịmụ nwa;

Onye na-ahụ maka ikike ụmụnwanyị Yazidi bụ Ameena Saeed Hasan kwuru na IS atọrọla ma ree ihe karịrị puku isii (6,000) ụmụnwanyị Yazidi na ụmụaka n'ahịa ndị ohu, n'okpuru ụkpụrụ na amaghị nwoke nke ụmụagbọghọ ahụ aghọwo "ọnụ ụzọ na paradaịs" (maka ndị agha IS). O mere mkpesa banyere ịgbachi nkịtị nke ndị isi Alakụba ma na-eche ihe kpatara na e meghị ihe agha megide otu ahụ. Onye nnọchi anya ọma maka ùgwù nke ndị lanarịrị ịzụ ahịa mmadụ Nadia Murad Base Taha, ekwuputala na ihe karịrị ndị Yazidi 3,000 ka nọ n'aka ndị IS.Ọ jụrụ ihe mere na enweghị nyocha na enweghị ụlọ ikpe iji kpee ndị omekome ikpe.

Ọdịnaya[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2000, na nkwekọrịta nke otú United Nations megide mpụ a haziri ahazi nke mba ụwa, e kwekọrịtara nkọwa nke "ịzụ ahịa mmadụ" na nke mbụ ya, ma guzobe usoro iji dozie ya. A gwara mba ole na ole na-anabataghị na nkwekọrịta a dị iche iche ka ha mee nke a ma mee ihe ozugbo megide ịzụ ahịa mmadụ. Ọ bụrụ na a na-azụ ahịa mmadụ na mpaghara esemokwu, esemokwu ahụ nwere ike ịdọrọ ma ka njọ. Maka ndị otu na-eyi ọha egwu, dị ka Islamic State, ime ihe ike mmekọahụ megide okpukpe na agbụrụ dị nta, nke jikọtara ya na ịzụ ahịa mmadụ, bụ akụkụ nke usoro, atụmatụ na echiche iji nweta ego, ike na ndị otu na ibibi obodo. Ndị otu Boko Haram, Al-Shabaab na Resistance Army na-azụkwa ndị mmadụ maka ịgba ohu mmekọahụ na ọrụ mmanye. A gwara mba dị iche iche ka ha wulite ọkachamara n'ihe ọmụma banyere otu esi ejikwa ego na ego maka iyi ọha egwu site na ịzụ ahịa mmadụ, iji kwụsị imekọ ihe ọnụ a n'etiti ha na ụlọ ọrụ onwe ha. A gbakwara ha ume ka ha kụziere okpu agha na-acha anụnụ anụnụ iji dozie ịzụ ahịa mmadụ na ime ihe ike mmekọahụ tupu ha ahapụ ọrụ UN.

Kọmitii Nchebe nke UN tụlere iwebata mmachibido iwu megide ndị na-etinye aka na ịzụ ahịa mmadụ na ime ihe ike mmekọahụ na mpaghara esemokwu. A ghaghị iwere ndị ha metụtara dị ka ndị iyi ọha egwu.

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. United NationsS/RES/2331 (2016)Security Council
  2. SC condemns human trafficking in strongest terms (en). Verenigde Naties (20 December 2016). Retrieved on 10 January 2017.