Jump to content

Zam Zam Abdullahi Abdi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Zam Zam Abdullahi Abdi
NationalitySomalian, Kenyan
OccupationJournalist, human rights activist
Known forWomen's rights, children's rights

Zam Zam Abdullahi Abdi bụ onye nta akụkọ Somalia na Onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ. Ọ na-elekwasị anya karịsịa na ikike ụmụ nwanyị na ụmụaka. Ọ bụ nwa amaala abụọ nke Somalia na Kenya.

Mgbalị

[dezie | dezie ebe o si]

Abdi bụ onye na-ahụ maka iwulite ikike maka otu Coalition of Grassroots Women's Organisation na onye isi oche nke Somali Chapter nke African Network for Prevention and Protection megide Mmegbu na Nleghara ụmụaka. Abdi na-arụ ọrụ maka ohere agụmakwụkwọ dị mfe maka ụmụ nwanyị Somalia.[1]

Ịtọrọ mmadụ

[dezie | dezie ebe o si]

Na 2004, mgbe ọ na-ahụ maka ozi maka Association of Somali Women Journalists, ndị mmadụ ji egbe tọọrọ Abdi ma jide ya site na 24 October ruo 25th na Mogadishu, isi obodo Somalia. O kwenyere na a tọọrọ ya n'ihi ihe ọ na-eme iji chebe ụmụaka.[2]

Ebubo iyi ọha egwu nke afọ 2016

[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Ọktoba 2016, Zam Abdullahi Abdi gara ikpe n'ụlọ ikpe dị elu nke Kenya. [3] E boro ya ebubo na ọ tụrụ bọmbụ n'ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị na Mombasa.[4]

Ndị otu Cage Africa katọrọ ikpe a ka ndị ọkaiwu nke ndị ọrụ anọ ahụ metụtara ekweghị ka ha weta ihe akaebe iji maa ebubo a. A na-akọ na a na-enyocha ndị na-eme ihe ike n'obere oghere.[5]

Ihe odide

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Mohamed (30 November 2008). Human Rights Activists Pressure International Community to Address the Somali Crisis (en-US). Mshale. Retrieved on 2022-09-16.
  2. Une journaliste brièvement kidnappée à Mogadiscio (fr). Reporters Without Borders (25 October 2004). Retrieved on 2022-09-16.
  3. Bwana (25 September 2016). Three girls charged for concealing information about police raid (en-US). Hiiraan Online. Retrieved on 2022-09-16.
  4. Oketch. Three more women held in Mombasa terror probe (en). The Standard. Retrieved on 2022-09-16.
  5. Azfar (13 October 2016). CAGE Africa calls for fair trial for Kenyan women arrested under terrorism laws (en-US). CAGE. Retrieved on 2022-09-16.