Nenadi Usman

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nenadi Esther Usman
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha ezinụlọ yaUsman Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya12 Novemba 1966 Dezie
Dị/nwunyeSa’ad Usman Dezie
Asụsụ obodoGworog Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye ọrụ ụlọ akụ Dezie
Ọkwá o jionye otu ulo nnochite anya Naijiria, commissioner, Minister of Finance of Nigeria, onye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Jos Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

</ref>

Ọrụ mmalite[dezie | dezie ebe o si]

Usman bidoro agụmakwụkwọ ya na Jos, mechaa gafe na Kagoro, o mechara gaa kọleji gọọmentị etiti, Jos, Plateau steeti . O mechara nweta akara ugo mmụta mbụ ya na Geography na Mahadum Ahmadu Bello, Zaria ma mesịa nweta akara ugo mmụta di elu na Mahadum Jos . Ọ bụrụ onye isi nchịkwa nke Dana Ventures ma mechaa bụrụkwa onye ndụmọdụ na steeti Kaduna n'afọ 1992. Ọ bụkwara onye ndụmọdụ n'afọ 1993 ma onye isi n'ahụ maka ndị ọrụ FCDA site n'afọ 1994 ruo 1998. 

Usman arụọla ọrụ dị ukwuu na inye ụmụ nwanyị ikike ya na mbọ dị oke mkpa ọ gbara ịbido otu Nke n'abụghi Gọọmenti nwe akpọrọ "Education and Empowerment for women" nke nwere isi ụlọ ọrụ ya dị na Jere dị na Kaduna Steeti ma tinyerekwara na ọ bụ onye isi oche ugbua nke nchịkọta otu ndị na-abụghị nke Gọọmenti nwe maka nkwalite Umunwanyị na Steeti Kaduna. Ọ lụrụ di ma nweekwa ụmụ anọ. 

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ọ rụọla ọrụ dị ka onye otu nzukọ nke dị na Steeti Kaduna nke National Republican Convention (NRC) kwachigoro ka ọdi ugbua. Ọ bụkwara otu onye ahọpụtara nke Ụlọ Nzukọ ndị Nnọchiteanya, na-anọchite mpaghara ọchịchị etiti nke Kachia / Kagarko n'okpuru United Nigeria Congress Party n'afọ 1998. A họpụtara ya dịka kọmishọna na Kaduna Steeti site n'afọ 1999 rue 2002, mgbe ọ bụrụ Kọmishọna n'ahụ maka Gburugburu Ebe Obibi na Akụ ndị esi n'ala enweta na steeti ahụ n'afọ 2002 ma mechaa bụrụ kọmishọna na-ahụ maka ahụike site n'afọ 2002 ruo 2003. 

Ọ bụrụ onye nhazi ndị otu mgbasa ozi ndọrọndọrọ ọchịchị Alh. Ahmed Makarfi n'afọ 1999 A họpụtagachiri ya onye isi oche kọmitii mgbasa ozi n'afọ 2003. Ọ bụ onye na -ahazi Kọmitii Mgbasa Ozi na ọchịchị steeti Kaduna makaOlusegun Obasanjo. 

A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye minista nke obere na -ahụ maka ego ma mechaa bụrụzie Mịnịsta na -ahụ maka ego n'ọchịchị Obasanjo. [1]

A hoputara ya dịka onye Sịnetọ maka Kaduna South na nhoputa nke emere n'ọnwa Eprel afọ 2011, nke ọ dọrọ na-okpuru otu People's Democratic Party (PDP). Otu Action Congress of Nigeria (ACN) rụrụ ụka maka nsonaazụ ntụli aka a. [2] Dị ka onye Sịnetọ, ọ kpaliri gọọmentị inyekwu ụmụ nwanyị na ụmụaka ohere, ndị ọ na-akpọ ndị kachasị na enweghị mkpuchi ma di mfe ịma n'ọnya na Obodo. [3]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Nenadi lụrụ Dr. Sa'ad Usman, Emir nke Jere na steeti Kaduna Onye nwụrụ n'afọ 2020. [4]

Ebe ndi nsi dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Dino Mahtani (September 7, 2006). Election throws a shadow over Nigeria's newfound fiscal probity. Financial Times.
  2. Ibraheem Musa (14 April 2011). ...As Kaduna ACN rejects election results. Daily Trust. Archived from the original on 2011-08-14. Retrieved on 2011-04-21.
  3. Akor. "Nigeria: Nenadi Usman Tasks Government On Women", AllAfrica, 3 November 2011. Retrieved on 9 January 2013.
  4. Former Finance Minister Nenadi Usman loses husband (en-US). Latest Nigeria News, Nigerian Newspapers, Politics (2020-04-01). Retrieved on 2021-05-22.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]