Chinụa Achebe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chinụa Achebe
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịColonial Nigeria, Naijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoChinua Achebe Dezie
Aha ọmụmụAlbert Chinụalụmọgụ Achebe Dezie
Aha enyereAlbert Dezie
aha ezinụlọ yaAchebe Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya16 Novemba 1930 Dezie
Ebe ọmụmụOgidi Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya21 Maachị 2013 Dezie
Ebe ọ nwụrụBoston Dezie
ihe kpatara ọnwụdisease Dezie
Ebe oliliOgidi Dezie
Dị/nwunyeChristie Chinwe Okoli-Achebe Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa, Asụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
onye were ọrụBrown University, Mahadum nke Nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of London, Mahadum nke Ibadan, gọọmentị kọleji Umuahia Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1958 Dezie
Oge ọrụ ya (njedebe)2012 Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Redemption Party Dezie
agbụrụ Dezie
Ọnọdụ ahụikeparaplegia Dezie
Ọrụ ama amaIhe Aghasaa, No Longer at Ease, Arrow of God, A Man of the People, Anthills of the Savannah Dezie
Archive naHoughton Library, University of Reading, Special Collections Dezie
Onye òtù nkeModern Language Association, American Academy of Arts and Sciences, Royal Society of Literature Dezie
onye nlereranyaOkey Ndibe Dezie
ahọpụtara makaBooker Prize, Neustadt International Prize for Literature, Neustadt International Prize for Literature Dezie
Chinua Achebe (2008)

Chinụa Achebe (site n'aha a gụrụ ya Albert Chinụalụmọgụ Achebe; 16 Nọvemba 1930 – 21 Maachị 2013) bụ onye Igbo a mụrụ n'ụbọchị nke iri na isii n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1930 n'obodo Ogidi nke dị n'ala Naijiria. Ọ bụ ya dere akwụkwọ a na-akpọ Things Fall Apart. E si n'akwụkwọ ahụ mara aha ya nke ukwuu n'ụwa nile.[1]

Achebe, 1966

Ihe Gbasara Achebe[dezie | dezie ebe o si]

Chinụa Achebe, onye nke nne na nna ya kpọrọ Albert Chinụalụmọgu Achebe, gara ụlọ akwụkwọ nta nke ndị uka, gakwaa Government College n'Umuahia. Ọ mechara gakwaa mahadum nke Ibadan University of Ibadan, Ȯra Ọyọ (Oyo State) ebe ọ gụrụ asụsụ békè' site n'afọ 1948 ruo afọ 1953. Ka ọ gụchara akwụkwọ nke mahadum, ọ rụtụkwara ọrụ n'ụlọakwụkwọ dị iche iche nakwa n'ụlọọrụ mgbasa ozi. Site na 1958 ruo 1966, Chinụa Achebe bụ onye nhazi na-ahụ maka African Writers Series.

Mgbe Achebe dere Things Fall Apart, akwụkwo ahu rere nke ukwuu, mkpụrụ nde iri. A tụgharịkwaala akwụkwụ a n'olu asụsụ iri ise.

Chinụa Achebe rụkwara ọrụ onye diplomat n'ọchịchị nke Biafra site na 1967. Mana site na 1967 ruo 1981, ọ kụzikwara na mahadum dị iche iche n'ala Naijiria, ma bụrụkwa onye nhazi maka akwụkwọ edemede nke a na-akpọ Okike. N'afọ 1981, Chinụa Achebe sokwa na ndị bidoro Otu Ndi Odee Nke Naijiria, nke a na-akpọ Association of Nigerian Authors. Ọ rụkwara ọrụ onye isi were ruo 1986.

A bịa n'etiti Ndị Nka, yaa bụ ndị na-ede edemede nke Modern African Literature, ihe a na-akpọ Chinụa Achebe bụ Nna. N'afọ 2002 ka e nyere ya Peace Prize nke German Book Trade. A makwa Chinua Achebe dị ka onye na-enweghi onye e ji atụnyere ya maka ịmalite edemede n'asụsụ bekee' n'akụkụ ọdịda anyanwụ n'ala Afrịka.

Ọ luru nwanyi; aha nwunye ya bụrụ Christiana Chinwe Okoli.

Ihe Ndị O Dere[dezie | dezie ebe o si]

Things Fall Apart, Anchor trade paperback cover.

Novels[dezie | dezie ebe o si]

Short Stories[dezie | dezie ebe o si]

Poetry[dezie | dezie ebe o si]

Essays, Criticism and Political Commentary[dezie | dezie ebe o si]

Children's Books[dezie | dezie ebe o si]

Ihe Ndị O Meriri[dezie | dezie ebe o si]

  • 1972 Commonwealth Poetry Prize
  • 1987 Nigerian National Merit Award
  • 2002 Peace Prize of the German Book Trade
  • 2007 Man Booker International Prize

Lekwazie ndi nke ozo bụ ndi édémédé akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Atụmatụ n'aga n'ezi[dezie | dezie ebe o si]

References[dezie | dezie ebe o si]

  1. Chinua Achebe, African Literary Titan, Dies at 82, The New York Times, 22 Maachị 2013, asụsụ békè, looked up on 25 Maachị 2016.
  2. http://uzomediangr.wordpress.com/tag/book/