Uzoma Emenike

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Uzoma Emenike
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ebe ọmụmụSteeti Abia Dezie
Ọrụ ọ na-arụdiplomat, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie

Uzoma Ikechi Emenike (a mụrụ na Steeti Abia, Naịjiria) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjiria, odee na onye nnọchite anya. [1] Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka onye nnọchite anya Naịjiria n'United States of America kamgbe nhọpụta na mwube ya na 2021. [2] Ọ bụ nwaanyị nnochite Naịjiria mbụ na United States kamgbe e hiwere mmekọrịta mba na mba n'etiti mba abụọ a. [3]

Emenike gara Mahadum Maiduguri ebe ọ gụrụ Sociology na Anthropology wee nweta nzere BSc na Sociology na Anthropology. Ka e mechara, ọ gakwara Mahadum Reading ebe o nwetara nzere mmụta iwu na UK. Ka o nwetachara nzere bachelọ, ọ gara n'ihu n'agụmakwụkwọ ya wee gụọ akwụkwọ iwu na mmekọrịta mba ụwa Mahadum Lagos ebe o ji nzere Masters pụta n'otu ngalaba ihe ọmụmụ ahụ. O nwetakwara nzere Matser na International Management na Mahadum Reading . [4]

Emenike nwekwara nzere doctorate site na Mahadum Reading . [5]

Agụm akwụkwọ sekọndrị ya bụ na Holy Rosary Secondary School Umuahia dị na steeti Abịa (1981 ruo 1985). Ọ na-ejigide njikọ ezi mmekọrịta, ọ bụghị naanị ya na ụlọ akwụkwọ ma òtù Old Girls (Holy Rosary Secondary School Old Girls Association - OGA Worldwide www.horosco.org ) Ọ na-enwesi mmasị ike gbasara ọrụ nzikọ nzọ ụkwụ ndị OGA iji kwado agụm akwụkwọ ụmụnwaanyị.

Uzoma Emenike malitere ọrụ ya n'ihe gbasara mba ofesi n'afọ 1992 n'ọrụ ya na Ministri Naijiria na-ahụ maka mba ofesi. Ọ rụrụ ọrụ na ngalaba Protocol na Africa n'ime Mịnịstrị Ofesi. Na 1992, a zigara ya n'ụlọ ọrụ nnọchite anya Naijiria dị n'Abidjan, Ivory Coast ebe o jere ozi afọ isii. Na 1998, ka o si Ivory Coast lọta, e wubere ya na ngalaba dị iche iche dị na Mịnịtrị ihe gbasara ofesi ebe ọ nọchitere anya Naijiria na ozi okpu abụọ na karịa na mba ofesi.

Na 2002, Emenike hapụrụ ọrụ mba ofesi bido ọrụ onwe dị ka a na-akpọtụrụ maka njikwa. Na 2016, Onyeisi ala Buhari wegara aha n'ụlọ omebe iwu maka ibinye aka na nnyocha dị ka onye nnọchiteanya ọrụ nkịtị. [6] Na 30 August 2017 ọ bịarutere Ireland ịbido ọrụ dị ka onye nnọchiteanya Naijiria na Ireland site na mbinye aka ụlọ omebe iwu nke Naịjiria. Ọ bụbu onye nnọchite anya Naijiria na Ireland ruo mgbe e zigharịrị ya ọrụ dị ka onye nnọchite anya Naịjiria na United States na 2021. [7]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Buhari names Dr. Uzoma Emenike as Nigeria’s Ambassador-designate to USA. www.msn.com. Retrieved on 29 January 2021.
  2. Buhari names Emenike ambassador to US, Ishola to UK, Jidda to China, retains 11 in new posting (en-US). Vanguard News (18 January 2021). Retrieved on 29 January 2021.
  3. PROFILE: Meet Uzoma Emenike, Nigeria's first female ambassador to US (en-US). TheCable (19 January 2021). Retrieved on 29 January 2021.
  4. PROFILE: Meet Uzoma Emenike, Nigeria's first female ambassador to US (en-US). TheCable (19 January 2021). Retrieved on 29 January 2021.
  5. Uzoma Emenike Biography | Nigeria's First Female US Ambassador (en-US). FabWoman | News, Style, Living Content for the Nigerian Woman (22 January 2021). Retrieved on 29 January 2021.
  6. "Wetin you need to know about Nigeria non-career ambassadors", BBC News Pidgin. Retrieved on 29 January 2021.
  7. History made as Buhari appoints Nigeria’s first female ambassador to U.S. (en-GB) (24 January 2021). Retrieved on 29 January 2021.