Abdellatif Berbich

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abdellatif Berbich
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịMorocco Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya17 Mee 1934 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1 Jenụwarị 2015 Dezie
Ebe ọ nwụrụRabat Dezie
Ebe oliliMartyrs' Cemetery Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụphysician Dezie
Onye òtù nkeArab Academy of Damascus Dezie
Ihe nriteFellow of the African Academy of Sciences, Member of the Hassan II Academy of Sciences and Technologies, Royal Victorian Medal, Ordre des Arts et des Lettres, Grand Officer of the Order of the Throne Dezie
Map

Abdellatif Berbich FAAS (Àtụ:Lang-ar, 17 May 1942–1 January 2015) bụ ọkammụta nke ọgwụgwọ ime ahụ. O bụ onye isi ntọala nke nephrology ụlọ ọrụ mba Morocco, ode akwụkwọ ụkwụ nke Alaeze Morocco, nakwa onye nnọchiteanya mba Morocco na Algiers.[1][2][3]

Agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Berbich na Fez, Morocco|Fez, Morocco na 17 Mee, 1934. Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị Moulay Youssef na Gouraud maka agụmakwụkwọ sekọndrị ya. O nwetara nzere ọkankuzi ya na ọgwụ n'afọ 1961 na Mahadum Montpellier. N'agbata 1962 na 1964, ọ gbasoro ọkachamara na Nephrology and medical resuscitation na University Hospital Center of Paris (Hospital Necker) [2][3][4][5]

Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1967, Berbich bụ osote ọkammụta na ọmụmụ ọgwụ na Mahadum Rabat. N'afọ 1968, ọ ghọkwara onye isi dọkịnta nke ụlọ ọgwụ Ibn Sina-Avicenne. N'otu afọ ahụ, a họpụtara ya dị ka Onye isi na ngalaba Ọmụmụ ọgwụ nke Mahadum Rabat ruo afọ 1974. Na 1982, ọ ghọrọ odeakwụkwọ ndigide nke Alaeze Morocco, na n'afọ 1988, ọ ghọrọ onye nnọchianya nke Morocco na mba Algiers.[1][2][3][4] N'Ọktoba 1968, ọ ghọrọ onye isi nchịkwa nke mbugharị akụrụ-ahụ mmadụ na Morocco, na n'afọ 1973, o kere haemodialysis nke mbụ na Morocco. [4][1]

Mmekọrịta na Òtù Ndị O Sogasị na Ha[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Berbich ka ọ bụrụ onye òtù nke African Academy of Sciences n'afọ 1986.[1] Ọ bụ onye ntọala nke òtù Moroccan Associations of Medical Sciences and nephrology, onye òtù French na International Nephrology Associations. Onye òtù, French National Association of Internal Medicine, na French National Academy of medicine. .[2][3][5]

Onyinye na nkwanye ùgwù[dezie | dezie ebe o si]

Enyere Berbich ihe nrite Hassi Beida na ihe nrite Star of War n'afọ 1963, Royal Victorian Order|Commander of the Royal Victorian Order n'afọ 1987, Ọchịagha nke French Order of Arts and Letters n'afọ 1989, onye isi nke Order of the Throne nke Morocco n'afọ 1989, na Ọchịagha nke Legion of Honor n'afọ 2000. E nyekwara ya onye ọchịagha nke Order of Merit na Spain, Germany, Denmark, Italy, Portugal na Senegal.ref name=":0" />[3] Enyere ya ihe nrite Throne Medal ka ọ nwụchara, Great Officer na Morocco n'afọ 2015.ref>Throne Day: King Mohammed VI Hands Distinctions to Moroccan and Foreign Figures (en).</ref>[6][7]

Ọnwụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Berbich nwụrụ na Rabat, Morocco na 1 Jenụwarị 2015, ka ọ gbara afọ iri asatọ, E wee lie ya n'ebe olili ozu ndị okwukwe.[8][9][10]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Scholia


Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Berbich Abdellatif | The AAS. Archived from the original on 2022-11-26. Retrieved on 2023-12-05.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Abdellatif BERBICH (fr-FR).
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 Décès à Rabat du professeur Abdellatif Berbich - La Vie éco (fr-FR).
  4. 4.0 4.1 4.2 Décès du Pr Abdellatif Berbich (fr-FR) (2015-01-02).
  5. 5.0 5.1 CTHS - BERBICH Abdellatif.
  6. Fête du Trône: la liste des personnalités décorées (fr-FR) (2015-07-30).
  7. Mohammed VI décore des MRE et un ancien condamné à mort (fr).
  8. Le360 (2015-01-02). Décès à Rabat du professeur Abdellatif Berbich (fr).
  9. البروفيسور عبد اللطيف بربيش في ذمة الله (ar) (2015-01-01).
  10. Morocco: HM the King Offers Condolences to Family of Late Abdellatif Berbich (2015-01-02).