Abdin Mohamed Ali Salih

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abdin Mohamed Ali Salih
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịSudan Dezie
aha n'asụsụ obodoعابدين محمد علي صالح Dezie
Aha enyereSalih Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Jenụwarị 1944 Dezie
Ebe ọmụmụWad Madani Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaSudanese Arabic, Bekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic, professor Dezie
ụdị ọrụ yacivil engineering, ecology Dezie
onye were ọrụUniversity of Khartoum, UNESCO Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Khartoum, Imperial College London, University of Padua Dezie
ogo mmụtadoctorate, Doctor of Philosophy, diploma Dezie
Ebe ọrụUniversity of Khartoum, King Saud University Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
Ihe nriteFellow of the African Academy of Sciences, TWAS fellow Dezie

Abdin Mohamed Ali Salih FAAS FTWAS FIWRA (amụrụ 1944) [1] bụ onye mba Sudan bụ ọkammụta na ngalaba Civil Engineering Mahadum Khartoum nakwa ọkachamara UNESCO na Akụnụba si na mmiri.[2][3]

Mmalite Ndụ na agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Salih na Wad Madani, Sudan na 1944.[1] Ọ bụ ezie na e dere ụbọchị ọmụmụ ya dị ka 1 Jenụwarị, nke a nwere ike ọ gaghị abụ eziokwu. N'oge amụrụ ya, e kenyere abalị mbụ nke ọnwa Jenụwarị maka ndị a mụrụ na mpụga Khartoum, ọmụmaatụ, Abdalla Hamdok na Omar al-Bashir. Salih banyere na Khartoum University| Mahadum Khartoum n'afọ 1963 wee nweta nzere Bachelor of Science n'ógó First Class Honors na ngalaba Civil Engineering. N'afọ 1969 o nwetara nzere Diploma of Imperial College wee gaa n'ihu mechaa Doctor of Philosophy na Hydraulics n'afọ 1972 sitere na Imperial College London. O mechara nweta Diploma na Hydrology na Mahadum Padua Italy, n'afọ 1974 [2][4][5]

Ịme Nnyocha na ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe omwetachara nzere PhD ya Salih laghachiri na Sudan n'afọ 1973 wee sonye na ngalaba nke injinia nke Mahadum Khartoum dị ka onye nkuzi tupu ọ bụrụ onye ọkammụta nsonye n'afọ 1977, onye isi ngalaba nke Civil Engineering n'afọ 1979. , na onye ọkammụta zuru oke n'afọ 1982. Ọ ghọrọ onye osote onye isi oche Mahadum Khartoum n'etiti 1990 na 1991. Dị ka ebe Nọvemba 2022, ọ bụ ọkammụta na ngalaba Civil Engineering, Mahadum Khartoum na onye so na Kansụl Na-achị Isi nke Mahadum Khartoum nakwa Mahadum Sayensị na Teknụzụ nke Sudan. Ọ bụkwa onye ọkammụta na College of Engineering, Mahadum King Saud, site n'afọ 1982.[5][4][6] Ọrụ ime nnyocha na inye ndụmọdụ Salih lekwasịrị anya na nchekwa mmiri na njikwa akụrụngwa mmiri. Ọ jere ozi na UNESCO site na 1993 ruo mgbe ọ ghọrọ onye ntụzi aka nke ngalaba Water Sciences n'afọ 2011 [7][8][3] and was a member of the Executive Board of UNESCO from 2015 until 2019.[9][10] Ọ bụbukwa Gọvanọ ọzọ nke Kansụl n'ahụ maka mmiri nke mba ụwa n'etiti 1999 na 2003. [2] Salih na-arụ ọrụ dịka onye ndụmọdụ maka Kọmishọn Ukwu maka mmepe Riyadh, Saudi Arabia, ọ bụ onye òtù nke ọtụtụ òtù n'ahụ maka mmiri na mba ụwa ,[11] ma bụrụkwa onye juri nke ọtụtụ ihe nrite mmiri mba ụwa.[12]

Ihe Nrite na Nkwanye Ùgwù Ya[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Salih dịka onye òtù nke International Water Resources Association (FIWRA) n'afọ 1983,[5], onye òtù African Academy of Sciences (FAAS) n'afọ 1993,[2][13] na onye òtù The World Academy of Sciences (FTWAS) n'afọ 2002.[14] Enyere ya ihe nrite Islamic World Educational, Scientific and Cultural Organisation (ISESCO)'s Award for Excellence in Scientific Research.[8]

Ndụ Onwe Onye Ya[dezie | dezie ebe o si]

Salih alụọla nwanyị jiri ụmụ atọ .[1]

Akwụkwọ Ndị Ebipụtara Ahọpụtara[dezie | dezie ebe o si]

Ihe Ndị Nhụwa Ama[dezie | dezie ebe o si]


Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Abdin Mohamed Ali Salih | Just another UofK site. Archived from the original on 2022-11-13. Retrieved on 2023-12-04.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Salih Abdin Mohamed Ali | The AAS. Archived from the original on 2022-11-13. Retrieved on 2023-12-04.
  3. 3.0 3.1 iAgua, redaccion (2011-10-05). Abdin Mohamed Ali Salih, nuevo Director para la División de Ciencias del Agua y Secretario del PHI de la UNESCO (es).
  4. 4.0 4.1 بروفسور عابدين محمد على صالح بقلم بخيتة امين (ar).
  5. 5.0 5.1 5.2 CV. Archived from the original on 2022-11-13. Retrieved on 2023-12-04.
  6. Cssp.
  7. Euro-Mediterranean Information System on know-how in the Water sector - International portal.
  8. 8.0 8.1 Side Event at the ICSU Forum on Science, Technology and Innovation // "Water security" A New Paradigm of Adaptive Management | Nexus - The Water, Energy & Food Security Resource Platform.
  9. Advisory and Consulting Contributions | Abdin Mohamed Ali Salih (en-US). Archived from the original on 2022-11-13. Retrieved on 2023-12-04.
  10. Wagner elected as new Chair of UNESCO-IHE (en-US) (2015-12-05).
  11. Advisory and Consulting Contributions | Abdin Mohamed Ali Salih (en-US). Archived from the original on 2022-11-13. Retrieved on 2023-12-04.
  12. Stephenson, David (2005). Water services management / { Prof. Abdin Mohamed Ali Salih collection }. London: Lightning Source UK Ltd. ISBN 978-1-84339-080-0. 
  13. Abdin Mohamed Ali Salih's biography, net worth, fact, career, awards and life story - ZGR.net.
  14. Salih, Abdin Mohamed Ali (en).

Njikọ Mpụga[dezie | dezie ebe o si]