Ụmụanụmanụ Nwere Ọkpụkpụ n’Ogologo Azụ Ha na Mbà Chaịna

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Wikipedia list article. Nke a bụ ederede Wikipedia kpọrọ ụmụanụmanụ ndị a aha n’otù n’otù. Ị chọọ ịma maka ndị nọ n’izè ndụ n'ime ụmụanụmanụ ndị a, gaa gụọ List of endangered and protected species of China.

giant panda, ndị sayensị kpọrọ Ailuropoda melanoleuca, buru nnukwu ibù, bụrụ anụmanụ e ji mara Chaịna dịka mbà.


Nke a bụ ndepụta aha ‘’’ụdị ụmụanụmanụ nwere ọkpụkpụ n’ogologo azụ ha na mbà Chaịna. Ụdị ụmụanụmanụ nwere ọkpụkpụ n’ogologo azụ ha na mbà Chaịna (China) dị narị puku anọ, iri itolu na ise (495). Iri itolu na otù n’ime ha nọ n’ọnọdụ izè ndụ dị ichè ichè. Otù n’ime ha anọghịzi chachaa.[1]

N’okpuru ebe a bụ mkpụrụokwu Bekee e jiri kọwaa ọnọdụ nchekwa ụdị nke ọbụla nọ na ya, dịka òtù International Union for Conservation of Nature siri wepụta ha. International Union for Conservation of Nature bụ òtù na-ahụ na e chekwara ihe niile Chineke kere.

EX Extinct No reasonable doubt that the last individual has died.
EW Extinct in the wild Known only to survive in captivity or as a naturalized populations well outside its previous range.
CR Critically endangered The species is in imminent risk of extinction in the wild.
EN Endangered The species is facing an extremely high risk of extinction in the wild.
VU Vulnerable The species is facing a high risk of extinction in the wild.
NT Near threatened The species does not meet any of the criteria that would categorise it as risking extinction but it is likely to do so in the future.
LC Least concern There are no current identifiable risks to the species.
DD Data deficient There is inadequate information to make an assessment of the risks to this species.

Ụfọdụ ụdị ụmụanụmanụ nwere ọkpụkpụ n’ogologo azụ ha bụ ndị e jiri ọ̀tụ̀tụ̀ dịbuurịị kọwaa ọnọdụ ha. E debere ndị a n'òtù nke ndị fọrọ obere ka ha nọrọ n’izè ndụ na n’òtù nke ndị ọnọdụ ha na anaghị amapụ obi, dịka ha dị n’okpuru ebe a:

LR/cd Lower risk/conservation dependent Species which were the focus of conservation programmes and may have moved into a higher risk category if that programme was discontinued.
LR/nt Lower risk/near threatened Species which are close to being classified as vulnerable but are not the subject of conservation programmes.
LR/lc Lower risk/least concern Species for which there are no identifiable risks.

Mmadụ na ụmụanụmanụ na-eme ka mmadụ[dezie | dezie ebe o si]

Mbà Chaịna bụ ebe obibi ụdị ụmụanụmanụ iri abụọ na otù na-eme ka mmadụ. Ndị so n'ụmụanụmanụ ndi a a kpọrọ “primates” n’asụsụ Bekee bụ ụmụanụmanụ na-aza “gibbon”, ndị nke na-aza macaque na ndị a kpọrọ “leaf monkey”, “gray langur”, snub-nosed monkey” na “loris”. Ọ fọrọ obere ka ụmụanụmanụ niile na-eme ka mmadụ na mbà Chaịna bụrụ ndị aha ha nọ n’akwụkwọ e dekọrọ ụmụanụmanụ na-ezè ndụ (ya bụ, akwụkwọ a kpọrọ endangered. Enwè na-aza “Gibbon” na “macaque” na ụdị enwè ndị ọzọ na-anọkarị n’omenala ndị Chaịna, n'okpukpere ha, n’ihe esere ésè na n’akụkọ ederede.


Gibbon bụ nanị ụdị enwè lọrọ uwa na mbà Chaịna. Enwè a nwere aka ogologo o ji amagharị na ngalaba osisi nihi na o na-ebi n’osisi. Ihe ọzọ e ji-ama gibbon bụ na ọ na-akpọ oku n’oke olu. Oke na nne gibbon nọkọọ ka di na nwunye, ha na-agụ egwu ka mmadụ abụọ azụrụ azụ n'ịgụkọ egwu ọnụ.


Ụdị gibbon a na-akpọ Hainan black crested gibbon, nwere ihe na-eji oji n’olu ya dịka ihe a nyawara ya anyawa, so na ụdị enwè kacha dị ụkọ, bụrụkwa otù n’ime anụmanụ iri abụọ na ise na-eme ka mmadụ, kacha nọrọ n’izè ndụ n’uwa dum, nke Bekee sị na ha bụ most endangered apes. Ebe a na-ahụ Hainan black crested gibbon hie nne bụ n’ala mmiri gbara gburùgburù a na-akpọ island of Hainan. A bịa n’ebe a na-echekwa ihe okikè, na-aza Bawangling National Nature Reserve, Hainan black crested gibbon nọ na ya erughị iri atọ.[2]


A na-ahụ gibbon a, a kpọrọ “black crested gibbon” nwere ihe na-eji oji n’olu, na ndịda ọdịda-anyanwụ mbà Chaịna (southwestern China). Ụdị gibbon nwere aka na-acha ọcha, a na-akpọ white-handed gibbon, anọghịzi na mbà Chaịna.[3] Mgbe ikpeazụ ndị zoologists, ndị ihe banyere ụmụanụmanụ doro anya, hụrụ gibbon a aka ya na-acha ọcha bụ n’afọ 1988, mana ndị mmadụ bi n’ime obodo nụrụ olu ya ikpeazụ n’afọ 2002.[3] A survey in November 2007 in the Nangunhe National Nature Reserve yielded no sign of this gibbon.[3]


Ọ fọrọ nwantịị ka ụdị gibbon nwere ntì ọcha, na-aza “northern white-cheeked gibbon”, gwụchaa kpamkpam n’ọhịa nọ na ndịda Yunnan nihi na ndị Chaịna bi n’ebe ahụ na-achụ nta ya. Ha ji ya bụ enwè agwọ ọgwụ maka inweta ihuọma nakwa iji ọkpụkpụ ya arụ ọrụ ikwe akwà.[2] N’afọ 2008, gibbon ntì-ọcha asatọ a nwụbara n’ime ebe nchekwa “Mengyang Nature Reserve” ka bi n’ebe ahụ.[4] E mechara hapụ abụọ n’ime ha ka ha laghachị n’ọhịa, mana ọ bụkwa ndị njem nlereanya ka na-enye ha nri.[5]

  1. This list is derived from the IUCN Red List which lists species of mammals and includes those mammals that have recently been classified as extinct (since 1500 AD). The taxonomy and naming of the individual species is based on those used in existing Wikipedia articles as of 21 May 2007 and supplemented by the common names and taxonomy from the IUCN, Smithsonian Institution, or University of Michigan where no Wikipedia article was available.
  2. 2.0 2.1 [1] Accessed May 30th, 2020
  3. 3.0 3.1 3.2 [2] 18 August 2010
  4. Fan Pengfei & Huo Sheng (2009). "The northern white-cheeked gibbon (Nomascus leucogenys) is on the edge of extinction in China". Gibbon Journal 5: 44. 
  5. Fan & Peng (2009) at 49