Women's health in China

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ahụike ụmụ nwanyị na China bụ ihe maka niile gbasara ahụike ụmụ nwanyị na Republic of China (PRC), nke dị iche na ahụike ụmụ nwoke na China n'ọtụtụ ụzọ. A kọwara ahụike, n'ozuzu ya, n'akwụkwọ iwu nke World Health Organization WHO na agha ịchafụ dị ka "ọnọdụ ahụike zuru oke, anụ ahụ, na mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ọ bụghị naanị enweghị ọrịa ma ọ bụ nkwarụ na ụzọ ọ bụla". Ọnọdụ nke ahụike ụmụ nwanyị China dabere nke ukwuu na akụkọ ihe mere na mbụ a China na mmepe akụ na ụba n'ime iri afọ asaa gara aga. Echiche akụkọ ihe mere eme banyere ahụike ụmụ nwanyị na China gụnyere inyocha amụma ahụike yana nsonaazụ ya maka ụmụ nwanyị na oge mmezigharị (1949-1978) na oge mgbanwe kemgbe afọ 1978.

N'ozuzu ya, ahụ ike ụmụ nwanyị na China hụrụ ndozi nke ịrịba ama n'oge a na eme ntọala nke Ndị Republik of China na afọ 1949, site n'oganihu ihe dị iche iche dị ka mbenata ọnwụ nke ụmụaka ọhụrụ nke bekee kpọrọ Infant Mortality Rate (IMR) na ọdịdị mma ndu mmadụ nke bekee n'akpọ Physical Quality of Life Index (PQLI) na ihe ndị ọzọ. [1] Agbanyeghị ihe niile ndị a, n'ihi echiche ọdịnala ndị China n'ahaghị nhata nwoke na nwanyị na ihe mgbagwoju anya nke usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị China, ihe ịma aka n'ihe gbasara ọtụtụ akụkụ ahụike ụmụ nwanyị, dịka ahụike ọmụmụ nwa na nke gbasara HIV/AIDS, ka na -arịwanye elu.

Akụkọ gbasara ahụike ụmụ nwanyị na China[dezie | dezie ebe o si]

Ndozigharị China (1949-1978)[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ndị otu ndọrọ ndọrọ Kọmunist nke China weghaara ọchị ọchị China na afọ 1949, ha guzobere usoro nlekọta ahụike ọha nke mbụ na China akpọrọ Cooperative Medical Scheme (CMS), nke na etinye nnukwu nlebara anya maka igbo mkpa nke ndị bi n'ime obodo. [2] CMS nwere usoro ọkwa atọ: ndị dọkịta na-enweghị na akpụkpọ ụkwụ, ebe ahụike nke dị n'obodo ma ọ bụ mpaghara mepere emepe, na ụlọ ọgwụ maka nlekọta obodo niile. Na ngwụcha afọ ndị 1970 tupu 1980, ihe karịrị pasent iri itoolu nke ime obodo emebela atụmatụ nlekọta ahụike (CMS). Mmejuputa iwu nke CMS ahụtala ọganiihu dị ukwuu na ahụike ndị mmadụ na China, gụnyere ahụike ụmụ nwanyị. [3] Nnyocha nke Mei-yu Yu na ndị ọzọ chọpụtara na ọnụ ọgụgụ ọnwụ nwa ọhụrụ (IMR) gbadara site na otu narị na iri asaa n'ime otu puku ụmụ amụrụ ọhụrụ na afọ 1953 ruo otu narị na iri atọ na isii na afọ 1957, na ogologo afọ ndụ nwanyị mgbe a mụrụ ya bilitere site na 44.8 na afọ 1949 ruo 67.1 na afọ 1975. [1] N'adịghị ka ọnụ ọgụgụ ndị China gosipụtara, nnyocha nke Banister egosila na ọnụ ọgụgụ ọnwụ nwa ọhụrụ ma ọ bụ IMR na aha ichafụ na bekee nke nwanyị dị elu karịa nke nwoke na China ma opekata mpe kemgbe afọ 1975. [4] Nnyocha nke Mei Yu-yu na ndị ọzọ kwenyere na ọdịiche dị na IMR dị n'etiti nwanyị na nwoke nwere ike bụrụ nsonaazụ nke mmasị maka ụmụ nwoke n'echiche ọdịnala China, nke nwere ike ibute mgbahapụ, ọgwụgwọ n'ahaghị oke ma ọ bụ ime ihe ike megide ụmụ ọhụrụ ụmụ nwanyị na China. [1]

Mgbanwe akụ na ụba (site n'afọ 1979 ruo ugbu a)[dezie | dezie ebe o si]

