Akosua Busia

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Akosua Busia
WebsiteÀtụ:Website

Akosua Gyamama Busia (amụrụ na 30 Disemba 1966) [1][2] bụ onye mba Ghana n'eme ihe nkiri, onye edemede na onye na-ede egwu. A maara ya maka ndị na-ekiri ihe nkiri maka igwu Nettie Harris na ihe nkiri n'afọ 1985 The Color Purple . Ọ bụ nwa nwanyị nke Praịm Minista Ghana Kofi Abrefa Busia.

A mụrụ Busia na Accra n'afọ 1966. Ọ bụ nwa nwanyị nke Kofi Abrefa Busia, onye bụ onye ịsị ala nke Republic of Ghana (site n'afo 1969 rụo n'afọ 1972) na nwa eze nke Ezinụlọ eze nke Wenchi, [3] otu nke Ashanti, na-eme ka Akosua bụrụ Ada eze. [4] Nwanne ya nwanyị, Abena Busia, bụ onye n'ede uri na agụmakwụkwọ, onye bụ prọfesọ na Bekee na Mahadum Rutgers, ma kemgbe n' afọ 2017 ọ bụ onye nnọchi anya mba Ghana na mba Brazil. [5]

Busia tolitere na Ghana, ma malite ọrụ ime ihe nkiri ya mgbe ọ dị afọ iri na isii, na-aga Central School of Speech and Drama nke London na agụmakwụkwọ.[6] Ọrụ mbụ ya n'eme ihe nkiri bụ dị ka Juliet na ndị ọcha, na-eme Shakespeare's Romeo na Juliet na Mahadum Oxford, ebe ụmụnne ya nọ na-agụ akwụkwọ.[1][6]

  1. (2008) Who's Who Among African Americans. Gale Research. ISBN 978-1-4144-3400-1. 
  2. McCann, Bob (2010). Encyclopedia of African American Actresses In Film And Television. McFarland. ISBN 978-0-7864-3790-0. 
  3. Kiesewetter. "'ER' actress dreams about having it all", The Cincinnati Enquirer, 7 April 1999. Retrieved on 3 February 2010.
  4. Wallace (1998-09-25). War of Words (en-US). Los Angeles Times. Retrieved on 2023-10-15.
  5. The Ambassador (en-US). Ghana Embassy - Brasilia, Brazil. Retrieved on 2023-10-15.
  6. 6.0 6.1 Smith, Gail (4 December 1998), "Just don't say 'no'", Mail & Guardian (South Africa).