Veye Tatah

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Veye Tatah
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịKameroon, Jémanị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ yaJulaị 1971 Dezie
Ebe ọmụmụKameroon Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaGerman Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ, ọkà mmụta sayensị kọmputa Dezie
Ọkwá o jieditor-in-chief Dezie
Ebe ọrụDortmund Dezie
Ihe nriteCross of the Order of Merit of the Federal Republic of Germany Dezie
Veye Tatah

Veye Wirngo Tatah (amụrụ c.1971) bụ ónyé sayensị kọmputa na ónyé nta akụkọ Cameroon bi na Germany. Ọ bụ ónyé na-akwado Africa nke natara Order of Merit site na steeti Germany..

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Tatah n'ihe dị ka afọ 1971 ma ọ bịarutere Germany n'afọ 1991. A mụrụ ya na Cameroon mana ọ ghọrọ nwa amaala Germany n'afọ 2002.[1] Ọ rụrụ ọrụ ihe karịrị afọ isii dị ka ónyé enyemaka nyocha sayensị kọmputa na Mahadum Nkà na ụzụ nke Dortmund. Ọ ghọrọ ónyé ndụmọdụ IT na-achịkwa ọrụ na ọkachasị ndị na-emetụta nkwurịta okwu ọdịbendị. Tatah nwèrè ụlọ ọrụ nri a na-akpọ Kilimanjaro Food.

Tatah nwèrè ụmụ abụọ.[1] O setịpụtakwara ọtụtụ atụmatụ gụnyere Learning and integration mobile app African-LIM, "African Women's Network" na Africa Positive.[2]

Tatah na-agba mbọ ịbawanye nghọta mba ụwa.[1] Na 25 Febụwarị 2010 Tatah natara Order of Merit nke Federal Republic of Germany màkà mmekọrịta mmadụ na ibe ya pụrụ iche.[3] O sonyere na ọzụzụ nke ndị nta akụkọ iri atọ si Gambia na Erich-Brost-Institut na 2019. A na-enye ndị nta akụkọ ebumnuche nke ịkọ akụkọ banyéré mbata.[4]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Africa is not a Country and Black is a Colour, handelsblatt.com, Retrieved 6 April 2016
  2. Veye Tatah die Frau hinter dem Namen Africa Positive In: Maischna Magazin
  3. Veye Tatah mit Bundesverdienstkreuz geehrt In: Afrika Bildung
  4. 30 Young Journalists Trained on Migration Reporting | (en-US) (2019-12-05). Retrieved on 2020-11-18.