Kemgbe afọ 1978, China na eji nwayọọ nwayọọ na apụ na mba kwere na mmadụ niile nwekọtara akụ n'ụba wee na esoro echiche na onye ọ bụlala nwere ike ịchụnta ego ma ọ bụ nwee akụ n'ụba nke onwe; ikeketaorie. N'ebum n'uche ịbawanye arụmọrụ na imeziwanye ụkpụrụ ibi ndụ, China emebela mgbanwe one na one dị ukwuu: ngbanwe otu esi eke ala ma ọ bụ otu esi enwe ala, ịkwalite ụlọ ọrụ ndị nke dị n'ime obodo ma ọ bụ na mpaghara mepere emepe nke aha ichafụ ya na bekee bụ TVEs, mmezigharị mpaghara steeti, yana amụma iji gbaa ụme maka itinye na inweta ego nke ndị mba ọzọ (nke aha ichafụ ya na bekee bụ FDI), na nnwere onwe azụmahia. Emejuputara atumatu ndị a ka China mepee azụmahia ha maka akụ na ụba ma n'aga n'ihu iji hụ na ha so na otu maka mba niile dị n'ụwa maka ịzụ ahịa nke akpọrọ World Trade Organisation na bekee ma ọ bụ nke aha ichafụ ya na bekee bụ WTO. Ọtụtụ ndị mmadụ toro amụma ndị a dị ka ndị na -eme nke ọma, n'emepụta nnukwu akụ na ụba ebe ha n'ebuli ọnọdụ ibi ndụ site na ibelata ịda ogbenye. China ewerela usoro mgbanwe ya nwayọ na nke ukwuu. Agabanyeghị na ha bidoro mgbanwe ya tupu mba ndị ọzọ, ha ka nọkwa usoro ahụ. Usoro ndị a ebutela nnukwu mmụba, na obodo China ma mekwa ka enwe nnukwu agam n'ihu na n'bawanye ngwa ngwa. Ọtụtụ amụma ahụ ebutekwala mgbasa ozi na ndozi ọnọdụ ahụike na China. Ahụike ụmụ nwanyị na China so na ndị kacha nwee mgbanwe ka ọnọdụ akụ na ụba na agbanwe.

Ahụike na ndụ obibi[dezie | dezie ebe o si]

Ka ahịa mepere, ọrụ ọhụrụ dị iche iche pụtara, nke a mere n'ohere bara ụba pụtakwara ụmụnwaanyị. Ohere ndị ọhụrụ ahụ bụ na ọrụ ije ozi na ụlọ ọrụ na emepụta akwa. Ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị China na -arụ ọrụ dị ka nke afọ 2007 bụ nde narị atọ na iri atọ nke bụ 46.7% ugbu a na ọnụ ọgụgụ ndị niile na -arụ ọrụ. Ihe ka ọtụtụ n'ime ebe ụmụ nwanyị ndị a na arụ ọrụ bụ na ngalaba ọrụ ugbo ma ọ bụ ụlọ ọrụ ije ozi ma'na ọtụtụ n'ime ha na -arụ ọrụ na ụlọ ọrụ ihe gbasara akwa. Ndị ụlọ ọrụ ndị a na enwe ebe ibi obibi na adikọta ọnu. Ebe obibi ndị a juputara maka ndị ọrụ na -akwaga mba ọzọ, ndị n'ọnweghị onye n'ime ha nwere ike nọrọ n'obodo mepere emepe n'enweghị ọrụ. Ụmụ agbọghọ aghọọla igwe mmadụ ndị ọrụ ndị nke n'akwaga mba ọzọ, nke mere na ha bụ ihe karịrị pasent iri asaa nke ndị n'arụ ọrụ na ebe ana'eme akwa, ihe egwuregwu ụmụaka na ụlọ ọrụ elektrọnik. A'na akpọ ụmụ nwanyị ndị a dagongmei bụ ndị ọrụ na arụ ọrụ ma ọ bụ nweta ọrụ n'oge dị mkpụmkpụ dị ka nkwekọrịta ha na ndị ụlọ ọrụ si dị. Mgbe oge ngwụcha nkwekọrịta ha n'agwu, ha n'achọta ọrụ ma ọ bụ ha alaghachi n'obodo ha. Ụdị nkwekọrịta ọrụ nke a n'eme ka ndị dagongmei ndị a nwee ntakịrị ikike ịkpa maka ọnọdụ nkwekọrịta nke ihe gbasara ọrụ. Nke a mere ịdochi ndị ọrụ a na adị mfe.

Ndụ obibi n'ụlọ ọrụ na China n'eme ka ụmụ nwanyị nwee obere ohere maka onwe ha ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na abughị ihe gbasara ụlọ ọrụ. A n'ewepụ oge ụmụ nwanyị ji eme njem site n'ụlọ ruo ọrụ n'ihi ha biebi ebe ahụ. Nke a mere na ụbọchị na oge ọrụ ha na eto ogologo iji kwado mkpa mmepụta ụlọ ruo ha. Ọrịa na mmekpa ahụ ihe gbasara ahụike ụmụ nwanyị anaghị a bụ ihe dị mkpa n'ebe obibi n'ụlọ ọrụ ndị a. Ụmụ nwanyị n'eleghara ahụike nke ha anya n'ihi ụjọ maka ntaramahụhụ sitere n'aka ndị nlekọta ụlọ ọrụ.

