Farida Fassi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Farida Fassi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịMorocco Dezie
Aha enyereFarida Dezie
aha ezinụlọ yaFassi Dezie
Ebe ọmụmụLarache Dezie
Asụsụ obodoBerber languages Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Berber languages Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie
onye were ọrụMohammed V University Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Valencia, Instituto de Física Corpuscular Dezie
Onye òtù nkeAfrican Academy of Sciences Dezie

Farida Fassi FAAS (Àtụ:Lang-ar) bụ ọkammụta nwanyị na ngalaba physics mba Morocco site na Mahadum Mohammed V na Rabat. Ọ bụ onye nchoputa nke African Strategy for Fundamental Applied Physics na onye òtù African Academy of Sciences.

Mmalite Ndụ na agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Fassi na Larache ebe ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị nke nta na nke úkwú tupu ọ kwaga Tetouan iji mechaa ọmụmụ mahadum ya.[1] O nwetara nzere B.Sc ya ngalaba physics na Mahadum Abdelmalek Essaâd n'afọ 1996. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ kwagara Spain, Mahadum Valencia, ebe ọ nwetara nzere M.Sc ya n'afọ 1999.[2] N'afọ 2003, enyere ya nzere Ph.D na ngalaba particle physics n'ihi ọrụ ya na ATLAS experiment na CERN.[3][4]

Ọrụ na Ime Nnyocha Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ruo afọ 2013, Fassi sooro na ndị òtù mere Nchọpụta sayensị ATLAS [5] and Compact Muon Solenoid (CMS)[6] ndị mechara chọpụta Higgs boson n'afọ 2012.[3] Ka nke ahụ gasịrị, ọ rụrụ ọrụ na Grid Computing and Distributed Data Analysis. N'afọ 2007, ahọpụtara Fassi ịbụ onye òtù CERN.[4][7] Ọzọkwa, ruo oge dị afọ iri na atọ, ọ nọ na-arụ ọrụ n'ọ́kwá dị iche iche kwesịrị onye ji nzere Ph.D dịka na Spanish National Research Council, French National Centre for Scientific Research, nakwa Spanish Center for Particle, Astroparticle, and Nuclear Physics.[7] Ọ bụ ọkammụta na ngalaba physics na Mahadum Mohammed V na Rabat.[8]

A hụkwara áhà Fassi na usoro ndetu aha mmadụ iri ise bụ ndị ọkammụta sayensị kacha n'ụwa niile dịka International 2021 AD Scientific Index si dee ya.[9][10] A rụtụla ihe ndị o dere aka n'ọtụtụ akwụkwọ mbipụta ihe karịrị ugboro narị puku abụọ na iri ise, nwekwaa index dị elu nọ n'ọnụ ọgụ narị abụọ na iri na itoolu.[11]Àtụ:Efn-ua E dowere ya n'ógó onye nke iri atọ na asatọ n'ụwa niile na onye nke abụọ n'Afrịka na Middle east. [1][12][13][14] Fassi bụ onye odeakwụkwọ ukwu mbido na Arab physical Society,[15] nakwa onye so hiwe African Strategy for Fundamental andApplied Physics.[16]

Ihe Nrite na Nkwanye Ùgwù Ya[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Fassi dịka onye òtù African Academy of Sciences n'afọ 2020.[17]

Akwụkwọ Ndị Ebipụtara Ahọpụtara[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Scholia

  • Miquel Senar, P. Lason, Farida Fassi: Ọrụ Organization of the International Testbed of the CrossGrid.

Ihe Ndí Nhụwa Ama[dezie | dezie ebe o si]


Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Dumpis, Toms. Farida Fassi: 'Math is Hard, Physics is Beautiful' (en).
  2. Ajụjụ ya na Prof. Farida Fassi na Mahadum Mohammed V, Morocco | Arab States Research and Education Network - ASREN.
  3. 3.0 3.1 Farida Fassi's schedule for UNGA76 Science Summit.
  4. 4.0 4.1 Kasraoui, Safaa. Two Moroccan Women Scientists Feature in AD Scientific Index 2023 (en).
  5. Farida Fassi (en).
  6. Search for new physics in the multijet and missing transverse momentum final state in proton-proton collisions at sqrt (s)= 8 TeV.
  7. 7.0 7.1 Farida Fassi (en).
  8. Interview with Prof. Farida Fassi at Mohammed V University, Morocco | Arab States Research and Education Network - ASREN.
  9. AD 2023 scientific index ranking: two Moroccan women scientists made it, or did they? (en-US) (2022-10-13).
  10. Farida Fassi – Arabian Records (1st post : Eid Al Fitr – 01st Shawwal 1439 (AH) / 15th June 2018 ) / (BETA testing – Research – starting April 2020 till date, on-going) (en-US).
  11. Dr. Farida Fassi, Professor of physics.
  12. Index, AD Scientific. Farida Fassi - AD Scientific Index 2023 (en).
  13. نالت شهادتي دكتوراه.. العالمة المغربية فريدة الفاسي في صدارة علماء العرب وإفريقيا (ar).
  14. فريدة الفاسي.. الباحثة المتوجة ضمن العلماء الأكثر تأثيرا في العالم لـ"اليوم 24": شرف كبير للمغرب (in Bekee), retrieved 2022-11-28
  15. Governing Council (GC). Archived from the original on 2022-11-28. Retrieved on 2023-12-06.
  16. Farida Fassi | Université Mohammed V Agdal - Academia.edu.
  17. Farida Fassi | The AAS. Archived from the original on 2022-11-24. Retrieved on 2023-12-06.