Ụbọchị Ọrụ Ugbo na Mmepe Ime Obodo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

N'agbata afọ 2009 na afọ 2012, Ụbọchị Ọrụ Ugbo na Mmepe Ímé Obodo (ARDD) bụ ihe omume a na-eme kwà afọ nkè otu Consultative Group on International Agricultural Research (CGIAR), Earth System Science Partnership (ESSP), Food and Agriculture Organization (FAO), Global Forum on Agricultural Research, GFAR), International Federation of Agricultural Producers (IFAP), na International Food Policy Research Institute (IFPRI) jikọtara.

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

ARRD atọ izizi bụ ihe omume ndị dị n'akụkụ nke United Nations Climate Change Conference (COP15) nkè emere n'afọ 2009, 2010, na 2011 nà Copenhagen, Denmark, Cancún, Mexico, na Durban, South Africa, n'otu n'otu.[1] Ihe karịrị mmadụ narị ise bịara n'afọ 2011, ébé ónyé na-ahụ màkà ihe ndị dị ndụ na Britain bụ John Beddington " gosipụtara ihe dị mkpa màkà izere ọdịnihu nke oke ihu ígwé na-akpata nsogbu nri".[2]

Ihe omume nké anọ mèrè na Nzukọ Mba Ndị Dị n'Otu maka Mmepe Na-adịgide Adịgide (UNCSD) nke a na-akpọ Rio afọ 2012, Rio + 20, ma ọ bụ Nzukọ Ụwa nke afọ 2012 na Rio de Janeiro, Brazil. Ọ bụ ụlọ ọrụ Brazil Agricultural Research Corporation (Embrapa) na CGIAR kwadoro ya.[3]

ARDD nké ise na nké ikpeazụ, nkè a na-akpọ Agriculture, Landscapes, and Livelihoods Day 5(ALL-5), mèrè n'akụkụ Forest Day n'akụkụ nke 2012 United Nations Climate Change Conference (COP18) na Doha, Qatar.[4][5]

N'afọ 2013, ihe omume a jikọtara yá nà Forest Day iji ghọọ Global Landscapes Forum (GLF).

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Agriculture and Rural Development Day 2009 Website. www.agricultureday.org. Archived from the original on 2016-11-16. Retrieved on 2017-12-16.
  2. Researchers outline food security, climate change road map. news.wisc.edu. Retrieved on 2021-09-23.
  3. "Agriculture and Rural Development Day", CGIAR. Retrieved on 2017-12-16. (in en-US)
  4. Agriculture, Landscapes, and Livelihoods Day 5. Archived from the original on 2017-09-29. Retrieved on 2017-12-16.
  5. "The Story of Agriculture and Climate Change: The Road We’ve Travelled", Water, Land and Ecosystems, 2012-12-05. Retrieved on 2017-12-16. (in en)