Ọzọkwa, dị ka egosiri na nchikọta akụkọ nke nyonyo akpọrọ " China Blue ", ọ bụrụ na nwanyị tụrụ ime mgbe ọ n'arụ ọrụ, a ga achụ ya n'ọrụ ma ọ bụ manye ya ịkwụsị obere oge ka amụrụ nwa ya n'ihi na ọ gaghị enwe ike mezuo ihe dị n'ọrụ ya ọzọ. Na afọ 2009 naanị, ihe karịrị puku mmadụ iri abụọ ndị obibi n'ụlọ ọrụ ndị China ọkachasị ụmụ agbọghọ dara ọrịa mgbe ha bi n'ime ebe obibi ndị a. Ọzọkwa, mgbe ha n'ebi n'ụlọ obibi ndị a, oge ndị ọrụ a abụghị nke ha n'ime ihe gbasara ha onwe ha. Ka'ma a'na emikpu ha n'ime ndụ ihe gbasara naani ụlọ ọrụ, nke mere na ọna afọrọ nke nta ka ọ bụrụ usoro nke ndị nwe ụlọ na ndị njikwa ụlọ ọrụ a n'achịkwa omume ha niile. Ịdị ọcha na ọrịa na-efe efe na-abụ ihe iyi egwu ahụike dịka ụmụ nwanyị bi n'ime ụlọ ọrụ ebe ndị mmadụ nke ahụ dị n'agbata asatọ na iri abụọ na ekerịta otu ụlọ mposi n'etiti ụlọ na ala ụlọ obibi ndị ahụ. Naanị oghere ekenyela onye ọ bụla bụ n'azụ ákwà ngebichi nke n'ekpuchi ọnụ ụlọ mmadụ. A na ekewa ndị ọrụ nwoke na nwanyị ka'ha ga'na inwena njikwa siri ike ma ọ bụ mmekọahụ. Ọnọdụ ndị a n'ebute nnukwu ihe egwu na abụghị naanị nke anụ ahụ kamakwa ahụike uche nke ụmụ nwanyị ndị ọrụ a na anọghị n'ụlọ ha ka'ma biri na ebe obibi nwere oke mmachi na gburugburu. Ọ bụ ezie na mgbanwe ndị ahụ nyere China ohere inweta uto akụ na ụba nke a n'enwetụbeghị ụdị ya, ma ọtụtụ ụlọ ọrụ ịwezuga onwe ha mekwara ka China gbanwee iwu nlekọta ahụike ya.

Ịkpa oke ụgwọ ọrụ na -ebelata ohere inweta ahụike[dezie | dezie ebe o si]

Ihe ọzọ na -egbochi ike ụmụnwaanyị inweta ahụike bụ ụgwọ ọnwa ha dị obere ma e jiri ya tụnyere ụmụ nwoke. China na -akwalite onwe ya dịka ọ nweghị ihe gbasara nwoke na nwaanyị gbasara ụgwọ ọnwa mana anyị na -ahụ na e jiri ya tụnyere ụmụ nwoke ụmụnwaanyị na -eme obere ego. The Chinese ọchịchị touts ha "ịnata ụgwọ nha anya kwesiri ọrụ" mantra, Otú ọ dị, ụmụ nwaanyị ahụ na-arụ ọrụ ha na akwa ọrụ bụghị hà ọrụ mere na ụlọ ọrụ na-achọ "arọ" oru otú n'ikpeazụ inyom na-eme ka ihe na-erughị, n'ihi na mmadụ a na -ahụta na ha enweghị ike ịrụ ọrụ “dị arọ”. Ụgwọ a na -akwụghị ụgwọ na -eme ka ụmụ nwanyị nwee nsogbu na enweghị ike ịkwụ ụgwọ maka nlekọta ahụike onwe ha ma e jiri ya tụnyere ụmụ nwoke. Ọ bụ ezie na 49.6% nke ụmụ nwanyị enweghị mkpuchi na -egosi na enweghị nnukwu ọdịiche dị n'etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị enweghị mkpuchi. Enweghị inshọransị anaghị emetụta ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị n'otu aka ahụ dịka ọ dị mkpa ka ụmụ nwanyị na -akawanye nke ukwuu iji lekọta ọmụmụ nwa, nlekọta ezinụlọ na nchekwa. Mkpuchi mkpuchi nchekwa mmadụ abụrụla ihe kpatara na naanị 37.9% nke ndị na -enweta nchekwa mmadụ bụ ụmụ nwanyị; ọzọkwa nke a na -aghọ okwu n'ihi na ndị agadi nwanyị enweghị ike ịkwụ ụgwọ ụgwọ ahụike ha na -eto. Dika ọnụ ahịa nlekọta ahụike na -abawanye n'ihi mmebi iwu azụmaahịa na nkeonwe, nyocha egosila na ọnọdụ ndị a kpọtụrụ aha n'elu belatara ike ụmụ nwanyị ị nweta ahụike na China.

