Ndị Igbo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Wuá ébé: otú uzọr, chọwa
Igbo people.jpg

N'ala Naigeria, ndï Igbo bu ndi ato hiri nne na onu agugu. Asusu eji mara ndiigbo bu asusu olu igbo. Nke ọzọ bu "broken English" ha ne ku ufọdi. Imerime mmadu nasu asusu bekee, site na-enyemaka nke amumamu olu bekee. Ufodi state ndi Igbo na Naigeria nọ nke nnuku bu, Abia State, Anambra State, Ebonyi, Enugu, ma na Imo State. Delta State (Anioma) na Rivers state.

Ákíkó[mèzi]

Site n'otu esi kọwa na nke mbu, na ala Naigeria, ndi Igbo no na Abia, Anambra, Ebonyi, Enugu and Imo state. Enwekwara ndi Igbo na Delta state nakwa Rivers state.

A guba ndi kasi n'onu ogu na Naijiria, ndi Igbo bu ndi nke ato. Dika onu ogu afo 2007 siri kowa, ndi Awusa weresia, ndi Yoruba ewere, tupu o ruo ndi Igbo. Onweghi onye ma ndi Igbo ole bi n'uwa a, maka na ndi Igbo gbasara mba di iche iche; na-azu ahia, ma o bu na-agu akwukwo. N'ime Naijiria, ndi Igbo bi na steti dum. Ebe ha si pua njem, bu Omambala (nke a kporo Anambra); Abia; Enugwu; Ebonyi nakwa Imo. Ndi Igbo jukwara eju bara a bara na Delta; Rivers, ufodu akuku Edo, Akwa Ibom, Cross River, Bayelsa nakwa Benue. Ebe ndi Igbo gboro kasa na-abughi ala nna ha, bu Lagos, Kano, Kaduna na steti dum di na Naijiria). Ndi Igbo bu ndi njem. I ruo obodo di iche iche na Afrika, Yurop, Amerika ma o bu Eshia, i ga-ahu imilikiti ndi Igbo. Onwere onye agbata obi siri, na obodo ndi Igbo anǫghi, abughi ezi obodo. Obodo obuna ndi Igbo nǫ, i fa na-enwe ǫgbakǫ ųmų-Igbo. Ǫgbakǫ ndia na-enye aka įfu na ǫmenani Igbo ma ǫdinma ndi-Igbo na-aga n'iru.

Literature[mèzi]

  • Chidi Leonard Ilechukwu: Igbo - Indigenous Economy and the search for Sustainable Development in Post Colonial African Society. Cidjap Press, Enugu 2008, ISBN 978-978-087-181-9.

Lee nke özö[mèzi]