Accident Investigation Bureau (Nigeria)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ụlọ ọrụ nyocha ihe mberede (AIB) na-enyocha ihe mberede ụgbọelu na ihe omume na Naịjirịa. Isi ụlọ ọrụ ya dị na Nnamdi Azikiwe International Airport na Abuja.

Ụlọ ọrụ ahụ na-agwa Onye isi ala Naịjirịa site na Minista Federal nke Aviation. Kọmishọna ụlọ ọrụ ahụ, onye bụkwa Chief Executive Officer bụ Engr. Akin Olateru

Na Septemba, na afọ 2020, Federal Executive Council kwadoro nguzobe nke AIB Training School na Naịjirịa.[1]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

N'oge gara aga, Ngalaba Na-ahụ Maka Ụgbọelu na-enyocha ihe mgberede ụgbọelu. N'afọ 1989, e guzobere Federal Civil Aviation Authority (FCAA), na Ngalaba Civil Aviation nke MOA ghọrọ Ngalaba FCAA nke Ọrụ Nchebe. N'otu afọ ahụ, e guzobere Ụlọ Ọrụ Nnyocha Ihe Ọghọm (AIB), nke dị n'okpuru Ministrị nke Ụgbọelu, na FCAA enweghịzi ọrụ nyocha ihe mberede. E mechara gbanwee aha ụlọ ọrụ ahụ ka ọ bụrụ Ụlọ Ọrụ Nnyocha na Mgbochi Ihe Ọghọm. Dị ka akụkụ nke Civil Aviation Act nke afọ 2006, AIB ghọrọ ụlọ ọrụ na-achị onwe ya ma nye ya aha ọzọ Accident Investigation Bureau.

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. FG Approves AIB Training School – Bureau Commissioner (en-US). Geeky Nigeria (2020-09-05). Retrieved on 2020-09-06.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]