Ndị otu WTO (2001-ugbu a)[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ ezie na echere na mbata China na WTO ga-akwalite mmepe akụ na ụba ya ma meziwanye usoro ahịa ya, mana nchọpụta bụ na isonye na WTO ga-eme ka ọnọdụ ndị ọrụ ka njọ na China n'ihi na a na-ahụta ọrụ karịrị akarị na ime ka ụlọ ọrụ steeti ganiru [5] kemgbe China banyere n'ahịa ụwa. Ọzọkwa, ọmụmụ sitere na nyocha egosila na ndị ọrụ na China bụ naanị pasent iri anọ bụ ụmụ nwanyị mana pasent iri isii nke ndị a chụrụ n'ọrụ bụ ụmụ nwanyị. Nke a gosipụtara na ụmụ nwanyị nwere ike ịdaba na mmetụta ndị a dị njọ karịa ụmụ nwoke. [6]

Ndekọ ọnụ ọgụgụ e nwetara n'afọ 2008 egosila na ụmụ nwoke na-enwe ahụike karịa ụmụnwaanyị. Agbanyeghị nke a, anaghị elebara ya anya ma ọ bụrụ na ọnọdụ ahụ nwere ike ịdaba na mgbanwe akụ na ụba China n'ụzọ ọ bụla. [7]

Iwu nlekọta ahụike[dezie | dezie ebe o si]

Usoro ahụike na China agbanweela nke ukwuu n'oge mgbanwe na akụ na ụba ahịa . Ka mgbanwe ahụ malitere, gọọmentị ọhụrụ na China kewara ọrụ maka ọrụ ahụike n'obodo ndị mepere emepe n'etiti ministri ahụike na nke ọrụ na nchekwa obodo . Ka ahịa ụlọ ọrụ mmepụta ihe na adị nnukwu ka usoro ahụike siri dị, nke mere na ọtụtụ ụmụ amaala China enweghị mkpuchi nke mere na ha n'eji ego aka ha kwụọ ụgwọ nlekọta onwe ha.  N'okpuru ụkpụrụ nduzi ọhụrụ maka ahịa nke sitere isoro na WTO, China meghere ahịa ya nke mere nke ha na ndị mba ọzọ n'asọmpi. Nke a butere mbubata ọgwụ ndị ka mma na akụrụngwa ọgwụ dị oke ọnụ, nke n'enyekwa ohere maka nlekọta ahụike mmadụ mana mee ka ego ya dị kwa elu. Nke a mere ka ọnụ nlekọta ahụike dị oke ọnụ na ọtụtụ ndị China enweghị ike nweta ya.

N'agbata afọ 1970 na ngwụcha 1990s, ego gọọmentị China n'enyefe maka nweta ahụike dara pasent irii ise ma n'aga n'ihu n'ada. Ndị China n'emefu ego karịa na ahụike mana oke steeti n'enye gbadara site na 36.4% nke mmefu ahụike niile na afọ 1980 ruo pasent irii ise na atọ na afọ 2003. N'aka nke ọzọ, onyinye ndị mmadụ n'otu n'otu rịrị elu site na 23.2% ruo 60.2% n'otu oge ahụ. Dị ka ekwuru, ụmụ nwanyị na enweta obere ego na ụgwọ ọnwa nke n'erughị nke ụmụ nwoke na China, yabụ na ọnọdụ nke a mere ka ọnụ ahịa ahụike na nye ụmụ nwanyị nsogbu n'ihi ha-enweghị ike ịkwụ ụgwọ ya. Otu nwanyị meworo agadi nke Liu gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ya maara ọtụtụ ụmụ nwanyị meworo okenye bụ ndị mgbe ha chere atụmanya nke usoro ọgwụgwọ dị oke ọnụ, ha dị njikere igbu onwe ha kama ibo ezinụlọ ha ibu arọmaka nlekota ahụike ha.

Na mgbakwunye na inwe ọghọm nwoke na nwanyị, ụmụ nwanyị ime obodo n'ata ahụhụ karịa maka nlekọta ahụike n'ihi ịba ụba nkewa na China. Dabere na ọmụmụ sitere na nyocha nke Xiaobo Zhang na ndị ọzọ, Ụlọ ọrụ ahụike dị ụkọ n'ime ime obodo China. Na afọ 1980, akwa ụlọ ọgwụ na ndị ọrụ ahụike kwa puku mmadụ n'obodo mepere emepe bụ 4.57 na 7.82 n'otu n'otu, ma e jiri ya tụnyere 1.48 na 1.81 n'ime ime obodo. Ọdịiche dị otu a na ahụike ndị bi na n'ime obodo na ndị bi na ebw mepere emepe etoola kemgbe ọtụtụ afọ. [8] Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ ụmụaka na anwụ n'ime ime obodo dị elu nke ukwuu karịa n'ebe mepere emepe, oghere nke ahụ dị n'etiti ndị a ruru 2.1 na afọ 2000. Oke nke nwanyị na nwoke na ihere gbasara ọnwụ nwa amụrụ ọhụrụ mụbara nke ukwuu site na 0.9 ruo 1.3 n'otu oge ahụ. Nke ka njọ, ọnwụ nwa amụrụ ọhụrụ nwanyị nọ n'ime ime obodo bilitere site na 34.9 ruo 36.7 n'oge 1990-2000, ebe ezinụlọ ndị nọ n'ime ime obodo na enwekarị mmasị nwa nwoke.

