Gaa na ọdịnaya

Violet Odogwu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Violet Odogwu
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịNaijiria Dezie
Obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
Aha n'asụsụ obodoViolet Odogwu Dezie
Aha ọmụmụViolet Obiamaka Odogwu Dezie
Aha ezinụlọ dịViolet Obiamaka Nwajei Dezie
Aha enyereViolet Dezie
Aha ezinụlọ yaOdogwu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Mee 1942 Dezie
Ebe ọmụmụAsaba-Ase Dezie
NwanneJuliet Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish Dezie
Ọrụ ọ na-arụasọmpi egwuregwu Dezie
Ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie
So na1958 British Empire and Commonwealth Games, 1966 British Empire and Commonwealth Games, 1968 Summer Olympics Dezie
Ọrụ ama amaAfrican Games Dezie
Ihe nritemedalist Dezie

Violet Obiamaka Odogwu-Nwajei (amụrụ na May 15, 1942)[1] bụbu onye Naịjirịa na-eme egwuregwu ọsọ na iwuli elu. Ọ bụ onye bụbu onye isi nke Athletic Federation of Nigeria na osote onye isi nke Confederation of African Athletics.[2]

A mụrụ Odogwu na Asaba, Delta State.[3] Ọ malitere agụmakwụkwọ na obodo ahụ tupu ọ kwaga Lagos ebe ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị.

N’afọ ndị 1950, Violet na nwanne ya nwanyị bụ Juliet gbara ọsọ maka Sports Club.[4] Na 1958, ọ nọchitere anya Naịjirịa na 1958 Commonwealth Games.[5] Ọganihu ọ na-aga n'ihu na ihe egwuregwu mere ka ọ nweta onyinye nsọpụrụ nke 'Sports Woman of the Year'. Mgbe egwuregwu ahụ gasịrị, ọ gara n'ihu na ọmụmụ ya na-agụ akwụkwọ n'ihe ọmụmụ gbasara odeakwụkwọ. Na 1963, ọ laghachitere n'egwuregwu ma nọchitere anya Naịjirịa n'egwuregwu All-African Games nke mbụ na-ọsọ ihe mgbochi 80m.

Odogwu bụ onye otu ndị egwuregwu nọchitere Naịjirịa anya na 1966 Commonwealth Games nke emere na Kingston. Na egwuregwu ahụ, o nwetara ọla nchara mgbe ọ wuliri elu ruo ukwu iri abụọ, sentimita abụọ na ọkara iji bụrụ nwanyị mbụ merụrụ ọla ahụ n'Afrika na mmemme egwuregwu Commonwealth.[6]

N’afọ 1968, ọ duru ndị otu egwuregwu ụmụnwaanyị Naịjirịa n’egwuregwu Olimpik na 1968. O riteghi ọla ma ọ bụ onye nke ikpe-azu na egwuregwu nke iwuli elu.[7] Ọ bụ onye merụrụ ọla nchara na mmemme nke Little Olympics, emere otu afọ tupu mgbe ahụ maka nkwadebe maka isi mmemme ahụ. 

Ebe m si dee

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Violet ODOGWU - Olympic Athletics | Nigeria (en) (2016-06-12).
  2. Ikhazuagbe This Day & 19 April 2011.
  3. Spear & October 1967.
  4. Amadiume 2000, p. 43.
  5. Ogunbiyi 1978, p. 104.
  6. Ogunbiyi 1978, p. 107.
  7. Oduyale 1979, p. 104.

Isi mmalite

[dezie | dezie ebe o si]
  • Amadiume, Ifi (2000). Daughters of the Goddess, Daughters of Imperialism: African Women Struggle for Culture, Power and Democracy. 
  • Ogunbiyi, Ogungbenjo (1978). The Development of Nigeria's Participation in International Sports Competition and Its Effects on the Nation (Thesis). Ohio State University.
  • Oduyale, Amos (1979). TWENTY-FIVE YEARS HISTORY OF OLYMPIC MOVEMENT IN NIGERIA, 1951-1976 (Thesis). OPennsylvania Stale University.
  • Ikhazuagbe, Duro. "Kalkaba, Odogwu Re-Elected to Lead African Athletics", 19 April 2011.
  • "Profile of Violet Odogwu". Spear Magazine. Lagos: Daily Times. October 1967.