Violet Odogwu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Violet Odogwu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereViolet Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Mee 1942 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Delta Dezie
Ọrụ ọ na-arụlong jumper, hurdler, high jumper, sprinter Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie
so na1968 Summer Olympics, 1958 British Empire and Commonwealth Games, 1966 British Empire and Commonwealth Games Dezie

Violet Obiamaka Odogwu-Nwajei (amụrụ na May 15, 1942)[1] bụbu onye Naịjirịa na-eme egwuregwu ọsọ na iwuli elu. Ọ bụ onye bụbu onye isi nke Athletic Federation of Nigeria na osote onye isi nke Confederation of African Athletics.[2]

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Odogwu na Asaba, Delta State.[3] Ọ malitere agụmakwụkwọ na obodo ahụ tupu ọ kwaga Lagos ebe ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị.

N’afọ ndị 1950, Violet na nwanne ya nwanyị bụ Juliet gbara ọsọ maka Sports Club.[4] Na 1958, ọ nọchitere anya Naịjirịa na 1958 Commonwealth Games.[5] Ọganihu ọ na-aga n'ihu na ihe egwuregwu mere ka ọ nweta onyinye nsọpụrụ nke 'Sports Woman of the Year'. Mgbe egwuregwu ahụ gasịrị, ọ gara n'ihu na ọmụmụ ya na-agụ akwụkwọ n'ihe ọmụmụ gbasara odeakwụkwọ. Na 1963, ọ laghachitere n'egwuregwu ma nọchitere anya Naịjirịa n'egwuregwu All-African Games nke mbụ na-ọsọ ihe mgbochi 80m.

Odogwu bụ onye otu ndị egwuregwu nọchitere Naịjirịa anya na 1966 Commonwealth Games nke emere na Kingston. Na egwuregwu ahụ, o nwetara ọla nchara mgbe ọ wuliri elu ruo ukwu iri abụọ, sentimita abụọ na ọkara iji bụrụ nwanyị mbụ merụrụ ọla ahụ n'Afrika na mmemme egwuregwu Commonwealth.[6]

N’afọ 1968, ọ duru ndị otu egwuregwu ụmụnwaanyị Naịjirịa n’egwuregwu Olimpik na 1968. O riteghi ọla ma ọ bụ onye nke ikpe-azu na egwuregwu nke iwuli elu.[7] Ọ bụ onye merụrụ ọla nchara na mmemme nke Little Olympics, emere otu afọ tupu mgbe ahụ maka nkwadebe maka isi mmemme ahụ. 

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Violet ODOGWU - Olympic Athletics | Nigeria (en) (2016-06-12).
  2. Ikhazuagbe This Day & 19 April 2011.
  3. Spear & October 1967.
  4. Amadiume 2000, p. 43.
  5. Ogunbiyi 1978, p. 104.
  6. Ogunbiyi 1978, p. 107.
  7. Oduyale 1979, p. 104.

Isi mmalite[dezie | dezie ebe o si]

  • Amadiume, Ifi (2000). Daughters of the Goddess, Daughters of Imperialism: African Women Struggle for Culture, Power and Democracy. 
  • Ogunbiyi, Ogungbenjo (1978). The Development of Nigeria's Participation in International Sports Competition and Its Effects on the Nation (Thesis). Ohio State University.
  • Oduyale, Amos (1979). TWENTY-FIVE YEARS HISTORY OF OLYMPIC MOVEMENT IN NIGERIA, 1951-1976 (Thesis). OPennsylvania Stale University.
  • Ikhazuagbe, Duro. "Kalkaba, Odogwu Re-Elected to Lead African Athletics", 19 April 2011.
  • "Profile of Violet Odogwu". Spear Magazine. Lagos: Daily Times. October 1967.