Wonders of the Invisible World

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Wonders of the Invisible World
ọrụ edemede
Odee akwụkwọCotton Mather Dezie
The Wonders of the Invisible World (1693)

The Wonders of the Invisible World bụ akwụkwọ Cotton Mather dere ma bipụta kwa na arọ 1693. A kpọrọ ya, Observations As well Historical as Theological, on the Nature, the Number, and the Operations of the Devils. Akwụkwọ ahụ kwuchitere ọnụ ọrụ Mather na ịchụ nta mmụọ e mere na Salem, Massachusetts. Ọ kwadoro nkwenye na amoosu bụ ike anwansi ọjọọ. Mather hụrụ ndị amoosu dị ka ngwá ọrụ nke ekwensu n'ọgụ Setan iji "meghe ubi a dara ogbenye, ógbè Puritan", na ikpe ndị amosu ikpe dị iche iche dị Ka ụzọ isi nweta ngọzi Chineke maka óụ̀ ahụ.

Arụmụka ya sitere na Saducismus Triumphatus nke Joseph Glanvill.[1] Otu akwụkwọ Glanvill dị n'ọbá akwụkwọ a na-akpo Mather mgbe ọ nwụrụ.

Nchịkọta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Cotton Mather na afọ 1663. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Harvard, ọ gbasoro nzọụkwụ nna ya, ghọọ pastọ nke Chọọchị nke Abụọ nke Boston. Ọ gara n'ihu n"ọrụ a site na afọ 1685 ruo mgbe ọ nwụrụ na afọ 1728.[2]

Mather malitere site na nkọwa nke otu ndị Chineke si ebi n'ókèala ekwensu. Ọ tụlere atụmatụ ekwensu iji kwatuo ubi ndị ụka na ụka site n'enyemaka nke ndị amoosu.

"...Ndị agha ekwensu na-awakpo n'ụzọ dị egwu n'ebe bụ etiti, na mgbe ụfọdụ, nwa mbụ nke ebe obibi anyị nke ndị England...[2]

Mather malitere ikpe ahụ site n'ikwu na ọ ga-akọ ha dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme. Otu n'ime ikpe ndị a gụnyere bụ nke Martha Carrier, onye bụ "[onye] nkwupụta nke ndị amoosu, na nke ụmụ ya n"etiti ndị ọzọ, o kwenyere na ekwensu kwere ya nkwa na ọ ga-abụ Eze Nwanyị nke Ndị Hibru. " Mather nyere akaebe megide Martha carrier. ihe niile mere ka ọ bụrụ onye ikpe mara [2]

Ihe Nketa[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ Mather kpaliri aha nke abọm nke afọ 2006 Last Days of Wonder nke otu ndị egwu dị na obodo Chicago bụ The Handsome Family; onye na-ede abụ Rennie Sparks kwuru na ihe ọ kpọrọ "ụma na'okpuru elu ihe" masịrị ya.[3]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Ihe edeturu[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ankarloo, Bengt and Henningsen, Gustav (editors) Early Modern European Witchcraft: Centres and Peripheries (1990). Oxford: Oxford University Press. p. 431-3.
  2. 2.0 2.1 2.2 (2007) in Baym: The Norton Anthology: American Literature, 7. ISBN 978-0393929935.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "norton" defined multiple times with different content
  3. Bahn. "Interview: Brett and Rennie Sparks of The Handsome Family", A.V. Club, 8 February 2006. Retrieved on 28 April 2015.