Yvonne Orji

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Yvonne Orji
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha ọmụmụYvonne Anuli Orji Dezie
Aha enyereYvonne Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya2 Disemba 1983 Dezie
Ebe ọmụmụUgwu Ọcha Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee, onye mkpaochi Dezie
ebe agụmakwụkwọGeorge Washington University, Linden Hall Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2011 Dezie
Ọrụ ama amaInsecure, Velma Dezie
Ihe nriteOkayAfrica 100 Women Dezie

Yvonne Anuli Orji (amụrụ na 2 Disemba 1983) bụ onye Naijiria nke Amerika na ome ọrụ ntọchi. A maara ya nke ọma maka ọrụ ya na ihe nkiri telivishọn bụ Insecure (egosiri na-afọ 2016 ruo ugbu a), bụ nke a họpụtara ya maka oniynye nsọpụrụ nke Primetime Emmy Award na NAACP Image Awards nke atọ.

Mmalite ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Orji na 2 Disemba 1983, na Port Harcourt, Rivers Steetị, Naijiria, ma ọ tolitere na Laurel, Maryland na mba United States.[1] Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndrị na obere obodo Lititz, Pennsylvania ebe ọ gara Linden Hall (ụlọ akwụkwọ). O nwetara BA na mmuta a na-akpọ Liberal Arts na Mahadum George Washington wee gaa n'ihu na-enweta nzere mastas na mmuta Public Health na Mahadum George Washington. Ndị mụrụ Orji tụrụ anya na ọ ga-abụ dọkịta, ọkàiwu, ọkà mmụta ọgwụ, ma ọ bụ injinia. Agbanyeghị, a kpaliri mmụọ nsọ ya ime ihe ntọchị mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ.

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, na 2009, Orji kwagara New York City ịchụso ọrụ na ntọchị.[2] Na 2015, ọ rutere ọrụ dịka Molly na ihe nkiri Insecure n'enweghị onye ọrụ ma ọ bụ ahụmịhe ọ bụla.[3]

Ndụ ya niime[dezie | dezie ebe o si]

Orji bụ Onye Kraịst ji okpukpe kpọrọ ihe ma kwuo na ya ga-anọgide n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ruo mgbe ọ lụrụ di.[4]

Ọ bịara mmemme nke TEDxWilmingtonSalon na 2017, nke akpọrọ "The wait is sexy" na YouTube. N’okwu a, ọ kọwara ihe ndị mere o ji wezuga mmekọahụ ya na nwoke tupu ya alụọ di.[5]

Ọrụ ebere[dezie | dezie ebe o si]

N'èzí ọrụ okike ya, ọ na-eme nyemaka ọrụ ebere. Na 2008 na 2009 ọ nọrọ ọnwa isii na-arụ ọrụ na esemokwu Liberia, yana Population Services International (PSI), NGO nke na-eji azụmaahịa mmekọrịta mmadụ na ibe ya eme ihe iji kwado omume ọma. Mgbe ọ nọ na Liberia, ya na otu ndị ntorobịa nwere ọgụgụ isi rụkọrọ ọrụ iji nyere aka wulite ọtụtụ mmemme maka ịnye ndụmọdụ yana nkwukọrita nke ikuziere ma gbochie mgbasa nke afọ ime ụmụ agbọghọ na ọria bụ HIV/AIDS. Ọ na - etinye oge ya na olu ya ugbu a dịka onye nnọchi anya R(ED), onye mmuta na-agụmakwụkwọ maka Jumpstart ma soro JetBlue na - arụ ọrụ.[6]

Ndetu Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Aha Dịka Ihe edeturu
2011 Love That Girl! Njideka Episode: "Head Shrunk"
2013 Sex (Therapy) with the Jones Moshinda Short film
2016–present Insecure Molly Carter 34 episodes
2017 Jane the Virgin Stacy 2 episodes
2017 Flip the Script Ad Exec 1 Episode: "Mad Woman"
2018 Night School Maya
2019 A Black Lady Sketch Show Flight attendant Episode: "Why Are Her Pies Wet, Lord?"
2020 Momma, I Made It![7] Herself HBO comedy special
2020 Spontaneous Agent Carla Rosetti
TBA Vacation Friends Post-production

Onyinye na nhopụta[dezie | dezie ebe o si]

Onyinye Katịgọrị Ọrụ Nsonaazụ
2020 Primetime Emmy Awards Outstanding Supporting Actress in a Comedy Series Insecure Nhọpụta

Ọgụgụ ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Wilson, H. W. (November 2018). "Yvonne Orji". Current Biography. 79 (11): 51–55. ISBN 9781682176412. OCLC 1005191045.

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. "YVONNE ORJI".
  2. "Molly From 'Insecure' Is Your New Favorite Single Lady", 2016-10-10.
  3. "Yvonne Orji landed her role on HBO's 'Insecure' with no agent, no manager and zero acting experience", 17 November 2018.
  4. Davis, Allison P.. "Molly From 'Insecure' Is Your New Favorite Single Lady", 2016-10-10.
  5. The wait is sexy. TEDx Talks.
  6. UTA, Talent Agency. Yvonne Orji, UTA Bio Page. Archived from the original on 2019-08-12. Retrieved on 2020-11-24.
  7. Ani, Ivie (6 June 2020). How Yvonne Orji Made It. Paper. Retrieved on 6 July 2020.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]