Nsonaazụ ahụike ụmụ nwanyị[dezie | dezie ebe o si]

Ahụ ike ịmụ nwa[dezie | dezie ebe o si]

Ahụike tupu ọmụmụ nwa[dezie | dezie ebe o si]

Otu akụkụ ahụike ụmụnwanyị kacha ata ahụhụ nke ukwuu dịka akụ na ụba n'aga n'usoro ahịa efu bụ ahụike n'oge ịmụ nwa. Dika ụlọ ọrụ ahụike na -ekewa, ndị ụlọ ọrụ ahụ adịchaghị enye ahụike mgbochi n'efu. N'ihi nke a ha akwụsịla omume ịnye nyocha ahụike ọmụmụ nke ụmụnwanyị oge niile dị ka ha na -eme na mbụ. N'ihi nke a site na afọ 1997 ruo afọ 2007 naanị pasent iri atọ na asaa ma ọ bụ iri atọ na itoolu nke ụmụ nwanyị na enweta nyocha ọmụmụ ha nke ahụ ha chọrọ. Enwekwara oghere na agbasawanye n'etiti ụmụnwaanyị bi n'obodo mepere emepe na ndị bi n'ime obodo gbasara ihe ngosi ahụike ha. Ihe ngosipụta ahụike na -egosi na n'afọ 2003, 96.4% nke ụmụnwaanyị nọ n'obodo mepere emepe hụrụ dọkịta mgbe ha dị ime ebe ụmụnwaanyị dị 85.6% nọ n'ime obodo hụrụ dọkịta n'oge ha dị ime. A'na ekwu na ụmụaka na -erubeghị afọ ise n'obodo mepere emepe, na adị ndu karịa ndị nke amụrụ n'ime ime obodo China ji okpukpu abụọ karịa ịnwụ tupu ha eruo afọ ise. Enwekwara ụkpụrụ okike ndị ọzọ nke na -ebelata ohere ụmụnwaanyị inweta ahụike. N'ime otu ọmụmụ sitere na nyocha, egosiri na ọtụtụ ụmụ nwanyị ka na -ala azụ ịchọ enyemaka ahụike maka okwu gbasara mkpa ahụ ụmụ nwanyị. Ọjụjụ a maka ịchọ nyocha ime ahụ ụmụnwaanyị dị ka ara na ebe esi amụ nwa n'eme na anaghị ama oge oke ọrịa n'efe efe na abiakwa ma ọ bụ nchọpụta ọrịa kansa ara n'oge. Ụmụ nwanyị na -ajụ ule ịnwale mmamịrị na ihe ndị ọzọ n'ihi na ọ bụrụ na achọpụtara na ha bu ọrịa, nke a ga agbagha njirimara ha dị ka nwanyị na ọrụ onye n'enye nlekọta ma tụgharịa wee bụrụ zia onye dị ka onye nnata nlekọta. Mgbe achọpụtara ọrịa, a kọọrọ na ụmụ nwanyị anaghị echekarị na ha na -arịa ọrịa, a na -ekwukwa na ha ghọtara ọrịa ndị a dịka akụkụ nke ọnọdụ nwanyị. Àgwà ndị a bụ ihe a n'ahụkarị n'ihi sistemụ ahụike adịghị mma yana ozi gbasara ezigbo ahụike.

Ahụike ọmụmụ nwa[dezie | dezie ebe o si]

Omenala nke 'ime ọnwa' nwere nnukwu mmetụta na ahụike ụmụ nwanyị na -amụ nwa na China. Akpọrọ ya dị ka "njigide nwa oge" na agụmakwụkwọ ọdịda anyanwụ. Nke a bụ usoro omume kwa ụbọchị site na inye nri pụrụ iche ruo na mmachi na mgbochi nke pụrụ inyere ụmụ nwanyị na -amụ nwa aka maka ezumuike na ịgbake site na mmerụ ahụ ọmụmụ. Ekwenyere na omume dị otu a nwere ike inyere ụmụ nwanyị aka n'nweghachite “nhakọ ọnụ” ha na ahụ ma gbochie ọrịa ụfọdụ ka oge na -aga na ndụ ha. [9] Agbanyeghị nke a, a na -arụrịta ụka nke ukwuu n'etiti ndị nyocha ma ọdịnala a ọ na -enye aka ma ọ bụ na ọ naghị arụ ọrụ ka esiri chee. Shu-Shya Heh na ndị ọzọ achọpụtala na "ime ọnwa" na -eme ka ụmụ nwanyị ghara inwe nkụda mmụọ mgbe ha mụsịrị nwa, n'ihi na ha na -ahụ nkwado dị elu sitere n'aka ezinụlọ ha. [10] Nnyocha ndị ọzọ egosikwala na ụfọdụ ihe nke omenala a na -etinye ahụike ụmụ nwanyị mgbe ọ mụsịrị nwa na nsogbu, dị ka ekweghị ka ụmụ nwanyị pụta n'anwụ ma ọ bụ ahaghị ụdị ihe oriri a n'enye ha. [11]

Ọrịa HIV/AIDS[dezie | dezie ebe o si]

