Joke Muyiwa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Joke Muyiwa
BornÀtụ:Birth year and age
NationalityNigerian

Joke Muyiwa (amụrụ na 21 Machị 1963) bụ Onye Naijiria na-eme ihe nkiri, onye isi nsọpụrụ, onye nwe nzere Ph.D., na onye nkuzi na mahadum. [1] Ọ na-akụzi na ngalaba nke Performing Arts na Mahadum Olabisi Onabanjo. N'afọ 2018, HRM Oba Ebumawe nke Ago Iwoye chiri Joke Muyiwa echichi chiif Asa nke Ogo Iwoye .[2]

Mmalite ndụ na ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Joke Muyiwa na Abeokuta, steeti Ogun, na 21 Machị 1963. Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị ya n'ụlọ akwụkwọ Sacred Heart Convent, nakwa ụlọ akwụkwọ Baptist Grammar School maka agụmakwụkwọ sekọndrị ya, ha niile na Ibadan, steeti Oyo. Maka agụmakwụkwọ mahadum ya, Joke Muyiwa gara Mahadum Obafemi Awolowo ebe ọ nwetara nzere Bachelor of Arts (B.A Hons) n'isi ọmụmụ Dramatic Arts. O nwetara nzere MA n'isi ọmụmụ Theatre Arts na Mahadum Ibadan . [3] N'ọnwa Disemba 2020, ọtụtụ afọ n'ime ọrụ nkuzi ya, e nyere Muyiwa nzere ọkankuzi (Ph.D.) site na Mahadum Redeemers . [4]

Muyiwa nwere ihe karịrị afọ iri anọ nke ime ihe nkiri. Ọ malitere ọrụ ime ihe nkiri ya na Nigerian Television Authority (NTA), Ibadan, tupu ọ gaa na Mahadum nke Ibadan Performing Arts Theatre ma mesịa gaa Obafemi Awolowo University Theatre Company . [5] Kemgbe ahụ, Muyiwa apụtala n'ọtụtụ ihe nkiri nkwago, usoro ihe omume TV, na ihe nkiri ndị ọzọ.

Joke Muyiwa malitere ịkụzi ihe n'etiti afọ 2002 na 2003 na Mahadum Steeti Legọs [3] tupu ọ gafee na Mahadum Olabisi Onabanjo, ebe ọ kụzirila ihe oge karịrị afọ iri na anọ. O nwere mgbe ọ bụụrụ onye isi ngalaba Performing Arts na Mahadum Olabisi Onabanjo. Ọ bụ otu onye n'ime ndị nnọchiteanya nke Capital Sage Holdings gosiri ọhaneze.

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Joke Muyiwa bụ nne bụrụkwa nne nne. O nweburu ụmụ nwoke abụọ mana otu nwụnahụrụ ya mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ.[2] Nwa mbụ ya bụ Abayomi "Thespis" Ayeni, onye na-eti egwu.[6] Ọ ghọrọ nne nne na Machị afọ 2020.[7]

Ihe Nrite na nkwanye ùgwù Ya[dezie | dezie ebe o si]

  • Ihe nrite Onye na-eme ihe nkiri kachasị mma na ihe nkiri Yoruba na 2013 Best of Nollywood Awards maka ọrụ ya na Ayitale, nke Adebayo Salami mepụtara ma duzie.[8]
  • Ihe nrite Onye Na-emepụta ihe nkiri enyemaka kachasị Mma na 2014 Yoruba Movie Academy Awards maka ọrụ ya na Ayitale. [9]
  • A họpụtara ya maka Onye Na-emepụta ihe nkiri enyemaka (ngalaba Yoruba) na 2015 Best of Nollywood Awards maka ọrụ ya na Ayo Mi . [10]
  • O ritere Movie Matriarch Recognition Awards na 2018 City People Movie Awards . [11]

Ihe nkiri ndị O mere a họọrọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Swallow (2021)
  • Love Castle (2021)
  • The Mystic River - Usoro Naijiria (2021) [12]
  • Ayomi (2015)
  • Obinrin Ale (2009)
  • <i>The Narrow Path</i> (2006)
  • Afonja (2002)

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Joke Muyiwa becomes Ph.D holder - Vanguard Allure Joke Muyiwa becomes PHD holder (en-US). Vanguard Allure (10 December 2020). Retrieved on 3 December 2021.
  2. 2.0 2.1 Many people don’t know I’m a university lecturer —Joke Muyiwa (en-GB). Tribune Online (28 December 2019). Retrieved on 3 December 2021.
  3. 3.0 3.1 I Was Born Into a Muslim Family - Veteran Actress Joke Muyiwa Goes Down The Memory Lane (en-US). Time of gist (15 June 2021). Archived from the original on 3 December 2021. Retrieved on 3 December 2021.
  4. My PhD, a dream come true —Joke Muyiwa (en-GB). Tribune Online (13 December 2020). Retrieved on 3 December 2021.
  5. Kehinde (3 September 2018). Watching OLUMIDE BAKARE Years Ago Made Me Go Into Acting - JOKE MUYIWA (en-US). City People Magazine. Retrieved on 3 December 2021.
  6. If not for mum, I would not have existed –Thespis (en-GB). Tribune Online (28 June 2020). Retrieved on 3 December 2021.
  7. Nwachukwu (24 March 2020). Joke Muyiwa becomes grandmother (en-US). QED.NG. Retrieved on 3 December 2021.
  8. BON Awards 2013 Winners. bonawards.com. Archived from the original on 31 January 2014. Retrieved on 19 June 2015.
  9. jonathan (22 April 2014). Full List of Winners: Yoruba Movie Academy Awards 2014 (en). Pulse Nigeria. Retrieved on 3 December 2021.
  10. Ade-Unuigbe (1 November 2015). Ini Edo, Stephanie Linus, Odunlade Adekola, Iyabo Ojo & More Nominated for the Best of Nollywood (BON) Awards | See Full List (en-US). BellaNaija. Retrieved on 3 December 2021.
  11. People (24 September 2018). Winners Emerge @ 2018 City People Movie Awards (en-US). City People Magazine. Retrieved on 3 December 2021.
  12. Nigerian filmmaker exposes deadly tradition in new horror series 'The Mystic River' (en-GB) (11 May 2021). Retrieved on 3 December 2021.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Joke Muyiwa na IMDb