Ọgbanje

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ọgbanje

Ọgbanje (nke doro anya "Ọgbanje" agaghị ewere ya dika "Obanje", "gb" bụ otu okwu na asụsụ Igbo ) bụ okwu na Odinani (Igbo: ọdịnala) (ma ọ bụ) maka ihe e chere na ọ bụ ajọọ mmụọ nke ga-ama ụma tinye ezinụlọ na nsogbu. Nsụgharị nkịtị ya n'asụsụ Igbo bụ "ụmụaka ndị na-abịa ma na-aga". E kweere n'oge ekpebiri ekpebi (nke na-anaghị agafekari pubati ), na Ọgbanje ga-ama ụma nwụọ ma laghachikwa azụ ime ndị ezinụlọ na-eru uju. Mgbe ụfọdụ, a na - eche na ibi ndị inyom úgwù ga - ewepụ mmụọ ọjọọ ahụ, [1] maọbu na ha ga - achọta mmụọ ọjọọ a iyi ụwa, nke ha gwuru n'ebe nzuzo, ga - eme ka Ọgbanje hapụ ịnye ezinụlọ a nsogbu - Iyi-ụwa abụ ụzọ Ogbanje si abiaghachi ụwa ma nweekwa ụzọ isi chọta ezinụlọ ya. A ga-egbu nwa ahụ nwụrụ anwụ ka ọ ghara ịlaghachi. Otú ọ dị, a na-ekwu n'ụfọdụ na-alọghachite, na-ebu ihe mgbu anụ nke nbibi a. [2]

Nkwenye n' Ọgbanje n'ala Igbo adịghị ike dịka ọ dịrị na mbụ ọ bụ ezie na-enwekwara ụfọdụ ndị kwere na ya. Mgbe ụfọdụ, eji okwu Ọgbanje mee ka okwu nnọchianya maka ụmụaka na-akparị mmadụ maọbu ndị nwere isi ike. Ọrịa Sickle cell nwere ike inye aka na nkwenkwe a, n'ihi na ihe nketa nke ọrịa ahụ n'ime ezinụlọ nwere ike ime ka ndị mmadụ kwubie na ụmụ ha niile sitere n'otu mmụọ ahụ. [3] [4]

A na-atụgharikwa okwu a bụ ọgbanje na olu bekee dika changeling, n'ihi myirịta ha na fairy nke Celtic n'akụkọ ifo nke ndi Europe. Ha abụọ bụ ụzọ e si eche echiche banyere ọdịiche nke ọrịa ndị a na-amaghị n'oge gara aga na-ejikarị ndụ ụmụaka (dịka SIDS na ọrịa sickle cell ).  


Na omenala amaara ama[dezie | dezie ebe o si]

  • Emeela ka Ọgbanje bụrụ ihe àmà ama site n'akwụkwọ Chinua Achebe, Things Fall Apart (1958), ebe nwatakịrị nwanyị akpọrọ Ezinma bụ onye e weere dika Ọgbanje n'ihi na ọ bụ nke mbụ n'ụmụ iri nne ya mụrụ na- anwụghị mgbe eji ya n'aka. [2] [5]
  • N'ime akwukwo Freshwater nke Akwaeke Emezi (2018), onye isi nke bụ Ada, nwere otutu ogbanje. [6]

Leekwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Abiku

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Sarkis, Marianne. NIGERIA: Female circumcision in Igboland. Archived from the original on 2020-09-24. Retrieved on 2019-06-08.
  2. 2.0 2.1 Chinua Achebe Things Fall Apart
  3. Ọnwụbalịlị JK (August 1983). "Sickle-cell anaemia: an explanation for the ancient myth of reincarnation in Nigeria". Lancet 2 (8348): 503–5. DOI:10.1016/s0140-6736(83)90524-x. PMID 6136656. 
  4. Nzewi E (May 2001). "Malevolent ọgbanje: recurrent reincarnation or sickle cell disease?". Soc Sci Med 52 (9): 1403–16. DOI:10.1016/S0277-9536(00)00245-8. PMID 11286364. 
  5. Yahoo. Archived from the original on 2008-05-02.
  6. Freshwater. 

Template: Nanị