Chinụa Achebe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Wuá ébé: otú uzọr, chọwa
Chinua Achebe

Chinụa Achebe bụ onye Igbo. Ọ bụ ya dere akwụkwọ a na-akpọ Things Fall Apart. E si n'akwụkwọ ahụ mara aha ya nke ukwuu n'ụwa nile.

A mụrụ Chinụa Achebe n'ụbọchị nke iri na isii n'ọnwa Novemba n'afọ 1930 n'obodo Ogidi nke dị n'ala Naịjiria. Aha a gụrụ ya bụ Albert Chinụalụmọgụ Achebe. Ọ gara ụlọakwụkwọ nta nke ndị uka, gakwaa Government College n'Umuahia. O mechara gakwaa mahadum nke Ibadan University of Ibadan, ebe ọ gụrụ asusu bekee (English) site n'afọ 1948 ruo afọ 1953. Ka ọ gụchara akwụkwọ nke mahadum, ọ rụtụkwara ọrụ n'ụlọakwụkwọ dị iche iche nakwa n'ụlọọrụ mgbasa ozi. Site na 1958 ruo 1966, Chinụa Achebe bụ onye nhazi na-ahụ maka African Writers Series.

Mgbe Achebe dere Things Fall Apart, akwụkwo ahu rere nke ukwuu, mkpụrụ nde iri. A tụgharịkwaala akwụkwụ a n'olu asụsụ iri ise.

Chinụa Achebe rụkwara ọrụ onye diplomat n'ọchịchị nke Biafra site na 1967. Mana site na 1967 ruo 1981, ọ kụzikwara na mahadum dị iche iche n'ala Naijiria, ma bụrụkwa onye nhazi maka akwụkwọ edemede nke a na-akpọ Okike. N'afọ 1981, Chinụa Achebe sokwa na ndị bidoro Otu Ndi Odee Nke Naijiria, nke a na-akpọ Association of Nigerian Authors. Ọ rụkwara ọrụ onye isi were ruo 1986.

Things Fall Apart, Anchor trade paperback cover

A bịa n'etiti Ndị Nka, yaa bụ ndị na-ede edemede nke Modern African Literature, ihe a na-akpọ Chinụa Achebe bụ Nna. N'afọ 2002 ka e nyere ya Peace Prize nke German Book Trade. A makwa Chinua Achebe dị ka onye na-enweghi onye e ji atụnyere ya maka ịmalite edemede n'asụsụ bekee' n'akụkụ ọdịda anyanwụ n'ala Afrịka.

[mèzi] Ihe Ndị O Dere

Novels

Short Stories

Poetry

Essays, Criticism and Political Commentary

Children's Books

Ngwa nkem
Ámááhà

Nke ichè ichè
Há hụrụ ya olé
Mmèmé
otú uzọr
mmẹkotaariá
Ngwa Orü
Na asụsụ ndị ozó