Agnes Taaka

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Agnes Taaka
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Aha enyereAgnes Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya3 Eprel 1980 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, social worker Dezie
Ọkwá o jimember of parliament Dezie
Mpaghara ntuli akaBugiri District Dezie
ebe agụmakwụkwọMakerere University, Law Development Centre Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNational Resistance Movement Dezie

isii Agnes Taaka nke a makwaara dị ka Taaka Agnes Wejuli (amụrụ n'ụbọchị nke 3 n'ọnwa Eprel n'afọ 1980) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Uganda, Social Worker, na onye omeiwu. Ọ bụ nwanyị nnọchi anya mpaghara nke Bugiri District. Ọ rụrụ ọrụ na nke itoolu, nke iri na nke iri na otu nke Uganda dị ka onye omeiwu. Ọ bụ onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-achị, National Resistance Movement.[1][2] Ọ bụ nwanyị omebe iwu nke Bugiri District ugbu a n'oge(2021-2026) mgbe ekwupụtara ya dị ka onye mmeri na ntuli aka onye isi ala na nke ndị omebe iwu na Uganda.[3][4]

Agụmakwụkwọ na nzụlite[dezie | dezie ebe o si]

Ọ lụrụ di. Ọ gụsịrị akwụkwọ Primary Leaving Examinations na Kigulu Girls Primary school na 1992 ma mesịa sonye na Bukoyo Senior Secondary School maka Uganda Certificate of Education na 1996. N'afọ 1999, Agnes sonyeere Iganga Senior Secondary School for Uganda Advanced Certificate of Education (UACE). E nyere ya nzere bachelọ nke Arts na Social Science na Mahadum Makerere n'afọ 2004. Tụkwasị na nke a n'afọ 2007, ọ gara n'ihu n'agụmakwụkwọ ya ma nye ya asambodo na Iwu (Administrative Officers Law Course) site na Law Development Centre, Kampala.[1]

Ahụmahụ ọrụ tupu ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

N'agbata afọ 2006 na afọ 2014, Agnes rụrụ ọrụ dị ka onye ọrụ mmepe obodo na Bugiri District Local Government ma mesịa bụrụ onye isi ọrụ mmepe ọha na eze na Bugiri Town Council ma rụọ ọrụ site na afọ 2014 ruo 2015. Site na 2010 ruo 2012, e mechara họpụta ya dị ka onye isi oche nke Bugiri District Local Government.[1] Ọ na-eduzi Taaka Agnes Wejuli Development Foundation.[5]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Site na afọ pụkụ abụọ na iri na ruo taa, ọ rụrụ ọrụ dị ka nwanyị omebe iwu maka mpaghara Bugiri.[1][6] N'oge ọ na-eje ozi dị ka onye omeiwu na Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda, Agnes jere ozi ọzọ dị ka Kọmitii Ọrụ Ugbo. Ihe omume ntụrụndụ ya bụ Netball, na Dancing; ọ nwekwara mmasị pụrụ iche n'ịduzi ezinụlọ ndị ogbenye, otu obodo na ndị ntorobịa.[1] Ọ sonyeere Uganda Women Parliamentary Association (UWOPA) na 10th parliament.[7] Na Uganda Women Parliamentary Association (UWOPA), ọ na-eje ozi na kọmitii nke Iwu Ọrụ / Ikike Nkwado Akụ na ụba nke bụ mmekorita ya na Civil Society dị ka usoro maka iduzi nkwado na ntụziaka anọ dị mkpa.[8]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta nke ndị otu nke iri na otu nke Uganda
  • Ndepụta nke ndị otu nke iri nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda
  • Ndepụta nke ndị otu nke itoolu nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda
  • Ógbè Bugiri
  • National Resistance Movement
  • Onye omeiwu
  • Nzukọ omeiwu nke Uganda

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-30. Retrieved on 2021-03-26.
  2. Supporting the Parliament of Uganda to uphold equality and non-discrimination - Office of the High commissioner for Human Rights. uganda.ohchr.org. Archived from the original on 2021-06-15. Retrieved on 2021-03-26.
  3. List of MPs who have been declared winners so far (en). Daily Monitor. Retrieved on 2021-03-26.
  4. Agnes Taaka Wejuli Archives (en-US). The Independent Uganda. Retrieved on 2021-03-26.
  5. Kadaga asks President to fulfill pledges (en-US). PML Daily. Retrieved on 2021-03-26.
  6. Taaka Agnes - 2021 General Election - Visible Polls (en). visiblepolls.org. Retrieved on 2021-03-26.
  7. Members of UWOPA of 10th Parliament | Uganda Women Parliamentary Association. uwopa.or.ug. Archived from the original on 2021-04-18. Retrieved on 2021-03-26.
  8. Uwopa Round Table Committees | Uganda Women Parliamentary Association. uwopa.or.ug. Archived from the original on 2021-04-18. Retrieved on 2021-03-26.