William Beinart
William Beinart (amụrụ na Jenụwarị 19, 1951, na Cape Town) bụ onye South Africa ọkọ akụkọ ihe mere eme na onye Africa.[1] Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Cape Town na School of Oriental and African Studies na Mahadum London.[1]Ọ kụziri na Mahadum Bristol site na 1983 ruo 1997. Na Mahadum Oxford ọ bụ Prọfesọ nke Mmekọrịta agbụrụ site na 1997 ruo 2015, ma nọrọkwa n'ọkwá dị ka onye isi ụlọ ọrụ African Studies (2002-6 na 2014-5). Onye isi oche nke Ụlọ Akwụkwọ nke Interdisciplinary Area Studies (SIAS, 2006-8), na onye isi nchịkwa nke ọmụmụ akwụkwọ na African Studies Centre, St Antony's College (2009-13).
Beinart bụ onye isi oche nke Board of the Journal of Southern African Studies site [2]na 1992-8 na Onye isi [3]oche nke African Studies Association nke UK site na 2008-10. A họpụtara ya na British Academy na 2009.
Nnyocha ya na-elekwasị anya na South Africa na mmepe nke Ịkpa ókè agbụrụ.[4]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]- Beinart, William, ed. (1995). Segregation and Apartheid in Twentieth Century South Africa. New York, NY: Routledge. ISBN 978-1-134-85033-4.
- William Beinart (2008). The Rise of Conservation in South Africa: Settlers, Livestock, and the Environment 1770-1950 (Pbk. ed.). Oxford: Oxford University Press. ISBN 978-0-19-954122-5.
- William Beinart (2011). Prickly Pear: A Social History of a Plant in the Eastern Cape. Johannesburg: Witwatersrand University Press. ISBN 978-1-86814-530-0.
Ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ "Beinart William". Africanstudies.ox.ac.uk. July 13, 2011. Retrieved February 21, 2024.
- ↑ "Professor William Beinart". Britac.ac.uk. Retrieved February 21, 2024.
- ↑ "William Beinart's Publications". Africanstudies.ox.ac.uk. January 27, 2012. Retrieved February 21, 2024.
- ↑ "William Beinart's Publications". Africanstudies.ox.ac.uk. January 27, 2012. Retrieved February 21, 2024.