Winnie Gofit
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Aha enyere | Winifred |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 22 Mee 1994 |
| Ọrụ ọ na-arụ | judoka, amateur wrestler |
| Ụdị egwuregwu | judo, mgba |
Winnie Gofit a makwaara dị ka Winifred Gofit (amụrụ na Mee 22, 1994) bụ onye egwuregwu igba mgba na Naijiria. Ọ bụ onye nrite ọla edo nke African Championships na 2017 na 2018. O burukwa onye nrite ọla ọcha nke Commonwealth Wrestling Championship.[1][2]
Aha Winnie sonyere na Nigerian Judo Hall Of Fame dị ka nwanyị kachasị elu na Nigeria Judo Federation.[3][4]
Ọrụ egwuregwu
[dezie | dezie ebe o si]N’afọ 2017, ọ ritere ọla edo n’ihe omume nke Freestyle 75 kg n’egwuregwu asọmpi nke 2017 African Wrestling Championships emere na Marrakesh, Morocco.[5][6]
Nakwa na 2017, ọ nọchitere Naijiria anya na asọmpi Commonwealth Wrestling Championship nke emere na Johannesburg, South Africa wee rite ọla ọcha na ihe omume ụmụ nwaanyị nke 72kg.[7]
Na 2018, o ritere nrite ọla edo na mmemme nke ụmụ nwanyị n'arọ 72kg n'asọmpi nke 2018 Afrikan Wrestling Championships nke emere na Port Harcourt, Naijiria.[8]
Ebe m si dee
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Winnie GOFIT / IJF.org.
- ↑ Winifred Gofit, Judoka, JudoInside.
- ↑ Nigeria Judo Hall of Fame. Archived from the original on 2020-11-16. Retrieved on 2020-11-24.
- ↑ International Wrestling Database.
- ↑ International Wrestling Database.
- ↑ Seven Nigerians win gold in Morocco.
- ↑ tristan. Commonwealth Wrestling Championship (en).
- ↑ International Wrestling Database.