Jump to content

Ịñụbiga mmanya oke

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Alcoholism
Other namesAlcohol dependence syndrome, alcohol use disorder (AUD)[1]
"King Alcohol and His Prime Minister" Templeeti:Circa
SymptomsDrinking large amounts of alcohol over a long period, difficulty cutting down, acquiring and drinking alcohol taking up a lot of time, usage resulting in problems, withdrawal occurring when stopping[2]
ComplicationsMental illness, delirium, Wernicke–Korsakoff syndrome, irregular heartbeat, cirrhosis of the liver, cancer, fetal alcohol spectrum disorder, suicide[3][4][5][6]
DurationLong term[2]
CausesEnvironmental and genetic factors[4]
Risk factorsStress, anxiety, inexpensive, easy access[4][7]
Diagnostic methodQuestionnaires, blood tests[4]
TreatmentAlcohol detoxification typically with benzodiazepines, counselling, acamprosate, disulfiram, naltrexone[8][9][10]
Frequency208 million / 4.1% adults (2010)[11][12]
Deaths3.3 million / 5.9%[13]

Ịṅụbiga mmanya ókè, nke a makwaara dị ka Aṅụrụma na Nsogbu Imeto Mmanya na-aba n'anya (AUD), [1] bụ, ịṅụ mmanya na-egbu egbu maọbụ mmanya na -aba n'anya ọ bụla nke na-akpata nsogbu isi mgbaka ma ọ bụ nke ahụike. [14][2][4] E kewa bụrụ nsogbu ịṅụbiga mmanya ókè ahụ n'ụdị abụọ: ịmetommanya na - egbu egbu na Ị dabere na mmanya na -aba na- anya [3][15] N'ihe gbasara ahụike, a na-ekwu na ịṅụbiga mmanya ókè bụ mgbe mmadụ mere ihe abụọ ma ọbụ karịa n'ime ọnọdụ ndị a : mmadụ na-aṅụ mmanya na-aba n'anya buru ibu ogologo oge, na ọ kweghị ya akwusizi ọ na-esiri ya ike , iji ya eme ihe na-eme ka ọ ghara ịrụzu ọrụ, iji ya na-eme nsogbu mmekọrịta mmadụ na ibe ya, iji ya mee ihe na-akpata nsogbu, ịhapụ ya na ọnọdụ ahụike, ịkwụsị ya na-ewere ọnọdụ dị ize ndụ.[3] ịṅụbiga mmanya ókè na emetụta akụkụ ahụ niile , mana ọ na-emetụta karị ụbụrụ, obi, imeju, pancreas na usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ. [4][5] Ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịkpata ọrịa uche, delirium tremens, Wernicke-Korsakoff syndrome, ịkụ obi na-adịghị mma, mmeghachi omume na-adịghị ike, cirrhosis imeju na ohere cancer. [4][6][16] Ịṅụ mmanya mgbe nwanyị dị 'ime nwere ike ịkpata nsogbu nwammanya na-aba n'anya. [3] Ụmụ nwanyị na-enwekarị mmetụta na-emerụ ahụ nke mmanya na-aba n'anya karịa ụmụ nwoke, makana n'ihi na ahụ ha adịghị arọ ka nke umu nwoke ikike dị ala nke ịmịkọrọ mmanya, na oke abụba dị elu.[11]

Gburugburu ebe obibi na mkpụrụ ndụ bụ ihe abụọ metụtara ịṅụbiga mmanya ókè, na ihe dị ka ọkara ihe ize ndụ a na-ekwu na ọ bụ nke ọ bụla.[4] Onye nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ nwanne ya nwoke na-aṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịghọ onye aṅụrụma okpukpu atọ karịa onye enweghị onye anurima [1] Ihe ndị metụtara gburugburu ebe obibi gụnyere mmetụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ọdịbendị na omume.[17] Ọnọdụ nrụgide dị elu na nchegbu, yana ọnụ ala mmanya na-aba n'anya na ịdị mfe ịnweta, na-eme ka ihe ize ndụ ahụ dịkwuo elu. [1] [7] Ndị mmadụ nwere ike ịga n'ihu na-aṅụ mmanya iji gbochie ma ọ bụ melite mgbaàmà nke ịkwụsị.[1] Mgbe mmadụ kwụsịrị ịṅụ mmanya na-aba n'anya, ha nwere ike ịnwe ọkwa dị ala nke mmanya ruo ọtụtụ ọnwa.[1] N'ihe gbasara ọgwụ, a na-ewere ịṅụbiga mmanya ókè dị ka ọrịa anụ ahụ na nke uche. [18][19] Ajụjụ na Nnyocha ọbara ụfọdụ nwere ike ịchọpụta ịṅụbiga mmanya ókè.[1][20] A na-anakọta ozi ndị ọzọ iji kwado nchọpụta ahụ.[1] Ntuziaka anaghị agụnye ihe karịrị ihe ọṅụṅụ 2 kwa izu.[21]

