Emmanuel Nnamdi Uba

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Emmanuel Nnamdi Uba
Mmádu
Akụkụ nkeNigerian senators of the 8th National Assembly, Nigerian senators of the 7th National Assembly Dezie
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoEmmanuel Nnamdi Uba Dezie
Aha enyereEmmanuel Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Disemba 1958 Dezie
Ebe ọmụmụEnúgwu Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiGovernor of Anambra State, onye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọCalifornia State University Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie
agbụrụNdị Igbo Dezie

Emmanuel Nnamdị Ụba

Sinetọ Naịjirịa nke ndịda Anambra steeti

Onye nọ ugbua

Ọ banyere na

Mee 2011

Ọnọchiri Ikechukwu Obiorah

Nkọwa onwe

Ọmụmụ 14 Disemba 1958 (afọ 61)

Enugwu, Enugwu Steeti, Naịjirịa

Ndọrọ ndọrọ ọchịchị parti All Progressives Congress (APC)

Emmanuel Nnamdị Uba, ma ọ bụ Andy Ụba (amụrụ ya 14 Disemba 1958), bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa nke ahọpụtara ka Sinatọ ndị ndịda Anambara Steeti, Naịjirịa, na Epurel 2011. Ọ zọọ n'okpuru ndị People's Democratic Party (PDP). Ọ gbahapụrụ PDP gaa na All Progressives Congress na Febuwarị 2017; ọgbaghara ndị ndú na-achịbu PDP nwere ike ị bụ ya kpalite ya ịkpụ. Ọ lụrụ pastọ Faith Vedelago nke Faith Miracle Center Abuja ma nwekwa ụmụ abụọ. [1] [2]

Ọrụ mmalite[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Uba n’abalị iri na anọ n’ọnwa iri na abụọ n’afọ 1958 n’Enugwu, ma gaa ụlọ akwụkwọ ‘Boys High School’ dị na Awkunanaw. Ndị nne na nna ya bụ ndị Ụga n'okpuru ọchịchị nke Agụata nke Anambara Steeti.

Dị ka ụfọdụ ndị si kwuo,  ]

[3] .  N'aka nke ọzọ,Mahadum Concordia gọnahụ na Emmanuel Nnamdị Ụba agụsịghị na ụlọ akwụkwọ ha. Ha kwetara na ndekọ ha na-egosi na a nabatara otu Emmanuel Ụba n'ụlọ akwụkwọ mana ọ gụchaghị akwụkwọ ahụ.

Onye nnyemaka onye isi ala[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ ka nọ na United Steeti Ụba nyeere aka na ntuli aka onye isi ala nke 1999 na Naịjirịa.  ] Mgbe ntuli aka gasịrị, ọ laghachiri Naịjirịa ma ahọpụta ya dịka Onye enyemaka pụrụ iche na Ọrụ Ndị Pụrụ Iche na kwa ọrụ ime ụlọ nke Onye isi ala bụ Olusegun Obasanjo . Na nleta nke septemba 2003, Obasanjo gara na United Steeti, a kọwara Ụba dịka onye aka nri nke Onye isi ala, yana onye nche ọnụ ụzọ maka ndị chọrọ ịgwa Onye isi ala okwu. 

Onye ndọrọndọrọ ọchịchị ahọpụtara[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 2007, Ụba zọọrọ na nhọputa PDP maka ntuli aka gọvanọ nke steeti Anambara, a ma họpụta ya na ntuli aka na Epurel 14 2007. Mana, onye bụbu gọvanọ bụ Peter Obi gbara akwụkwọ na ntuliaka ahụ, na-ekwu na, n’ihi na ụlọ ikpe nabatara na Obi meriri na ntuli aka Epurel 2003 na 15 Machị 2006, na ọ ka nwere afọ atọ ọzọ ma ọ bụ afọ anọ ya ịchị. Ndị ọkaikpe ahụ nakweere arụmụka ahụ, na 14 Juunu 2007, ha kwụsịrị ntuli aka nke Andy Ụba. [4] N’ọnwa Nọvemba afọ 2009 ka akọwara na Ụba na-akwado ịzọ ọchịchị maka ọkwa gọvanọ steeti Anambara egburu ya oge na Febụwarị afọ 2010 n'okpuru Labour Pati, ka ha kpọrọ ya ka mee ya. ikpo okwu, [5] nke ndị otu Labour kpọrọ ya ka ọ mee njem ahụ. [6] Ndị isi otu Labour Pati kwuru na ha "kwenyere na ọ ga-emepụta ebumnuche na echiche nke otu ha." [7] N'ikwu okwu banyere mkpebi ya ịgbanwe na pati ọzọ. Na 31 Disemba 2009 Ụba kwuru "Labour bụ ebe obibi ndọrọ ndọrọ ọchịchị m". [8]

Na ntuli aka nke Febuwariị 2010, Ụba gbara nke atọ.

Ntuli aka Sineti nke 2011[dezie | dezie ebe o si]

Ụba laghachiri na PDP ma ahọpụta ya dịka onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị PDP nke ndịda Anambara na ntuli aka nke Epurel 2011. O ji votu 63,316, merie Chukwmaeze Nzeribe nke All Progressive Grand Alliance (APGA) nwere 43,798 na onye omeiwu nọ oge ahụ bụ Ikechukwu Obiorah nke pati Accord nwere 24,724. Omeiwu Obiọra, onye na-azọ ọchịchị n'okpuru Accord gbaghaa ntuli aka Ụba, onye kwupụtara na Ụba ji akpụrụka asambodo ụlọ akwụkwọ nke ọdịda anyanwụ Afrịka (WASC) na enwetabeghị akara ugo mmụta mahadum ọ sị na ya gụrụ. Akụkọ nke adịgboroja asambodo a malitere na akụkọ nke ndị nta akụkọ nyocha abụọ dere wee bipụta ya na "The News" na Disemba 2006. Ndị ntaakụkọ na-ekwu na Concordia na Mahadum nke California Steeti kwuru na agbanyeghị na Ụba debanyere aha ya, ọ gụchaghị mahadum abụọ ahụ.

Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. http://www.premiumtimesng.com/news/top-news/222309-anambra-senator-andy-uba-dumps-pdp-apc.html
  2. http://www.ivory-ng.com/andy-uba-steps-alleged-second-wife/
  3. Introduction to Drilling Course | HRH Geology. Archived from the original on 2020-11-29. Retrieved on 2020-11-21.
  4. "Close Obasanjo ally loses governor's seat in Nigeria", 2007-06-14. Retrieved on 2011-06-15.
  5. Andy Uba Picks Gubernatorial Ticket From Labor Party, Makes Peace With Chris Uba. Modern Ghana (20 Nov 2009). Retrieved on 2011-06-15.
  6. As Labour Party woos Andy Uba. The Punch (5 Dec 2009). Archived from the original on 2011-10-02. Retrieved on 2011-06-15.
  7. Anambra - Why We Fielded Andy Uba - Labour Party. Daily Trust (9 December 2009). Retrieved on 2011-06-15.
  8. Why I opted for Labour Party, by Andy Uba. The Nation (Nigeria) (2009-12-31). Retrieved on 2011-06-15.

Kpọpụta njehie: <ref> tag with name "AfricanH20110524" defined in <references> is not used in prior text.
Kpọpụta njehie: <ref> tag with name "Leadership20100130" defined in <references> is not used in prior text.

Kpọpụta njehie: <ref> tag with name "RingforC" defined in <references> is not used in prior text.