Uzo Uwani

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Uzo Uwani
local government area of Nigeria
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaEnugwu Steti Dezie
nhazi ọnọdụ6°45′0″N 7°12′0″E Dezie
has boundaryȮra Kogi, Anambara Steeti Dezie
Map
Palm tree vegetation at Uzo-uwani on our pathway to Adada Waterfall

Uzo-Uwani bụ ógbè Gọọmentị Obodo nke Enugwu Steeti, Naijiria nke dị n'ókè Kogi Steeti na Anambra Steeti. Isi ụlọ ọrụ ya dị n'obodo Umulokpa . O nwere mpaghara nke 855 km2 na ọnụ ọgụgụ mmadụ 124,480 na ọnụ ọgụgụ afọ 2006. Koodu ozi nke mpaghara ahụ bụ 411.[1]

Mwakpo[dezie | dezie ebe o si]

Uzo-Uwani nwetara mwakpo ọbara ọbara nke ndị na-eyi ọha egwu na Eprel 25, afọ 2016 na mpaghara Nimbo. Obodo nta asaa nke Nimbo- Ekwuru, Ngwoko, Ugwuijoro, Ebor, Enugu-Nimbo, Umuome na Ugwuachara wakporo, ihe karịrị ndị na-azụ atụrụ Fulani 500 ji ngwá agha gbuo ọtụtụ ndị mmadụ, nke a kpọrọ òtù iyi egwu nke anọ kachasị njọ n'ụwa, n'isi ụtụtụ nke Eprel 25, afọ2016.[2] N'oge mwakpo ahụ, a gbara ụlọ ụka Roman Katọlik nke obodo ahụ ọkụ.[3][4][5][6]

Dị ka gọvanọ Enugwu Steeti, Ifeanyi Ugwuanyi si kwuo, iyi ọha egwu na Nimbo nwere ike ime n'ihi enweghị ike nke ụlọ ọrụ nchekwa iji mee ihe nke ọma na akụkọ nzuzo banyere ndị na-azụ atụrụ na-agbakọta na Odolu dị nso na Kogi Steeti na nkwadebe maka mwakpo.[7] Mwakpo a wakporo Nimbo sochiri mwakpo yiri nke ahụ na Abbi, obodo Uzo-Uwani ọzọ, ebe a kọrọ na e gburu nwanne nwoke na nwanne nwanyị-Fidelis na Mercy Okeja ozugbo, na mmadụ iri na itoolu kwuru na ha efuola ebe ụlọ asaa na ọgba tum tum tum bibiri, na mbido Febụwarị afọ 2016.[8]

Abo Foto[dezie | dezie ebe o si]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Post Offices- with map of LGA. NIPOST. Archived from the original on 2012-11-26. Retrieved on 2009-10-20.
  2. Global Terrorism Index: Nigerian Fulani militants named as fourth deadliest terror group in world. www.independent.co.uk (November 18, 2015). Retrieved on May 19, 2016.
  3. Photos From Nimbo Massacre, Six More Bodies Recovered, Ugwuanyi Doles Out 5M To The Community. www.easternradio.com.ng (April 27, 2016). Archived from the original on May 4, 2016. Retrieved on April 29, 2016.
  4. Breaking news: Many feared killed as Fulani herdsmen invade Enugu communities. www.vanguardngr.com (April 25, 2016). Retrieved on April 26, 2016.
  5. Bloodbath in Enugu as Fulani herdsmen kill 40. www.vanguardngr.com (April 26, 2016). Retrieved on April 26, 2016.
  6. ‘Scores Killed’ in Suspected Attacks by Fulani Herdsmen in Nigeria. europe.newsweek.com (April 26, 2016). Retrieved on April 27, 2016.
  7. I alerted security operatives before Fulani herdsmen attack, says Ugwuanyi. www.vanguardngr.com (April 30, 2016). Retrieved on April 30, 2016.
  8. Fulani herdsmen invade Enugu community kill two, 19 missing. www.vanguardngr.com (February 14, 2016). Retrieved on May 1, 2016.

Àtụ:Enugu State