Jump to content

Yelwa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Yelwa bụ obodo dị na Kebbi Steeti, Naijiria dị n'akụkụ osimiri Niger na okporo ụzọ A1 . A na-akpọkarị obodo a "Yelwa, Yauri ", mgbe ọchịchị Emirate na ọchịchị ime obodo dị na ya, ọ bụghịkwa Yelwa ebe ogbugbu Yelwa mere na afọ 2004 na Plateau Steeti . Yelwa bụ isi obodo na nnukwu obodo nke Yauri Emirate. Yelwa nwere ọnụọgụgụ ndị bi na ya dị Puku asatọ n'afọ As of 2010ọtụtụ n'ime ha bụ ndị okpukpere Alakụba Hausa . [1]

Yelwa bụ ebe ahịa na ebe azụmaahịa nke Yauri Emirate. [2] E wezụga ịzụ ahịa, akụ na ụba ya gbadoro ụkwụ n'ọrụ ugbo. Ihe ọkụkụ ndị bụ́ isi a na-ebufe ala ndị ọzọ bụ Iyabasị, osikapa, na owu, n’oto aka ahụ,Yelwa na-amịpụtakwa sorghum, millet, cowpeas, ahụekere, okpete, shea nuts, ụtaba, mkpụrụ ojị, ose, agwa, azụ̀, ehi, na anụ ufe . [3] Ọtụtụ ndị ọrụ ugbo ruru (pasent irí asaa na iteghete mara abụọ ) na mpaghara Yelwa bụ ndị ọrụ ugbo nri, na ọtụtụ n'ime ha na-akwụ ụgwọ ala ha na-akọ ma ọ bụ ndị na-eketa ihe .

Akụkọ ihe mere eme

[dezie | dezie ebe o si]

Yelwa bụ isi obodo nke Yauri Emirate kemgbe afọ 1888, mgbe isi obodo ahụ si na Bin Yauri kwagara ebe ahụ mgbe agha obodo gasịrị. N'afọ 1896, Ụlọ ọrụ Royal Niger guzobere ebe a na-ere ahịa na Yauri. Ndị Britain weghaara obodo ahụ n'afọ 1901.

Iju mmiri tozuru akụkụ nke Yelwa kpamkpam site na mmepe mmiri mmiri nke Kainji n'afó 1986. Ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ ọkara nke ndị bi na Yauri, gụnyere ọtụtụ ndị nọ na Yelwa, bu ndị achụpụrụ site n'iwu nke mmiri mmiri Kainji . [2] nke nwere mmetụta dị njọ na ọrụ ugbo na mpaghara ahụ.

Edemsibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Salamone (2010). The Hausa of Nigeria. University Press of America. ISBN 9780761847243. 
  2. 2.0 2.1 Salamone (1975). "The drug problem in a small emirate in northern Nigeria". Journal des Africanistes 45 (1): 187–191. DOI:10.3406/jafr.1975.2189.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Salamone" defined multiple times with different content
  3. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named Britannica