Isiagu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Isiagu
human settlement, Ama
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaAnambara Steeti, Ndida Awka Dezie
Isi Agụ
Isiagu

Isiagu, nke a bu isi anụmanụ a kpọrọ Agụ. A na-ewe onye gburu Agụ dị ka onye siri ezigbo ike na anaghị atụ egwu. Ọtụtụ oge a na-eyu onye ahụ ogbuagụ dị ka Aha ya. Efe IsiagụUgbu a a na-ebi ya n'ụdịrị akwa pụrụ iche ndị Igbo ji egosipụta ekịke na omenaala ha. Na mbụ, Ọ bụ naanị ụmụ nwoke na-eyi ya tụmadi ndị chiri echichi, Efe Isiagụ na-enye onye ọbula yi ya ebube na ugwu nke a mere ndị Igbo ji atụ ilu sị na ebube agụ na-eche agụ. Ugbu a, n'ihi na efe isiagu a dị ọgọ dikwa ebube, ndi echighi echichi , umunwaanyi, ụmụaka nakwa ndị abụghị ndị igbo na-eyikwa ya. A na-eyikarị uwe Isiagu n'oge emume puru iche dị ka agbamakwụkwọ, iri-ji ohu, igba nkwụ, nakwa emume ndị ọzọ dị iche iche. Ọ na ahiahụ onye yi Uwe Isiagụ bata n'ọgbọ aghara igba ya nkiri. Enwere ụzọ dị iche iche esi akwa Efe isiagụ a , ụfọdụ na adị ogologo ma ọ bụ dị mkpụmkpụ, Ụfọdụ uwe nwere bọtịnụ ọla edo na-ejikọta ya. E nwere ike iji uwe ukwụ wee jie ya maọbụ were akwa ọmụma wee yie ya. Ufodu na-acha uhie uhie, ọbara ọbara, edo edo ma obu ojii ojii, mana ihe kacha ebunye a uwe a ebube bụ isiagụ esere n,ahụ ya. Iji mee ka ekike a zuo oke ana eji okpu na-acha ọbara ọbara wee kpuru n'isi onye yi akwa a. Mgbe ụfọdụ ana eji aka wee chọọ okpu ahụ mma. Ụmụ nwaanyị nwere ike ike ịchafụ maọbụkwa aka wee dozie isi ha. [1][2][3]

Lee kwa[dezie | dezie ebe o si]

Lịnkị ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Ebe nsi nweta[dezie | dezie ebe o si]