Ọrịa HIV na China na -arịkwa elu site pasent iri na ise na ato na afọ 1998 ruo na pasent iri ato na abụọ na afọ 2004. Mmụba nke a siri na enweghị nnabata na agụmakwụkwọ ihe gbasara ọrịa ahụ, yana n'ihi na ruo ọtụtụ afọ enweghị nghọta gbasara nje HIV, kama ha na-ahụta ọrịa ahụ dị ka ihe na eme na ọdịda anyanwụ nke na-agaghị emetụta ndị China. N'ihi okwu nduhe na mkparị a, China hụrụ onwe ya dị ka obodo na-adịghị njikere maka nsogbu mmekọrịta ọha na eze na ahụike na ihe metụtara nje HIV. Enwere ụfọdụ mbọ agbara maka mmụta gbasara mmekọahụ na ụzọ nchekwa maka ọrịa a n'ebute site na mmekọahụ nke enyere ndị na arụ ọrụ mmekọahụ n'ime afọ 1990 mana ihe ndị a bụ mmegharị aka na enweghị ezigbo mmetụta. N'otu oge, gọọmentị China na mpaghara ụfọdụ nwere iwu machibidoro ndị ọrịa AIDS ịlụ, ma ọ bụ na -eje ozi dị ka ndị nkuzi na ndị dọkịta. Nghọta nduhie nke n'amaghị maka ndị ọrịa AIDS nyere ụmụ nwanyị na ndị na -edina ụdị onwe ha nnukwu nsogbu dịka a hụrụ ha dị ka ndị bu ọrịa ahụ mana ekesa ya .

Ihe ịrịba ama na -adịbeghị anya nke n'adọta nlebara anya bụ ịrị elu nke ọrịa ọhụrụ n'etiti ụmụ nwanyị ma e jiri ya tụnyere ụmụ nwoke. Atụmatụ na nso nso a nke ndị Ministrị Ahụike China na otu Mmekọrịta Mba Ndị Dị n'Otu maka HIV/AIDS n'egosi na oke ọnụ ọgụgụ nke ọrịa a sitere na ụmụ nwoke ise ruo nwanyị otu n'oge 1995-1997 ruo ụmụ nwoke anọ ruo nwanyị otu site na 2001. [12] N'ime afọ 1999 ruo na afọ 2008, ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị bu nje HIV mụbara okpukpu abụọ ma e jiri ya tụnyere afọ iri gara aga. [13] N'ime afọ 1999 ruo na afọ 2008, ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị bu nje HIV mụbara okpukpu abụọ ma e jiri ya tụnyere afọ iri gara aga. [13] Nyocha nke ndị Population Reference Bureau n'ekwu na ụdị ịrị elu a sitere na ihe dị akụkụ atọ: adịghị ike anụ ahụ nke ụmụ nwanyị, mmụba ọrịa a n'ebute site na mmekọahụ (nke aha ichafụ ya bụ STI na bekee) na China, yana ọghọm mmekọrịta ụmụ nwanyị na China. [12] Site na afọ 1999 ruo na afọ 2008, ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị bu nje HIV mụbara okpukpu abụọ ma e jiri ya tụnyere afọ iri gara aga. [13] Kpọmkwem, mmekọahụ na-enweghị nchekwa n'etinye ụmụ nwanyị n'ihe ize ndụ nke ibute nje HIV ugboro abụọ ruo ugboro anọ karịa nke ụmụ nwoke n'ihi usoro ndu nke ikpu ụmụ nwanyị. [14] Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ ọrịa a n'ebute site na mmekọahụ (STI), dị ka ihe ngosi nke nje HIV/AIDS, na -arịwanye elu na China n'ime iri afọ ole na ole gara a. Ọzọkwa dị ka ụmụ agbọghọ n'akwaga mba ọzọ ma ọ bụ soro n'ọrụ mmekọahụ a na -enwekarị ohere ịbanye n'nsogbu nke sitere na STI.

Nsogbu iri nri[dezie | dezie ebe o si]

Nnyocha egosila enweghị afọ ojuju dị n'etiti ụmụ agbọghọ nọ n'ofe China niile otu ahụ ha dị. Dị ka n'akụkụ ndị ọzọ nke ụwa niile, mkpesa maka nsogbu nri n'adịkwa elu karịa ebe ụmụ nwanyị karịa n'ụmụ nwoke. N'etiti ihe niile, anadị na-ebu amụma dị iche iche, echiche nke nrụgide ọha na njakịrị na-arụ ọrụ dị mkpa na-emetụta nchegbu metụtara ibu ụmụ nwanyị. [15] Sing Lee et al. achọpụtala na nchegbu ụmụ nwanyị na abụba anụ ahụ siri ike na mpaghara mepere emepe dịka Hong Kong. Ụfọdụ na -akọwa nsogbu iri nri juru ebe niile n'etiti ụmụ nwanyị dị ka akụkụ nke mmezi nke ọha na China. [16]

Igbu onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Na obodo China ka a'na ahụ pasent iri atọ nke igbu onwe onye n'ụwa niile ma bụrụ kwa naanị obodo ebe ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị na egbu onwe ha karịa ụmụ nwoke. Ndabere ihe ọmụmụ Pin Qing nke sitere na nyocha, ihe dịka pasent iri ise na isii nke ụmụ nwanyị gburu onwe ha n'ụwa niile bụ ndị China. Nkọwa ụfọdụ n'ekwu na ịkpa oke nwoke na nwanyị nke n'ewu ewu na China bụ isi ihe n'akpata ịdị elu ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị igbu onwe ha. [17] Ọtụtụ echiche ọdịnala obodo China, dị ka ọrụ ụmụ nwanyị na ịmụ nwa, ozi ezinụlọ na ihe ndị ọzọh na -etinye ụmụ nwanyị n'ọnọdụ adịghị ike. N'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2017, nwanyị dị ime dị afọ iri abụọ na isii, aha ya bụ Ma, si na windo ụlọ ọgwụ wụpụ, mgbe ezinụlọ di ya ekweghị ka ekụpụta ya nwa na afọ site na ịwa ya ahụ. Ezinụlọ ahụ jụrụ arịrịọ Ma ka awa ya ahụ kụpụta ya nwa n'ihi na ha kwenyere na usoro ahụ ga-eme ka ọ siere ya ike ịmụ nwa nke abụọ. Ihe merenụ kpalitela arụmụka kpụ ọkụ n'ọnụ gbasara ọnọdụ ụmụ nwanyị n'ime ezinụlọ na mgbasa ozi na-aga n'ihu maka ezinụlọ ịmụ naanị ụmụaka abụọ. [18]

