Velekete Slave Market

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Velekete Slave Market
market
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaBadagry Division Dezie
Ahịa ohu, Badagry

Ahịa ohu Velekete bụ ahịa dị na Badagry, Lagos Steeti . [1] Eguzoro ahịa nke a n'afọ 1502 ma kpọọ ya aha chi Velekete, mmụọ nke oke osimiri na ikuku[2] Ahịa ahụ dị mkpa n'oge ahia ohu osimiri Atlantic nke na amalite na Badagry, n'ihi na ebe ahụ bụ ebe ndị azụmahịa ohu ndị Afrịka na-ere ahịa ohu resi ndị ọcha mba Europe dị iche iche. Otu a ka esi mee ka ebe ahụ bụrụ otu n'ime ahịa na ere ndị mmadụ nke kachasi na West Africa . [3]

Ntọala[dezie | dezie ebe o si]

Ọbịbịa nke Hendrik Hertog, onye Dutch na -azụ ahịa na Badagry nke a na -akpọ Yovo Huntokonu kụrụ mkpụrụ maka nguzobe ahịa ohu Velekete. O nwetara ala n'aka ndị obodo wee mee ka obodo ahụ bụrụ ebe azụmaahịa bara uru nye ndị isi ala ahụ ka ọtụtụ ndị Europe na abịa were ihe ndị Afrịka nwere gbanwere ihe nke ha ji bia. Ọganihu ịzụ ahịa ohu malitere mgbe ndị na azụ ahịa ghọtara otú o si baa ezigbo uru n'ihi oké mkpa ndị ọrụ dị nke mere eji na-achọ ha maka ọrụ ubi n'ala ndị ọzọ. [4]

Azumaahịa[dezie | dezie ebe o si]

Canon n'ahịa ohu, Badagry

Na afọ 1805, ndị azụmahịa ohu jidere Scipio Vaughan bụ onye ala Owu nke dị na Abeokuta, Naịjirịa, ma kpọga ya na ama azụmaahịa ohu nke mpaghara osimiri Atlantic. Ha kpọgara ya n'ahịa ohu Velekete dị na Badagry ya na ndị ohu ndị ọzọ ejidere tupu ebupu ya n'ụgbọ mmiri ohu nke jere America. [5] Ebutekwara ndị ohu site n'ebe dị anya dị ka Abia State Nigeria were bia na ahịa ohu Velekete. A na edebe ha nke mbụ n'ime sel arụpụtara n'akụkụ ahịa ahụ nke azụ ndị ohu ụbọchị ise ọ bụla. E ji ndị ohu gbanwere mmanya ọkụ dị iche iche dị ka whiskey. Ihe ndị ọzọ eji gbanwere ndị ohu bụ ụdị egbe dị iche iche, efere seramiiki, enyo, nche anwụ, ngwa igwe na ihe ndị ọzọ..[6]

N'oge nke na adịbeghị anya, ahịa a abụrụla akụkụ nke ebe ndị njem nlegharị anya maka ndị chọrọ ịghọtakwu otu esi zụọ ahịa ohu n'akụkụ ụfọdụ nke etiti ọdịda anyanwụ Afrịka. Ebe ndị ọzọ ndị njem nlegharị anya n'aga maka ịghọtakwu ahịa ohu ebe dị kwa nso ahịa Velekete bụ;

  • Mobee Family House na Relics Museum nke nwere ihe nrịba ama nke na -egosi etu ezinụlọ ahụ si etinye aka na azụmaahịa ohu,
  • Agwaetiti Gberefu nke bụ ụzọ na aga na ebe enweghị nloghachi na ebe a na eme atụmatụ na ihe ruru ụmụ nwoke, ụmụ agbọghọ, ụmụ okorobịa na ụmụ nwanyị ruru puku narị ise, ndị ejidere maka ịgba ohu gafere,
  • Mmiri nke mmụọ nke emere ka ndị a dọọrọ n'agha ñnụọ ma gụkwa nkwa nke enweghị nnupụisi n'ụgbọ mmiri ohu na ichefu mmalite ha
  • Ihe onyonyo nke usoro mkparita uka ruo ebe a na -agaghị alaghachi
    Point of No Return ebe ebufere ndị a dọọrọ n'agha nye ndị Europe ndị nke na buru ha banye n'ụgbọ mmiri ohu. [7]

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Hakeem Ibikunle Tijani (2010). The African diaspora: historical analysis, poetic verses, and pedagogy. Learning Solutions. ISBN 978-0-558-49759-0. 
  2. A. Babatunde Olaide-Mesewaku (2001). Badagry district, 1863-1999. John West Publications Ltd.. ISBN 978-978-163-090-3. 
  3. Njoku. "Vlekete: When a slave market becomes a tourist centre", Vanguard Newspaper, 6 February 2013. Retrieved on 16 January 2016.
  4. The dark history of the Nigerian colonial town of Badagry, one of Africa's first slave ports (en). Face2Face Africa (2018-07-19). Retrieved on 2021-08-19.
  5. Bamidele (2020-02-09). Back-To-Africa: A Dying Wish Births A Living Legacy. The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News. Retrieved on 2021-08-05.
  6. Badagry and the remaining marks of slave market (en-US) (2014-01-18).
  7. Badagry Slave Route: Slaves passed these 5 notable stops on their journey of no return (en). Pulse Nigeria (2021-07-26). Retrieved on 2021-08-19.