Jidenna

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jidenna
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria, Njikota Obodo Amerika Dezie
Aha ọmụmụJidenna Theodore Mobisson Dezie
Aha enyereJidenna, Theodore Dezie
aha ezinụlọ yaMobisson Dezie
aha pseudonymJidenna Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya4 Mee 1985 Dezie
Ebe ọmụmụWisconsin Rapids Dezie
ŃnàOliver Mobisson Dezie
Ọrụ ọ na-arụrapper, onye na-emeputa ihe ndeko, odee egwu, onye na-abụ abụ, recording artist Dezie
ebe agụmakwụkwọStanford University, Milton Academy Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2015 Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
diskografiJidenna discography Dezie
ụdịegwu hip hop, Afrobeat Dezie
akara ndekọEpic Records Dezie
webụsaịtịhttps://www.jidenna.com/ Dezie
Jidenna ebe ọ na-abụ abụ na agba egwú

Jidenna Theodore Mobisson (a mụrụ ya na Mee 4, 1985). Ọ bụ sọọsọ Jidenna ka, eji mara ya.Ọ bụ onye Naịjirịa ma bụrụkwa Amerịkan rapa, na-agụ egwú, Odee egwu, na onye mmepụta ndekọ egwu. Na 2015, Jidenna wepụtara egwu abụọ, "Classic Man " na "Yoga",nke na-akwalite lebeelụ Jane lle Monáe Wondaland nchịkọta ndekọ egwu EP The Eephus ya naEpic Records . E wepụtara abọm mbụ ya, The Chief na Febuarị 17, 2017 nke bụ nọmba 38 na <i id="mwHA">Billboard</i> 200 .

Mmalite ndụ na agụm akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Jidenna Theodore Mobisson na Mee 4, 1985 na Wisconsin Rapids, Wisconsin. [1] [2] Nna ya bụ Tama Mobisson bụ onye na-ahụ maka ego ebe nne ya bụ Oliver Mobisson, bụ onye mmụta Igbo na Naịjirịa . Jidenna tolitere nwantịtị oge na Naịjirịa, ebe nna ya na-aru ọrụ dịka onye nkuzi nke sayensi kọmputa na Enugu State University . [3] Mgbe Jidenna dị afọ isii, ezinụlọ ya laghachiri United Steeti. Na 1995, ezinụlọ kwagara Norwood, Massachusetts, wee mesịa gaa Milton, Massachusetts, na 2000. Nna ya nwụrụ na 2010.

Na ụlọ akwụkwọ sekọndịrị ọ chọpụtara ngalaba otu rapụ nke akpọrọ Black Spadez, ọ were malite imepụta, ịhazi na ide ihe. Jidenna wepụtara abọm mbụ ya nke ya na Black Spadez tiri dịka ọrụ ikpeazụ ha na Milton Academy, ebe Jidenna gụsịrị akwụkwọ na 2003. [4] Na 2008, mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na Bachelor of Arts na Comparative Studies in Race and Ethnicity na Mahadum Stanford, [5] [6] ọ gbasoro ọrụ egwu ya mgbe ọ na-arụ ọrụ dịka onye nkuzi, na-agagharị na obodo ndị a ; Los Angeles, Oakland, Brooklyn na Atlanta, tupu ọ banye na nkwekọrịta ya na onye na-ede ihe ndekọ Janelle Monáe's Wondaland Records. [7]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Jidenna na-egosipụtagna in Seattle

Jidenna binyere aka na Janelle Monáe 's Wondaland Records ma kesaa ya site na Epic Records . Ya na ọtụtụ ndị na-eti egwu na labeelụ ha bụ Roman GianArthur, St Beauty, Deep Cotton na Janelle Monáe etikọla egwu. Ọ malite ịdekọba egwu ise nke mbido egwu mbụ ndị (EP), nke akpọrọ Eephus . Na Febụwarị 2015, Jidenna wepụtara egwu izizi ya, nke akpọrọ " Classic Man " nke gosipụtara GianArthur. Egwú ahụ na-atụgharị ntụgharị dị egwu na United Steeti niile, o were pụta na nọmba 49 na chaatị Billboard Hot R &amp; B / Hip-Hop Airplay .

