Adeola Ariyo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Adeola Ariyo
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha ezinụlọ yaAriyo Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1980s Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụmodel Dezie
onye were ọrụElizabeth Arden, Inc. Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Adeola Ariyo bụ onye Naijiria bụ onye nlereanya na eze nwanyị mara mma nke ghọrọ onye mbụ nnọchi anya mba Afrịka nke Elizabeth Arden n'afọ 2014.[1] Ọ malitere ọrụ ime ihe ngosi ya mgbe ọ dị afọ iri na atọ mgbe a chọpụtasịrị ya ma nsonye ya na London Fashion Week.[2] A na-akpọ Adeola mgbe ụfọdụ dị ka onye Naijiria-Ghanaian maka ihe nketa ya.[2] A mụrụ ya n'aka nne Ghana na nna Naijiria.

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Adeola na Lagos n'aka nne Ghana na nna Naijiria. Ọ tolitere na Naịjirịa mana mgbe ụfọdụ ya na nna ya na-aga London. Nsonye ya na London Fashion Week mgbe ọ dị afọ iri na atọ mezuru mgbe ya na nna ya gara ịzụ ahịa na London.[3] Ọ bụ ezie na ọ na-anọkarị na Cape Town, South Africa, mànà Adeola na-agakwa Lagos na London.[4]

Mmepụta ọlụ ihe Nlereanya ya[dezie | dezie ebe o si]

Ọlụ ihe nlereanya Adeola malitere mgbe ọ dị afọ iri na atọ mgbe ọ zutere Alek Wek na Kate Moss ozugbo ụlọ ọrụ London Fashion Week bịanyere aka na ya.[5] N'afọ 2005, o sonyere na asọmpi Nokia Face of Africa ma kemgbe ahụ, ọ na-arụsi ọrụ ike na ihe ngosi mba ụwa.[4] Ewezuga igosi na London Fashion Week, Adeola egosila na izu ejiji ndị ọzọ. Ndị a ma ama n'etiti ha bụ Johannesburg Fashion Week, Mozambique Fashion Week, Cape Town Fashion Week, Arise Fashion Week Lagos na London Fashion Week.[5] Ọ nọrọ ọtụtụ afọ na-eme ihe nlereanya na South Africa tupu ọ nweta nhọpụta Elizabeth Arden na Febụwarị 2014.[6] Ewezuga igosi na izu ejiji dị iche iche, Adeola gosipụtakwara maka ọtụtụ akwụkwọ ejiji dịka Marie Claire, True Love na Fair Lady, Cosmopolitan na Glamour.[7]

Ọrụ ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

N'ịbụ onye Afrịka, Adeola etinyewokwa aka n'ọtụtụ ọrụ ebere na ọrụ mmata. Ihe a ma ama n'etiti ọrụ ebere ya bụ itinye aka ya na "The Lunchbox Fund", ọrụ e mere iji nye nri kwa ụbọchị maka ụmụaka ụlọ akwụkwọ na-adịghi ike, na ụmụ mgbei na South Africa. Adeola tinyekwara aka na ọrụ Elizabeth Arden ndị ọzọ dị ka "Make a Visible Difference" Campaign.[8]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Zoe Efstathiou (2015-03-27). Elizabeth Arden appoints Adeola Ariyo as African Ambassador (en-GB). Global Cosmetics News. Retrieved on 2020-11-12.
  2. 2.0 2.1 Rey (2016-08-20). Model: Adeola Ariyo (en-US). Sola Rey. Retrieved on 2020-11-12.
  3. Adeola Ariyo becomes first African brand ambassador for Elizabeth Arden. cosmeticsbusiness.com. Retrieved on 2020-11-12.
  4. 4.0 4.1 Boss Models Cape Town. Adeola Ariyo | Women | Mainboard Mgmt | Boss Models Cape Town - Women and Men for South African and International Bookings (en). Boss Models Cape Town. Retrieved on 2020-11-12.
  5. 5.0 5.1 BLANCK (2019-07-22). THE INTERVIEW: ADEOLA ARIYO ON THE AFRICAN MODELLING INDUSTRY (en). Blanck Digital. Retrieved on 2020-11-12.
  6. The Cut off. Adeola Ariyo for Elizabeth Arden (en). Retrieved on 2020-11-12.
  7. Odusola (2019-07-22). THE INTERVIEW: ADEOLA ARIYO ON THE AFRICAN MODELLING INDUSTRY (en). Blanck Digital. Retrieved on 2020-11-12.
  8. Adeola Ariyo | Women | Mainboard Mgmt | Boss Models Cape Town - Women and Men for South African and International Bookings (en). Boss Models Cape Town. Retrieved on 2020-11-12.