Sandra Ezekwesili

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sandra Ezekwesili
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereSandra Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Septemba 1989 Dezie
Ebe ọmụmụUgwu Ọcha Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ, onye mgbasa-ozi Dezie
onye were ọrụCool FM, Cool FM Nigeria, Nigeria Info 92.3FM Dezie
ebe agụmakwụkwọEnugu State University of Science and Technology, Mahadum nke ọdụ ụgbọ mmiri-harcourt, Holy Rosary College Dezie
ogo mmụtaBachelor of Arts Dezie
isi agụmakwụkwọoru nta akuko Dezie
Ebe obibiUgwu Ọcha Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2009 Dezie
agbụrụNdị Igbo Dezie

Sandra Sopụlụchukwu Ezekwesili bụ Nigerian Broadcast Journalist, nakwa Media Personality.Ugbu a ọ bụ ya na-ahụ maka ihe nke a kpọrọ drive time ebe ọ na anọ agụpụta akụkọ nakwa ihe nriba ama megasịrị na Nigeria . Nke ọzọ bụkwa 'Hard Facts' n'ụlọ ọrụ Nigeria Info 99.3FM dị na Lagos, Nigeria.

Sandra Ezekwesili

Mmalite Ndụ na Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Sandra na Port Harcourt. Sandra bụ otu n'ime ụmụ atọ nne ya bụ Oriakụ Ngozi Ezekwesịlị mụrụ ma bụrụkwa otu nwa nwaanyị. Nna ya bụ Eze Stanley anwụọla.

Sandra Ezekwesili

Ọ sitere na Nara-Unateze, Nkanu-East Local Government Area, nke di na Nigeria, Sandra biri mbido afọ asaa ya n'Enugwu ebe ọ nọrọ gụọ praimari na sekọndiri n'ụlọ akwụkwọ NAOWA dị na Enugwu Steeti. E mechara ya na Ezinaụlọ ya kwagara Port Harcourt, ebe nna ya nọ n'afọ 1997'.

Mgbe ọ nọ na Klasị nke atọ na primary school, Ọ bụ onye nkuzi ya lagoro ezumike ọrụ n'ihe gbasara ichụ nta akụkọ na- ịgụpụta akụkọ aha ya bụ Maazị Promise bụ onye izizi bidoro kuzibere ya ihe gbasara mgbasa ozi na ichụ nta akụkọ. N'ihi mmasi o nwere ebe ọ nọ, o bidiro ikuziri yadiction nakwa ọnọdụ ịgụpụta akụkọ nakwa otu esi ede ederede akwụkwọ akụkọ. [1]

N'agbanyeghị ọzuzụ niile a ,Sandra chọrọ ịbụ lawyer,n'ihi na ọ nwere ike bụrụ ihe ezinaụlọ ya chọrọ mana ọ gụrụ Mass Communication mgbe ọ na enwetaghị oghere ịgụ ọka ikpe na Mahadum ọ chọrọ. O mechara nwee mmasi n'ihe gbasara igụ maka achụm nta akụkọ.

Oge ọ nọ na Mahadụm ,ndị nkuzi gbara abụba ọrụ,bụ nke notewere aka ọ chọpụtara na nwere oge na oghere, ọ wee gaa mee intern n'ụlọ ọrụ Enugwu State Broadcasting Service(ESBS) , Ọ bụ n'ụlọ ọrụ a ka anọ mata ya nke bụ na emere ya onye nchịkọ nakwa ọnye na-agụpụta ihe akụkọ. Ọ rụrụ nke ọma nke bụ na mgbe ndị nkuzi kwusịrị abụbọ ọrụ, onye isi ụlọ ọrụ ahụ gbara ya ka ọ laghachite azụ ma ọ gụchaa nweta digiri ya. [2]

Ka ọ gụchara ma nweta digiri ya n'ihe gbasara ịchụ nta na mgbasa akụkọ site n' Enugu State University of Science and Technology ọ gara rụọ n'onyonyo nke di na Katsina State na Northern Nigeria, tupu ọ laghachi na South bia rụọ Redio nke ndị Bayelsa nakwa ụlọ ọrụ Ray PowerFM di na Yenogoa.

Ndị Cool FM di na Port Harcourt were ya ọrụ ọzigbo n'afọ 2013 ka ha gechara nyocha iwe ọrụ o ji ekwentị ya wee kwupụta. Ha kpọrọ ya ọrụ ozigbo ahụ [3]

Ozigbo o bidoro ọrụ a, ọ bụrụ onye ama ama, o bidikwara nwetaba ihe onyinye n' afọ nke mbụ ọ rụrụ na CoolFM. A họpụtara ya maka ọnyinye di iche iche di ka ' Female On-Air Personality of the Year nke ndị otu Ohanaeze Ndị Igbo nyere ya n'ọnwa Ọgọst n'afọ 2014. Ndị 'Stefano Piotti Foundation nyekwara ya ihe onyinye ọzọ n'afọ 2015. [4] [5]

Ụlọ ọrụ 'Nigeria Info'[dezie | dezie ebe o si]

Sandra si n'ụlọ CoolFM di na Port Harcourt pụọ wee ga n'ụlọ ọrụ ọzọ a kọrọ Nigeria Info 99.3FM n'ọnwa Ọgọst n'afọ 2018 mgbe ụlọ ọrụ a bidochara ọhụụ. N'ụlọ ọrụ a Sandra bụ onye nchịkọta ihe a kpọrọ 'Hard Facts' ana-ekwuputa nke a bido n;elekere atọ nke mgbede wee ruo elekere asaa nke abalị. Program a so bụ nke ise n'ime otu si agụpụta ndi kacha mee nke ọma.

Ihe ndi ozo[dezie | dezie ebe o si]

Sandra bụ otu onye ihazi ihe mmeme doro anya. Ọ haziela ọtụtụ ihe mmeme ma nke ọbere na nke nnukwu na Port Harcourt, ụfọdụ gụnyere 'Praise Jam mmeme egwu uka mgbe Kirismas a na-eme kwa afọ na Port Harcourt. Ọ bụkwa okwuru ọha , nke a pụtara ihe na 'TedxYouth talk n'afọ 2014. [6]

Site na mwakpo otu onye n'ime ihe mmeme 'Big Brother Nigeria wakporo otu n'ime mgbe ha na-ehi ụra , Sandra aghọlaa onye nkwado n'ihe gbasara nwoke na nwaanyi inwe nkwekọrịta tupu ha enwee mmekọrịta. [7]

Ebe nsinweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. Archive copy. Archived from the original on 2019-06-15. Retrieved on 2020-05-04.
  2. You know their voices…but how well do you know these OAPs (Sandra Ezekwesili)? (26 February 2016). Archived from the original on 11 September 2017. Retrieved on 11 September 2017.
  3. Wikina, Ebenezar (3 December 2014). TEDxYouth@OrdinanceRoad: How We Put West Africa on the Map. Retrieved on 11 September 2017.
  4. https://www.linkedin.com/in/sandra-ezekwesili-0b17567a/
  5. Steph Foundation - Team. Archived from the original on 18 February 2022. Retrieved on 11 September 2017.
  6. TEDx Talks (14 April 2015). It Starts With You - Sandra Ezekwesili - TEDxYouth@OrdinanceRoad. Retrieved on 11 September 2017.
  7. 'Big Brother' has Nigerians talking about sexual consent. CNN. Retrieved on 11 September 2017.