18 Days (ihe nkiri)
aha | 18 يوم |
---|---|
Isiokwu nlebanya | Arab Spring |
ụdị | drama film, political film |
mba osi | Egypt |
Mmalite asụsụ ihe ngosi | Arabic |
afọ/ụbọchị mbipụta | 19 Mee 2017 |
Onye nduzi | Sherif Arafa, Marwan Hamed, Yousry Nasrallah, Kamla Abou Zekry |
ekesa site | Netflix |
usoro nkesa | video on demand |
18 Days (Egyptian Arabic 18 يوم, translit. Tamantashar Yom) bụ ihe nkiri anthology nke Ijipt na-elekwasị anya n'Ụbọchị 18 nke mgbanwe Egypt nke afọ 2011. E gosipụtara ya na 2011 Cannes Film Festival.
Otu ìgwè nke ndị nduzi iri, ndị na-eme ihe nkiri iri abụọ ma ọ bụ karịa, ndị edemede isii, ndị nduzi asatọ nke foto, ndị injinia ụda asatọ, ndị na'emepụta ihe ise, ndị na na-emepụta ejiji atọ, ndị nchịkọta akụkọ asaa, ụlọ ọrụ atọ na-emepụta ihe, na ihe dị ka ndị na-emepụta iri ekwekọrịtala ime ngwa ngwa ma gbaa, na-enweghị mmefu ego na n'afọ ofufo, ihe nkiri iri dị mkpirikpi banyere mgbanwe Jenụwarị 25 na Ijipt. Akụkọ iri ha ahụla, nụ ma ọ bụ chepụta.
A ga-etinye ego niile nke ihe nkiri a n'ịhazi ndị njem iji nye agụmakwụkwọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke obodo n'ime obodo ndị dị n'Ijipt.
Ihe nkiri ndị a bụ:
- Nkwado nke Sherif Arafa
- Okike Chineke nke Kamla Abou Zikri
- 19-19 nke Marwan Hamed dere
- Mgbe Iju Mmiri Kpatụrụ Gị... nke Mohamed Ali dere
- Iwu mkpegharị nke Sherif El Bendary
- Cookies nke Mgbanwe site na Khaled Marei
- Tahrir 2/2 nke Mariam Abou Ouf
- Window nke Ahmad Abdalla
- Interior/Exterior nke Yousry Nasrallah
- [1]Ashraf Seberto nke Ahmad Alaa [2]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]atọ, ndị nchịkọta akụkọ asaa, ụlọ ọrụ atọ na-emepụta
- ↑ Smith (2012). International Film Guide 2012. ISBN 978-1908215017.
- ↑ "Middle East premiere of 18 Days at the Abu Dhabi Film Festival", Ahram Online, 20 September 2011. Retrieved on 5 October 2011.