Bilkisu Yusuf

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Bilkisu Yusuf
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya2 Disemba 1952 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya24 Septemba 2015 Dezie
Ebe ọ nwụrụMecca Dezie
Ụdị ọnwụaccidental death Dezie
Ọrụ ọ na-arụnewspaper editor, Onye ntaakụkọ Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Wisconsin–Madison, Mahadum Ahmadu Bello, Moscow State Institute of International Relations Dezie

Bilkisu Yusuf, nke a makwaara dị ka Hajiya Bilkisu Yusuf, (Disemba 2, 1952 – Septemba 24, 2015), bụbu onye nta akụkọ Naịjirịa, onye ode akwụkwọ na onye ndezi akwụkwọ akụkọ ama ama n'Abuja, Kano na Kaduna,nke Naijiria . A maara ya na Naijiria maka ị bụ nwanyị mbụ na-edu ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ, were jee ozi dịka onye nchịkọta akụkọ maka mmadụ nyee ụlọ akwụkwọ akụkọ abụọ ọzọ. Ọ bụ onye Awusa, Alakụba, onye nkwado ụmụ nwanyị, na onye na-akwado otu ngwakọta ofufe dị iche iche, onye a ma ama maka ị bụ onye ndụmọdụ nye onye isiala Naịjirịa n'ihe gbasara mba ofesi yana ịtọ ntọala ndị otu NGO, dịka Women In Nigeria (WIN) na Federation of Muslim Women Association. (FOMWAN). A zọgburu Yusuf na <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/2015_Mina_stampede" rel="mw:ExtLink" title="2015 Mina stampede" class="cx-link" data-linkid="58">2015 Mina stampede</a> ka ọ nọ na Haj na Mecca,na Saudi Arabia . [1] [2]

Nke onwe[dezie | dezie ebe o si]

Yusuf gara Mahadum Ahmadu Bello ma hiwe nzukọ ahụ ụmụ nwanyị nọ na Naịjirịa n'ebe ahụ na mbido afọ 1980.

A mụrụ Bilkisu Yusuf n'ụbọchị nke 2 n'ọnwa Disemba, n'afọ 1952. [3] Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị ya n'ụlọ akwụkwọ Ansar Primary,nke Kano n'afọ 1964, were gaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Government Girls College, nke Dala,dị na Kano. [4]

Akwụkwọ mahadum nke Yusuf gụrụ bụ na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nta akụkọ. Ọ nwetara nzere bachelọ na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Mahadum nke Ahmadu Bello na Zaria, dị na Naijiria; ogo mmụta masta na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta mba ụwa na Mahadum nke Wisconsin – Madison na Madison, dị na Wisconsin, n'Amerịka; na ogo mmụta dị elu na nta akụkọ site na International Journalism School na Moscow State Institute of International Relations na Moscow, dị na Rọshịa, n'afọ 1986. [4] [5]

Ọ lụrụ Alhaji Sanusi Ciroma Yusuf, onye mechara bụrụ onye isi ikpe obodo. [6] Di na nwunye ahụ nwere ụmụ abụọ, nwa nwoke Moshood Sanusi Yusuf na nwa nwanyị Nana Fatima. [3] [4] Ha mechara gbaa alụkwaghịm. Di ya nke mbụ nwụrụ mgbe ọ dị afọ 73. [7] Ọ lụrụ di ya nke abụọ, bụ Mustapha Bintube.

E nyere Hajiya Bilkisu Yusuf aha nsọpụrụ bụ Hajiya mgbe e mechara njem uka na Mecca (Haji bụ ụdị nwoke). Ọ nwụrụ mgbe ọ na-eje ozi dịka onye ndu ụmụ nwanyị n'aha National Hajj Commission nke Naijiria. [3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Bilkisu Yusuf bụ onye nta akụkọ nke akwụkwọ akụkọ Daily Trust na Leadership n'Abuja,nke Naijiria. [8] Mgbe o si Mahadum nke Wisconsin-Madison lọghachi, ọ ghọrọ onye nwanyị mbụ ị bụ editọ na Sunday Triumph,na Kano, site n'afọ 1983 ruo n'afọ1987. [6] [9] O ji ọkwa onye nhazi na New Nigerian, na Kaduna, n'afọ 1987 na Citizen Magazine, na Kaduna, n'afọ 1990. A ma ya ama maka kọlụm ya bụ "Civil Society Watch". [10] Ọ rụsiri ọrụ ike na The Nigeria Association of Women Journalists (NAWOJ), nke zụrụ ụmụ agbọghọ na-ede akwụkwọ nta akụkọ na Naijiria . [11]

