Yemaneberhan Crippa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Yemaneberhan Crippa
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịItaly, Ethiopia Dezie
obodo maka egwuregwuItaly Dezie
Aha enyereYemaneberhan Dezie
aha ezinụlọ yaCrippa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Ọktoba 1996 Dezie
Ebe ọmụmụDessie Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụsụ mba Italy Dezie
Ọrụ ọ na-arụasọmpi egwuregwu Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie
ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpi5000 metres, 10,000 metres, 5K run Dezie
Ọrụ arụrụQ106327518 Dezie
so naQ58069064, athletics at the 2020 Summer Olympics – men's 10,000 metres Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Yemaneberhan "Yeman" Crippa (amụrụ na 15 Ọktoba n'afọ 1996) bụ onye Ịtali a mụrụ na Etiopia. Onye ritere ihe nrite ọla edo na 2019 European Team Championships (5000 m) na 2019 European 10,000m Cup. O sonyere na 2020 Summer Olympics, na 5000 m, na 10000 m.[1]

N'ọkwa ndị ntorobịa, o ritere ihe nrite ọla edo na 2017 European Athletics U23 Championships na n'ọsọ ndị na-erubeghị afọ 20 na 2014 na 2015 European Cross Country Championships na ọla nchara na asọmupi U23 na 2016 European Cross Country Championship.

A mụrụ ya na Dessie, n'akụkụ ugwu ọwụwa anyanwụ nke Etiopia, Yemaneberhan tụfuru nne na nna ya ndị Etiopia na Agha Eritrea ma daa n'ụlọ ụmụ mgbei na Addis Abeba. Di na nwunye ndị Ịtali, Roberto na Luisa Crippa, kuchiri ya n'afọ 2001 ma soro ha biri na Trento. Ọ bụ otu n'ime ụmụ itoolu di na nwunye ahụ kuchiri, ya na ụmụnne ya ndị okenye Nekagenet na Kelemu. Na mbido, o lekwasịrị anya na bọọlụ tupu ọ gbanwee gaa na ịgba ọsọ na 2007, ụmụnne ya abụọ bụkwa ndị na-agba ọsọ.[2][3]

Na erimeri ọtụtụ ihe nrite n'ụdị afọ dị iche iche, o mere nke mbụ ya na 2016 European Championships na Amsterdam na-emecha nke asatọ na mita 5000. Otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, ọ mechara nke asaa na mita 3000 na 2017 European Indoor Championships na Belgrade.

N'afọ 2019, o mere ihe ndekọ mba 10,000 mita na Doha World Championship na 27:10.76.[4]

  1. Athletics CRIPPA Yemaneberhan - Tokyo 2020 Olympics (en-us). Olympics.com/tokyo-2020/. Tokyo Organising Committee of the Olympic and Paralympic Games. Archived from the original on 2021-09-20. Retrieved on 2021-09-19.
  2. Yemaneberhan Crippa – The orphan born to run
  3. FIDAL bio (in Italian)
  4. 10,000 Metres Result | IAAF World Athletics Championships, DOHA 2019 | iaaf.org. www.iaaf.org. Retrieved on 2019-10-06.