Adi Roche

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Adi Roche
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịIreland Dezie
Aha enyereAdi Dezie
aha ezinụlọ yaRoche Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya11 Julaị 1955 Dezie
Ebe ọmụmụClonmel Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
ebe agụmakwụkwọSaint Cronan's Boys' National School Dezie
Ebe obibiCork Dezie
Ihe nriteRobert Burns Humanitarian Award Dezie

Adi Patricia Roche (Amụrụ n'ụbọchị 11 Julaị 1955) bụ onye Irish na-eme ihe, onye na-emegide nuklia, na onye na-eme mkpọsa maka udo, enyemaka na agụmakwụkwọ.

O lekwasịrị anya n'ịgbapụ n'ahụhụ ụmụaka nwere n'ihi ọdachi nuklia Chernobyl nke afọ 1986.

A mụrụ Adi Roche na Clonmel, County Tipperary n'afọ 1955. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị, ọ gara rụọ ọrụ na Aer Lingus.[1] Ọ hapụrụ n'afọ 1984 iji rụọ ọrụ oge niile dị ka onye ọrụ afọ ofufo maka Irish Campaign for Nuclear Disarmament . O chepụtara usoro agụmakwụkwọ udo ma nyefee ya n'ihe karịrị ụlọ akwụkwọ iri ise na Ireland dum. N'afọ 1990, ọ ghọrọ nwanyị Irish mbụ a họpụtara na bọọdụ ndị nduzi nke International Peace Bureau na United Nations na Geneva.

N'afọ 1991, Roche guzobere Chernobyl Children International, iji nyere ụmụaka Belarus, Western Russia na Ukraine aka mgbe ọdachi nuklia Chernobyle nke afọ 1986 gasịrị.[1] Òtù ahụ na-arụ ọrụ na mpaghara mmepe mba ụwa yana enyemaka ahụike na nke enyemaka. Ọ na-arụ ọrụ na ụmụaka na ezinụlọ ndị ọdachi ahụ na-aga n'ihu na-emetụta.[2]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Clifford, Graham. "Adi Roche - 'I was drowning but the children of Chernobyl rescued me'", Independent, 14 December 2014. Archived from the original on 24 November 2018. Retrieved on 23 August 2015. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Clifford" defined multiple times with different content
  2. Kelleher. "Adi Roche set to be awarded Freedom of Cork city", The Irish Times, 17 March 2018. Retrieved on 23 November 2018.