Zainab Abdulkadir Kure

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Zainab Abdulkadir Kure
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereZainab Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Novemba 1959 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Niger Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria, onye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Nwada Zainab Abdulkadir Kure (amụrụ  ya na ùbọchi iri abụọ na anọ na ọnwa iri na otu na afọ 1959) aghọpụtara ya dika onye ome iwu na-anọchi anya gburugburu Niger South nke Niger State, Nigeria, Ọ batara ọchịchị na ụbọchị iri abụọ na itolu na ọnwa ise na afọ 2007. Ọ bụ onye otu  ndi ndọrọndọrọ ọchịchị a na-akpọ People's Democratic Party (PDP).[1]

Kure gara Mahadum nke Ahmadu Bello, Zaria ebe oritere nzere BSc na Political Science na afọ 1984.  Ọ lụrụ dika onye ọlụ oyibo na Niger Steeti, tupu o jèè izọ ọchịchị nke ndi ome iwu, O toruru n'ogo  onye isi odee-akwụkwọ. Di ya  Abdulkadir Kure bụ onye isi ọchichi Niger Steeti nke Naijiria malite na ubọchi iri abụọ na itolu nke onwa ise na-afo 1999 ruo na  ụbọchi iri abụọ na itolu nke ọnwa ise na-afọ 2007.[2]

Oge ahọpụtachara ya, enyere ya ọkwa n'otù na-ahụ maka nkwalite obodo,ụlọ-azụmazụ isi-ego na ọrụ ugbo. N'ihe ule etiti afọ nke ndi ome iwu na ọnwa ise na afọ 2009, Akwụkwọ ntọ akụko "ThisDay" deputara na okwadoro (National Grazing Reserves Establishment and Development Commission Bill) na (National Poverty Eradication Commission Bill) na afọ 2008. Akwụkwọ ntọ akụkọ dere na otinyere olu ya nke ọma na arụmarụ ụka na ọgbakọ, ọ na-akwado ọfụma na-agbado kwa anya na orụ kọmmitee .[3]

References[dezie | dezie ebe o si]

  1. Sen. Zaynab A Kure. National Assembly of Nigeria. Archived from the original on 3 March 2016. Retrieved on 2010-06-06.
  2. Abdulrahman Abubakar (21 October 2007). Women Better Politicians Then Men - Senator Zainab Kure. Daily Trust. Retrieved on 2010-06-06.
  3. An Improved Senate, But Some Uninspiring Senators.... ThisDay (24 May 2009). Retrieved on 2010-06-06.