Yusuf bụbu onye ndụmọdụ onye isi ala Naịjirịa n'ihe gbasara mba ofesi. [5] Ọ bụbukwa onye a ma ama na-ịkwado ụmụ nwanyị. [12] O guzobere ọtụtụ NGO, dị ka Women In Nigeria (WIN), nke bụ otu n'ime nzukọ izizi na-akwado ụmụ nwanyị na Naijiria, [13] [14] Federation of Muslim Women Associations in Nigeria (FOMWAN), [15] the Nigerian Interfaith Action Association Against Malaria (NIFAAM), [8] na Health Reform Foundation of Nigeria (HERFON), Ọ bụ onye isi oche nke Advocacy Nigeria. [2] O nọ na-arụ ọrụ na ' Bring Back Our Girls', nke e mere iji dulata ụmụ agbọghọ Chibok.

Ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

Ihe ị zọgbu mmadụ mere n'ebe nkwụsị dị na Mina, Saudi Arabia n'ụbọchịnke 24 n'ọnwa Septemba, n'afọ 2015, n'ihe dị ka elekere 9 nke ụtụtụ. Ìgwè mmadụ ahụ si Muzdalifah na-aga Jaramat, ebe ndị njem uka na-atụ okwute na ogidi iji gosipụta ị tụ ekwensu okwute n'oge Hajj. [16] Ha ga-esi ebe ahụ gawa nnukwu ụlọ alakụba dị na Mecca. A zọgburu ihe karịrị ndị njem ụka mmadụ 2,000 n’oge nzọgbụ ahụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ narị abụọ n’ime ha bụ ndị amaala Naijiria. [17] [18] Bilkisu Yusuf bụ onye a mara n’ime ndị ahụ nwụrụ. [19] Ndị ọzọ a ma ama na Naịjirịa gụnyere Prọfesọ Tijjani El-Miskin. [20]

Ihe gbara ya gburugburu[dezie | dezie ebe o si]

Ndị njem ala nsọ si Hajj na Mina na-aga Jamarat Bridge n'okporo ụzọ akara.

Saudi Arabia bụ mba Middle East nwere ọnụọgụgụ 27,752,316. [21] Ọ bụ ụlọ nye ụlọ alakụba abụọ nke kachasị nsọ na okpukpe Alakụba. Otu n'ime ndị a bụ Masjid al-Haram na Mecca, nke bụ ebe njem a. Nke ozo bụ Masjid an-Nabawi nke Medina, ebe olili ozu nke onye amụma Muhammad . Njem a a na-aga Mecca bụ ogidi nke ise nke Alakụba ma dịka nkwenkwe ya si dị, e kwesịrị i me y opekata mpe otu ugboro na ndụ ndị Alakụba ọ bụla. [22] Ọtụtụ puku mmadụ na-eme njem uka a kwa afọ site na gburugburu ụwa.

Nigeria bụ obodo nọ na ọdịda anyanwụ nke Afrịka. Obodo a nwere njikọ chiri anya nke nna ochie, nke na-akpata ịkpa oke megide ụmụ nwanyị. Ha nwekwara nsogbu ị da ogbenye na ọgwụ ọjọọ. [21] Ndị Boko Haram n’afọ 2014 tọọrọ ụmụakwụkwọ nke Chibok dị narị abụọ na iri na itoolu, nke mere ka mba ụwa nile gbaa mbọ ịzọpụta ụmụagbọghọ a. Kaosinadị, a chọtara ihe dịka 100 site n ’Eprel ruo na Mee nke afọ 2017. [23]

Omume[dezie | dezie ebe o si]

Ụlọ ọrụ nke onye isi ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari wepụtara nkwupụta a na-eso nzọgbu ahụ: "Onye isi ala Buhari na-esoro Guild of Editors nke Naijiria na Nigerian Union of Journalists n'ọnwụ dị mwute nke Hajiya Bilkisu, onye kwesịrị nṅomi, onye raara onwe ya nye, onye maara ihe, e nweere ntụkwasị obi, onye a kwanyeere ugwu nke ukwuu, onye editọ na onye ode akwukwo puru iche, agbanyeghị onwu, bu onye ga-abu ihe nlere anya nke ndi oru nta akuko, n'ime na ezi na Naijiria. [2] [20]

Jibrin Ibrahim, onye ntụzi aka na Centre for Democracy and Development kọwara Yusuf dị ka "nnukwu mmadụ, onye nkwado, onye nta akụkọ, onye mgbasa ozi na ọkachasị nwee ntụkwasị n'Alakụba, onye nwụrụ mgbe ọ na-efe Chineke." [24]