Na March 31, 2015, Janelle Monáe na Jidenna wepụtara egwu nke abụọ nke sitere na EP - "Yoga". [8] A họpụtara egwu ya bụ "Classic Man" maka Best Rap / Sung Collaboration na 58th Grammy Awards . [9] Na ọnwa Juunu nke otu afọ ahụ, Jidenna na Monáe gosipụtara egwu ha na BET Awards . [4] Jidenna natakwara onyinye maka onye ọhụụ kachasị mma na 2015 Soul Train Music Awards na Nọvemba. [10]

Jidenna bụ onye guzobere ọgbakọ mmekọrịta "Fear & Fancy", nke bidoro na California n'afọ 2006. [3] Otu a bụ mkpokọta mba nke ndị ọchụnta ego, ndị na-eme ihe nkiri, ndị nkuzi, ndị ọkà mmụta sayensị, na ndị nka na-akwado nnọkọ maka egwu, oriri nke nri abalị, na ihe ngosipụta na-echeta enyemaka ndị mmadụ na klọbụ obi ụtọ nke New Orleans.

[11]

Na Juunu 2016, ọ wepụtara egwu a "Chief Don't Run".[12] na February 17, 2017, Jidenna weputara The Chief, egwu studiyo abọm ya izizi.[13] Azụ abọm ya nye gara nnukwu nsọpụrụ n'ebe Boz Scaggs' Middle Man abọm nọ. E wepụtara egwu nke na-ebu ụzọ bụ "Sufi Woman" and "Tribe" na Julaị 26, 2019 ọ ga-apụtakwa na studiyo abọm ya nke abụọ bụ

85 to Africa.

Na 2019 Jidenna wepụtara egwu nke abụọ ya bụ "85 na Africa". [14]

Ụdịrị ya[dezie | dezie ebe o si]

Jidenna kwuru na isi ọrụ metụtara n' ụdịrị egwu ọ na-eti gụnyere KRS-One na Big Daddy Kane, [15] ya na ụdị egwu Naịjiria Highlife . [16]

Kemgbe ọtụtụ afọ, onye otii egwu a, zulitere otu o si ebi ndụ ya na koleeji, ebe ahụ ka ọ nọrọ mụọ maka ihe gbasara ejije n'aka ọkammụta akparamàgwà mmadụ aha ya bụ Philip Zimbardo ..N'aka nke ọzọ, ọ gaghị anabata ụdịrị ejije dandy tupu o ruo mgbe nna ya nwụrụ na 2010. [4] Jidenna kọwara "ọdịdị m bu Harlem Renaissance kpalitere m nke ukwu na obele ihe ọdịnala nke ọdịda anyanwụ West Afrịka ," ya na "obi ụtọ alụm di na nwunye nke ndị Europe na ndị Afrịka na-enye." [17] Jidenna bi ugbu a na East Flatbush, Brooklyn. [18]

Mpụta dị na mgbasa ozi ama ama[dezie | dezie ebe o si]

Na Septemba 2016, e gosipụtara Jidenna na otu ihe ọmụme nwere nkeji na Netflix nke aha ya bụ <i id="mwow">Luke Cage</i> . Na oge mbu nkeji ise bu "Just to get a Rep", meghere ebe Jidenna na-egosipụta egwu ya bụ "Long Live the Chief" n'ebe e mere dịka obi Eze Harlem. O gosiputara egwu ya bụ" Long Live the Chief" na "Little Bit More" na ndị otu egwu zuru ezu na The Daily Show na Trevor Noah na Ọktoba 2016. [19] Jidenna pụtakwara na ihe ọmụme nkeji na Insecure ndị gụnyere "Thirsty as Fuck," na "Shady as Fuck," nke emere na Nọvemba 2016. [20]

E mere ọbele " Classic Man" na Academy Award mmeri 2016 fiim <i id="mwsQ">Moonlight</i> .