A ga - akwụsị ịṅụbiga mmanya ókè site na ịchịkwa na igbochi ire mmanya na-aba n'anya, ịtụ ụtụ isi mmanya na-egbu egbu iji mee ka ọnụahịa ya dị elu, na inye ọgwụgwọ adịghị ọnụ ala.[22] Ọgwụgwọ nke ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịnwe ụdị dị iche iche.[9] N'ihi nsogbu ahụike nke nwere ike ime n'oge ịpụ n'anya, a ga-eji nlezianya chịkwaa ọgwụ ọjọọ mmanya.[2] Otu usoro a na-e iji ọgwụ ya bụ benzodiazepine, dị ka diazepam.[2] Enwere ike inye ndị a mgbe a nabatara ha n'ụlọ ọrụ nlekọta ahụike ma ọ bụ mgbe ụfọdụ mgbe mmadụ nọgidere na obodo na nlekọta chiri anya.[2] Ọrịa uche ma ọ bụ ihe ndị ọzọ riri ahụ nwere ike ime ka ọgwụgwọ a ka osie ike.[23] Mgbe ewepụchara nsị, a na-eji ọgwụgwọ otu ma ọ bụ ìgwè nkwado enyere aka igbochi mmadụ ịlaghachi ịṅụbiga mmanya oke. [8][24] Otu n'ime ndị otu na akwado nke a bụ ụdị nkwado a bụ Alcoholics Anonymous . [25] A pụkwara iji ọgwụ acamprosate, disulfiram ma ọ bụ naltrexone mee ihe iji gbochie ịṅụ mmanya ọzọ.[10]

Òtù Ahụ Ike Ụwa Kwuru na afọ 2010, na e nwere nde mmadụ 208 na-aṅụbiga mmanya ókè n'ụwa niile (4.1% nke ndị mmadụ karịrị afọ iri na ise). [11][12]  Na afọ 2015 na United States, ihe dị ka nde 17 (7%) nke ndị okenye na nde 0.7 (2.8%) nke ndị dị afọ iri na abụọ ruo iri na asaa na-emetụta.[13]   Ịṅụbiga mmanya ókè bụ ihe a na-ahụkarị n'etiti ụmụ nwoke na ndị na-eto eto, ọ naghịkwa ahụkebe ya n'etiti ndị agadi.[4] Anaghị ahukari ya na mba Afrịka (1.1% nke ndị bi na ya) e nwere ọnụ ọgụgụ kachasị elu n'Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe (11%). [4] Ịṅụbiga mmanya ókè kpatara ọnwụ 139,000 na afọ 2013, site na ọnwụ 112,000 na 1990. [26] A na-eche na nde mmadụ 3.3 nwụrụ (5.9% nke ọnwụ niile) bụ n'ihi mmanya na-aba n'anya maọbụ ịṅụbiga mmanya ókè.3]  Ịṅụbiga mmanya ókè na-eji ihe dịka afọ iri ebelata ndụ mmadụ .[27] A na-eji ọtụtụ okwu, ụfọdụ bụ okwu mkparị wee na akọwa maọbụ na akpọ. ndị na anubiga mmanya ókè; okwu ndị ahụ gụnyere ọnyà na-ahapụ mmanya, onye na-egbu egbu, anurima,onye na'anya na onye na-adịghị ahụkebe.[28] N'afọ 1979, Òtù Ahụ Ike Ụwa kwụsịrị ịkpọ ndị anurima ndị na "aṅubiga mmanya ókè" maka na okwu ahụ ezie ezi kama ha ahọrọ "ọrịa na-adabere na mmanya". [29]