Dọkịnta Oby Ezekwesili, onye isi otu ‘ Bring Back Our Girls’ ma bụrụkwa onye minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa n’oge gara aga kwuru sị, “Bilkisu lụrụ ọgụ n’oge ndụ ya niile maka agụmakwụkwọ ụmụaka. Ọ naghị agbanwe agbanwe na nkwado ya. Ike agwụghị ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Anyi na-eto ihe ezigbo nwanne anyi nwanyi mere. Obi dị anyị ụtọ ị nabata ya dịka akụkụ nke ezinụlọ anyị. " [25] [26]

Aliyu Muktar, onye bụbu onye editọ nke akwụkwọ akụkọ Triumph onye ya na Yusuf rụkọtara ọrụ kwuru, "Ọ bụụrụ m onye nlereanya, ezigbo nwanyị ji ọrụ aka, nke ọma na enweghị ntụpọ. Ị mara, ọ kara obi, na-ekwu eziokwu ma na-alụ ọgụ mgbe niile maka ndị e wedara n'ala. Ị makwazi ihe ndi ọ rụrụ n'oge gra aga; Hajiya bụ onye na-agaghị anabata ikpe na-ezighị ezi ebe ọbụla. [26]

Ngosiputa na omenaala[dezie | dezie ebe o si]

Bilkisu Yusuf bụ otu n’ime ndị odeakụkọ iri abụọ na abụọ a gbara ajụjụ ọnụ maka akwụkwọ encyclopedic Nigerian Journalism nke Mike Awoyinfa na Dimgba Igwe dere. [4]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndi Hausa
  • Ihe mere n’oge Hajj
  • Ụmụ nwanyị nọ na Nigeria

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Lost in the Hajj stampede was a pioneering journalist who united Christians and Muslims. Public Radio International (September 29, 2015).
  2. 2.0 2.1 2.2 Female Editor, Bilikisu; El-Miskeen, 4 Others Die In Hajj Stampede. Dailyindependentnig.com.
  3. 3.0 3.1 3.2 Bilkisu died on national assignment – Husband.
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 Hajiya Bilkisu: She was too good and true.
  5. 5.0 5.1 Bilkisu Yusuf. wisemuslimwomen.org. Archived from the original on 2013-04-06. Retrieved on 2020-11-06.
  6. 6.0 6.1 Obituary: Hajiya Bilkisu, mni (1952-2015).
  7. Kano Emirate Kingmaker, Madaki Passes On At 73..
  8. 8.0 8.1 Hajiya Bilkisu Yusuf.
  9. International Press Institute: IPI mourns former board member Hajiya Bilkisu Yusuf. Archived from the original on 2015-10-08. Retrieved on 2020-11-06.
  10. Late Bilkisu Yusuf.
  11. NAWOJ Mourns Bilkisu Yusuf Who Died In Tragic Mecca Stampede.
  12. Lost in the Hajj stampede was a pioneering journalist who united Christians and Muslims. Public Radio International.
  13. My tribute to Bilkisu Yusuf. Uncova.com.
  14. Investigations of mega looting must continue, but must be lawful. Newsdiaryonline.com. Archived from the original on 2015-09-26. Retrieved on 2020-11-06.
  15. Mecca stampede: FOMWAN mourns North's first female editor, Bilkisu Yusuf – DailyPost Nigeria. DailyPost Nigeria.
  16. "How the Hajj Stampede Unfolded", The New York Times, September 25, 2015.
  17. Kasolowsky. "Death toll in Saudi haj disaster at least 2,070: Reuters tally", Reuters, October 29, 2015.
  18. Jon Gambrell - AP (19 October 2015). Saudi Arabia hajj disaster death toll at least 2,177. Washington Post.
  19. Saudi Tragedy: Hajj Commission Identifies 30 Dead Nigerians. Thisdaylive.com (September 26, 2015). Archived from the original on October 16, 2015. Retrieved on November 6, 2020.
  20. 20.0 20.1 Buhari laments death of Bilkisu Yusuf,other pilgrims. Dateline News – Nigeria Online News – Nigeria Breaking News. Archived from the original on 2016-03-04. Retrieved on 2020-11-06.
  21. 21.0 21.1 The World Factbook. Archived from the original on 2020-12-29. Retrieved on 2020-11-06.
  22. Mecca Pilgrimage. Archived from the original on 2020-08-08. Retrieved on 2020-11-06.
  23. Chibok: Inside the Search for the School Girls Abducted by Boko Haram.
  24. Exit of Journalism Icon, Bilkisu Yusuf. Realnews Magazine.
  25. Archived copy.
  26. 26.0 26.1 Exit of Journalism Icon, Bilkisu Yusuf.