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

  • Wondaland Presents: Eephus (2015)
  • The Chief (2017)
  • Boomerang - EP (2017) [21] [22]
  • 85 to Africa (2019)

Awards and nominations[dezie | dezie ebe o si]

Onyinye Grammy[dezie | dezie ebe o si]

   

Afọ Nhọpụta / ọrụ Awọdụ Rịzọọtụ

2016 "Classic Man" (gosipụtara Roman GianArthur) ọkacha na rapụ/egwu ntikọta họpụtara

Afọ Nhọpụta/ ọrụ Awọdụ Rịzọọtụ


Rap/Sun


Rap/sung


Egwu ụtọ Mkpụrụ Obi[dezie | dezie ebe o si]

 


 

 

Afọ nhọpụta ọrụ Awọdụ rịzọọtụ

2015 Onweya okacha egwu mmeri

"Classic Man" (gosipụtara Roman GianArthur) egwu afọ a mmeri

Vidiyo afọ a mmeri

"Yoga" (ya na Janelle Monáe) ọkacha agba egwu mmeri

họpụtaminọrụ wwọdụAwịzọọtụesult

ult20


Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. A Star Is Found: Jidenna Mobisson: A "Classic Man". Flavorpill Media (March 20, 2015). Archived from the original on March 23, 2016. Retrieved on April 21, 2015.
  2. Amaya Mendizabal, "Tomorrow's Hits: Jidenna, Ashley Clark & Jasmine Thompson", Billboard, May 15, 2015: "Born in Wisconsin, and raised for a period in Nigeria, the nomadic singer has since resided in several stateside cities and is currently based in Brooklyn."
  3. 3.0 3.1 Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  4. 4.0 4.1 4.2 Murray, Nick. "'Classic Man' Singer Jidenna on How His Father's Death Inspired His Dandy Style: 'It Was My Way of Grieving'" 16 Jan 2016. Billboard Vol 128.1
  5. "Happy Birthday Jidenna", People Magazine. Retrieved on February 28, 2020.
  6. 20th Anniversary: Fall 2016. Stanford University Center for Comparative Studies in Race & Ethnicity. Archived from the original on February 28, 2020. Retrieved on February 28, 2020.
  7. "Janelle Monáe's Artist Jidenna Releases New Music Video 'Classic Man'", Necole Bithcie. Retrieved on March 12, 2015.
  8. Blistein, Jon (March 31, 2015). Janelle Monae Flows Through New Song 'Yoga'. Rolling Stone. Retrieved on April 1, 2015.
  9. Grammy Nominations 2016: See the Full List of Nominees. Billboard (December 7, 2015). Retrieved on December 7, 2015.
  10. Mitchell, Gail (29 November 2015). The Weeknd, 'Uptown Funk' and Jidenna Big Winners at 2015 Soul Train Awards. Billboard. Retrieved on 2016-08-24.
  11. "The Door That Opens You: Why Whippa Wiley Brings You Magic, Fear and Fancy", November 10, 2014.
  12. Spanos, Brittany (28 June 2016). Hear Jidenna's Confident New Song 'Chief Don't Run'.
  13. Feig, Zakk (3 February 2017). Jidenna Announces Release Date For Debut Album "The Chief".
  14. http://freemusicempire.com/2019/11/13/my-favorite-album-of-2019
  15. DJ Vlad. Jidenna Details His Choice to Wear Tailored Suits as a Rapper. VladTV. Retrieved on 6 November 2015.
  16. Weiner. Jidenna Talks Classic Men and How He's Influenced by Nigerian Music. Retrieved on 2016-08-24.
  17. Fashion Bomber of the Day: Jidenna from Brooklyn (en-US). The Fashion Bomb LLC (2015-04-17).
  18. Coleman, C. Vernon. "Watch Jidenna and Roman GianArthur's 'Classic Man' Video", XXL Mag, February 21, 2015.
  19. Marvel's Luke Cage Music - S1E5: "Just To Get A Rep" - TuneFind.
  20. Ray-Harris, Ashley. Issa loses momentum in a stagnant Insecure.
  21. Review: Jidenna Snaps Back To Form With "Boomerang" EP (2017-11-13). Retrieved on 2019-09-03.
  22. Jidenna drops surprise EP, Boomerang: Stream/download (2017-11-10). Retrieved on 2019-09-03.