Ihe odide

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 Alcoholism MeSH Descriptor Data 2020. Retrieved on 9 May 2020.
  2. 2.0 2.1 2.2 Alcohol Use Disorder: A Comparison Between DSM–IV and DSM–5 (November 2013). Archived from the original on 18 May 2015. Retrieved on 9 May 2015.
  3. 3.0 3.1 Fetal Alcohol Exposure (14 September 2011). Archived from the original on 4 April 2015. Retrieved on 9 May 2015.
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 4.4 4.5 4.6 (2013) Diagnostic and statistical manual of mental disorders : DSM-5, 5, Washington, DC: American Psychiatric Association, 490–97. ISBN 978-0-89042-554-1. 
  5. 5.0 5.1 Alcohol's Effects on the Body (14 September 2011). Archived from the original on 3 June 2015. Retrieved on 9 May 2015.
  6. (April 2017) "A meta-analysis of acute use of alcohol and the risk of suicide attempt.". Psychological Medicine 47 (5): 949–957. DOI:10.1017/S0033291716002841. PMID 27928972. 
  7. 7.0 7.1 (2012) "Stress, epigenetics, and alcoholism". Alcohol Research : Current Reviews 34 (4): 495–505. PMID 23584115. 
  8. 8.0 8.1 (May 2006) "Analytic complexities associated with group therapy in substance abuse treatment research: problems, recommendations, and future directions". Exp Clin Psychopharmacol 14 (2): 265–73. DOI:10.1037/1064-1297.14.2.265. PMID 16756430. 
  9. 9.0 9.1 Blondell, RD (February 2005). "Ambulatory detoxification of patients with alcohol dependence". Am Fam Physician 71 (3): 495–502. PMID 15712624. 
  10. 10.0 10.1 (December 2014) "Treatment of alcohol dependence: recent progress and reduction of consumption". Minerva Medica 105 (6): 447–66. PMID 25392958. 
  11. 11.0 11.1 11.2 (2014) Global status report on alcohol and health 2014. World Health Organization, 8, 51. ISBN 978-92-4-069276-3. 
  12. 12.0 12.1 Global Population Estimates by Age, 1950–2050 (30 January 2014). Archived from the original on 10 May 2015. Retrieved on 10 May 2015.
  13. 13.0 13.1 Alcohol Facts and Statistics. Archived from the original on 18 May 2015. Retrieved on 9 May 2015.
  14. Littrell (2014). Understanding and Treating Alcoholism Volume I: An Empirically Based Clinician's Handbook for the Treatment of Alcoholism: Volume Ii: Biological, Psychological, and Social Aspects of Alcohol Consumption and Abuse. Hoboken: Taylor and Francis. ISBN 978-1-317-78314-5. “The World Health Organization defines alcoholism as any drinking which results in problems” 
  15. Hasin (December 2003). "Classification of Alcohol Use Disorders". Alcohol Research & Health : The Journal of the National Institute on Alcohol Abuse and Alcoholism 27 (1): 5–17. PMID 15301396. Retrieved on 28 February 2015. 
  16. Romeo (October 2007). "Moderate alcohol consumption and the immune system: a review". The British Journal of Nutrition 98 Suppl 1: S111–115. DOI:10.1017/S0007114507838049. ISSN 0007-1145. PMID 17922947. 
  17. Agarwal-Kozlowski (April 2000). "[Genetic predisposition for alcoholism]". Ther Umsch 57 (4): 179–84. DOI:10.1024/0040-5930.57.4.179. PMID 10804873. 
  18. Mersy (1 April 2003). "Recognition of alcohol and substance abuse". American Family Physician 67 (7): 1529–32. PMID 12722853. 
  19. Health and Ethics Policies of the AMA House of Delegates (June 2008). Archived from the original on 20 March 2015. Retrieved on 10 May 2015. “H-30.997 Dual Disease Classification of Alcoholism: The AMA reaffirms its policy endorsing the dual classification of alcoholism under both the psychiatric and medical sections of the International Classification of Diseases. (Res. 22, I-79; Reaffirmed: CLRPD Rep. B, I-89; Reaffirmed: CLRPD Rep. B, I-90; Reaffirmed by CSA Rep. 14, A-97; Reaffirmed: CSAPH Rep. 3, A-07)”
  20. Higgins-Biddle (2018). "A Review of the Alcohol Use Disorders Identification Test (AUDIT), AUDIT-C, and USAUDIT for Screening in the United States: Past Issues and Future Directions". The American Journal of Drug and Alcohol Abuse 44 (6): 578–586. DOI:10.1080/00952990.2018.1456545. ISSN 0095-2990. PMID 29723083. 
  21. New guidance on alcohol and health from the Canadian Centre on Substance Use and Addiction | This Changed My Practice (TCMP) by UBC CPD. thischangedmypractice.com. Archived from the original on 27 March 2024. Retrieved on 24 March 2024.
  22. World Health Organization (January 2015). Alcohol. Archived from the original on 23 May 2015. Retrieved on 10 May 2015.
  23. DeVido (December 2012). "Treatment of the depressed alcoholic patient". Current Psychiatry Reports 14 (6): 610–08. DOI:10.1007/s11920-012-0314-7. PMID 22907336. 
  24. Albanese (November 2012). "Management of alcohol abuse". Clinics in Liver Disease 16 (4): 737–62. DOI:10.1016/j.cld.2012.08.006. PMID 23101980. 
  25. Tusa (2013). "Came to believe: spirituality as a mechanism of change in alcoholics anonymous: a review of the literature from 1992 to 2012". Journal of Addictions Nursing 24 (4): 237–46. DOI:10.1097/jan.0000000000000003. PMID 24335771. 
  26. GBD 2013 Mortality and Causes of Death (17 December 2014). "Global, regional, and national age-sex specific all-cause and cause-specific mortality for 240 causes of death, 1990–2013: a systematic analysis for the Global Burden of Disease Study 2013". Lancet 385 (9963): 117–71. DOI:10.1016/S0140-6736(14)61682-2. PMID 25530442. 
  27. Schuckit (27 November 2014). "Recognition and management of withdrawal delirium (delirium tremens)". The New England Journal of Medicine 371 (22): 2109–13. DOI:10.1056/NEJMra1407298. PMID 25427113. Retrieved on 26 June 2020. 
  28. Chambers English Thesaurus. Allied Publishers. ISBN 978-81-86062-04-3. Retrieved on 26 June 2020. 
  29. WHO. Lexicon of alcohol and drug terms published by the World Health Organization. World Health Organization. Archived from the original on 5 February 2013.