Otú ọ dị, n'afọ ndị na -adịbeghị anya, ọnụ ọgụgụ ndị inyom na -egbu onwe ha na China belatara nke ukwuu, site na 26.1 n'ime otu narị puku ruo. Ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị na -egbu onwe ha belatara site na 1.2 ruo 0.96 mpaghara obodo mepere emepe na China. Paul SF Yip na-akọwa ma ụdị ọganiihu sitere na mmepe obodo China ngwa ngwa n'ime afọ iri 1990-2000, nke gụnyere mmụba dị ukwuu na ọnọdụ ibi ndụ, agụmakwụkwọ, na ihe ndị ọzọ. [19]

Ọ dịkwa mkpa iburu n'uche na ọnụ ọgụgụ mmadụ igbu onwe ya dị elu n'ime obodo karia na mpaghara ebe mepere emepe na China. Ọzọkwa, mbelata ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị na-egbu onwe ha n'ime obodo adịghị ebelata nnukwu. Nyocha nke Liu Meng n'ime obodo China gosiri na mgbe ụfọdụ ụmụ nwanyị na -eji igbu onwe ha dị ka ụzọ nnupụisi na oghere nzuzo ha, ụzọ iji nweta mmetụta na ike nke ha agaghị enweta n'oge ndụ ha. Nke a metụtara ụdị mmegbu nke ndị usoro nna ochie n'ime obodo China. [20]

Inweta Ihe Ike site na Onye Mmekọ[dezie | dezie ebe o si]

Dabere na nnyocha nke William Parish na ndị ọzọ na afọ 2004, pasent iri na itoolu nke ụmụ nwanyị zara ajụjụ na China kọrọ ahụmịhe nke ime ihe ike site n'aka onye mmekọ ha ebe pasent atọ nke ụmụ nwoke ibe ha kọrọ akụkọ a. Ọmụmụ sitere na nyocha ahụ gosiri na ogologo oge mmekọrịta na ọnọdụ akụ na ụba nwere njikọ chiri anya na omume nke ime ihe ike nwoke na nwanyị. Ahụkarị ndị zara ajụjụ a n'ime obodo ma ọ bụ n'Ebe Ugwu China ebe a na-enweta ụdị ime ihe ike a. [21]

Achọpụtara na ahụmịhe nke ime ihe ike nke onye ọlụlụ n'enwe mmetụta dị njọ na ahụike anụ ahụ na nke uche ụmụ nwanyị. Nnyocha mba dị iche iche nke Henrica AFM gosiri na iri na itoolu ruo pasent iri ise na ise ụmụnwaanyị ndị na enweta ime ihe ike mmekọ nwoke na nwanyị merụrụ ahụ n'ezie site na onye mmekọ ibe ha. Nke a ka akọwara na ọ nwewew ike inye ha nnukwu ihe egwu nke ọrịa uche dịka nkụda mmụọ. [22] [23]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ahụike na China
  • Ahụike na India
  • Ahụike ụmụ nwanyị

