Agnes Atim Apea
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Uganda |
| Aha enyere | Agnes, Atim |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 1970s |
| Ebe ọmụmụ | Uganda |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | Onyeisi azụmahịa, social entrepreneur |
| Ọkwá o ji | Member of Parliament of Uganda |
| Mpaghara ntuli aka | Amolatar District |
| Ebe agụmakwụkwọ | Uganda Martyrs University, University of Reading |
| Onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | National Resistance Movement |
| Mba osi | Uganda |
| Ihe nrite | BBC 100 Women |
Agnes Atim Apea bụ onye ọchụnta ego na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Uganda. Ọ bụ onye guzobere Hope Development Initiative, a kpọkwara ya aha na mmemme BBC 100 Women na afo 2017. Na ntuli aka nke afọ 2021, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye omeiwu nke Uganda dị ka onye nnọchi anya ụmụ nwanyị na mpaghara Amolatar maka National Resistance Movement.[1]
Agụmakwụkwọ na ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Apea nwere Doctor of Philosophy in International Development site na Mahadum Reading, na nzere Master site na Maazị Uganda Martyrs na Developmental Studies.[2]
Apea bụ onye isi oche nke Local Government Finance Commission nakwa onye guzobere na onye isi nchịkwa nke Hope Development Initiative, nke na-akwalite ụlọ ọrụ na-akụ osikapa maka ndị ọrụ ugbo nwanyị n'ọtụtụ mpaghara nke Uganda.[3] Nke a emeela ka a kpọọ ya "Mama Rice".[4] Òtù ya haziri ndị ọrụ ugbo na Uganda, ma na-agba mbọ inweta akụkụ dị ukwuu nke òkè ahịa. Na mgbakwunye na osikapa, ụlọ ọrụ ahụ na-ejikwa mkpụrụ eji eme mmanụ akwụkwọ nri na ngwaahịa cassava na-arụ ọrụ.[2]
Ọ bụkwa onye nnọchi anya ụmụ nwanyị nke Nzukọ Ndị Omeiwu maka Mpaghara Amolatar na Northern Uganda.
Na afọ 2017, a kpọrọ aha ya na mmemme BBC 100 Women.[5] Apea chọpụtara mgbe ọ na-aga 7th African Grain Trade Summit na Tanzania, na-ekwu na ọ bụ n'ihi na ọ na-akwalite ikpe ziri ezi na ịkụzi ụmụ agbọghọ ka o mere ndepụta ahụ.[4]
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Ndepụta nke ndị otu nke iri na otu nke Uganda
Ebemsidee
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 10 incumbents in Lango kicked out of Parliament. The Monitor (19 January 2021). Retrieved on 21 February 2021.
- 1 2 Agnes Atim Apea, PhD. The Global Ambassadors Program. Archived from the original on 26 October 2017. Retrieved on 6 November 2017.
- ↑ Agnes Atim Apea. Institute for the Study of Human Rights. Retrieved on 6 November 2017.
- 1 2 Emorut. "Ugandan among most innovative women in the world", New Vision, 10 October 2017. Retrieved on 6 November 2017.
- ↑ "BBC 100 Women 2017: Who is on the list?", BBC News, 1 November 2017. Retrieved on 6 November 2017.