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. 1.0 1.1 1.2 Yu (1997). "Women's health status and gender inequality in China". Social Science & Medicine 45 (12): 1885–1898. DOI:10.1016/s0277-9536(97)00127-5. PMID 9447637. 
  2. Bluementhal (2005). "Privitization and Its Discontents: The Evolving Chinese Healthcare System". The New England Journal of Medicine 353 (11): 1165–1170. DOI:10.1056/NEJMhpr051133. PMID 16162889. 
  3. Chen (1993). "The Rise and Decline of the Cooperative Medical System in Rural China". International Journal of Health Services 23 (4): 731–42. DOI:10.2190/F8PB-HGJH-FHA8-6KH9. PMID 8276532. 
  4. Banister (1991). China's Changing Population. Stanford University Press. 
  5. Dong (March 2003). "Soft budget constraints, social burdens, and labor redundancy in China's state industry". Journal of Comparative Economics 31 (1): 110–133. DOI:10.1016/s0147-5967(02)00012-4. 
  6. Liu (2007). "Gender dynamics and redundancy in urban China". Feminist Economics 13 (3–4): 125–158. DOI:10.1080/13545700701445322. 
  7. Shi (2008). "Male and Female Adult Population Health Status in China: A cross-sectional national survey". BMC Public Health 8 (277): 277. DOI:10.1186/1471-2458-8-277. PMID 18681978. 
  8. Zhang (2005). "Spatial inequality in education and healthcare in China". China Economic Review 16 (2): 189–204. DOI:10.1016/j.chieco.2005.02.002. 
  9. Holroyd (1997). ""Doing the month": an exploration of postpartum practices in Chinese women". Health Care for Women International 18 (3): 301–313. DOI:10.1080/07399339709516282. PMID 9256675. 
  10. Heh (2004). "The association between depressive symptoms and social support in Taiwanese women during the month". International Journal of Nursing Studies 41 (5): 573–579. DOI:10.1016/j.ijnurstu.2004.01.003. PMID 15120985. 
  11. Strand (2009). "Doing the month: rickets and postpartum convalescence in rural China". Midwifery 25 (5): 588–596. DOI:10.1016/j.midw.2007.10.008. PMID 18276049. 
  12. 12.0 12.1 Thompson. China's Growing AIDS Epidemic Increasingly Affects Women. Population Reference Bureau. Archived from the original on 1 December 2017. Retrieved on 26 November 2017.
  13. 13.0 13.1 13.2 Lu (2 October 2008). "The changing face of HIV in China". Nature 455 (7213): 609–11. DOI:10.1038/455609a. PMID 18833270. 
  14. Wilkinson (October 2002). "Nonoxynol-9 spermicide for prevention of vaginally acquired HIV and other sexually transmitted infections: systematic review and meta-analysis of randomised controlled trials including more than 5000 women". The Lancet Infectious Diseases 2 (10): 613–617. DOI:10.1016/s1473-3099(02)00396-1. PMID 12383611. 
  15. Chen (25 October 2007). "Prevalence and sociodemographic correlates of eating disorder endorsements among adolescents and young adults from China". European Eating Disorders Review 16 (5): 375–385. DOI:10.1002/erv.837. PMID 17960779. 
  16. Lee (2000). "Disordered eating in three communities in China: A comparative study of female high school students in Hong Kong, Shenzhen, and rural Hunan". International Journal of Eating Disorders 27 (3): 317–327. DOI:<317::AID-EAT9>3.0.CO;2-2 10.1002/(SICI)1098-108X(200004)27:3<317::AID-EAT9>3.0.CO;2-2. PMID 10694718. 
  17. Qin (2001). "Specific characteristics of suicide in China". Acta Psychiatrica Scandinavica 103 (2): 117–121. DOI:10.1034/j.1600-0447.2001.00008.x. PMID 11167314. 
  18. Allen. Chinese debate medical rights after pregnant woman's suicide.
  19. Yip (2005). "Suicide rates in China during a period of rapid social changes". Social Psychiatry & Psychiatric Epidemiology 40 (10): 792–798. DOI:10.1007/s00127-005-0952-8. PMID 16205852. 
  20. Qin (2001). "Specific characteristics of suicide in China". Acta Psychiatrica Scandinavica 103 (2): 117–21. DOI:10.1034/j.1600-0447.2001.00008.x. PMID 11167314. 
  21. Parish (December 2004). "Intimate partner violence in China: National Prevalence, Risk Factors and Associated Health Problems". International Family Planning Perspectives 30 (4): 174–181. DOI:10.1363/3017404. PMID 15590383. 
  22. Henrica A F M (2008). "Intimate partner violence and women's physical and mental health in the WHO multi-country study on women's health and domestic violence: an observational study". The Lancet 371 (9619): 1165–1172. DOI:10.1016/s0140-6736(08)60522-x. PMID 18395577. 
  23. Xu (3 February 2004). "Prevalence of and Risk Factors for Intimate Partner Violence in China". American Journal of Public Health 95 (1): 78–85. DOI:10.2105/ajph.2003.023978. PMID 15623864. 
  24. (2007) "Gender equity in transitional China's healthcare policy reforms". Feminist Economics 13 (3–4): 189. DOI:10.1080/13545700701439473. 
  25. (2007) "China's Transition and Feminist Economics". Feminist Economics 13 (3–4): 1. DOI:10.1080/13545700701513954. 
  26. (2007) "Chinese women after the accession to the world trade organization: A legal perspective on women's labor rights". Feminist Economics 13 (3–4): 259–285. DOI:10.1080/13545700701439481. 
  27. (2007) "Gender and rural reforms in China: A case study of population control and land rights policies in northern Liaoning". Feminist Economics 13 (3–4): 63. DOI:10.1080/13545700701439440. 
  28. (2007) "Gender dynamics and redundancy in urban China". Feminist Economics 13 (3–4): 125–158. DOI:10.1080/13545700701445322. 
  29. Àtụ:Cite encyclopedia
  30. Àtụ:Cite encyclopedia
  31. (2007) "Gendering the dormitory labor system: Production, reproduction, and migrant labor in south China". Feminist Economics 13 (3–4): 239–258. DOI:10.1080/13545700701439465. 
  32. Ariana, Proochista; Naveed, Arif (2009), "Health", in Deneulin, Séverine; Shahani, Lila (eds.), An introduction to the human development and capability approach freedom and agency, Sterling, Virginia Ottawa, Ontario: Earthscan International Development Research Centre, pp. 228–245, ISBN 9781844078066
  33. (2010) "Turning Points in China's AIDS Response". China: An International Journal 08: 63–84. DOI:10.1142/S0219747210000051.