Ahmed Gomaa Ahmed Radwan

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ahmed Gomaa Ahmed Radwan
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịEgypt Dezie
Asụsụ obodoArabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụọkà mmụta sayensị, injinia, professor Dezie
onye were ọrụCairo University Dezie
Onye òtù nkeInstitute of Electrical and Electronics Engineers Dezie
Ihe nriteFellow of the African Academy of Sciences Dezie

Ahmed Gomaa Ahmed Radwan bụ ọkammụta si mba Ijipt na ngalaba Engineering Technology & Applied Sciences na isi ọmụmụ injinia na Mahadum Cairo, Ijipt. Ọ bụ onye òtù a họpụtara na African Academy of Sciences, onye isi n'òtù Institute of Electrical and Electronics Engineers. Ọ bụbu onye ntụzi aka na ụlọ ọrụ Nanoelectronics Integrated Systems Center nke Mahadum Nile, na onye isi ụlọ ọrụ nka maka mmepe ọrụ (TCCD), Mahadum Cairo. [1][2] Ọ bụ ugbu a onye isi oche nwa oge nke nnyocha na ọrụ nkwado, Mahadum Nile, Ijipt.[3]

Agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ahmed Gomaa Ahmed Radwan gara Mahadum Cairo site na nzere B.Sc ruo ọkwa PhD ya. Ọ nwetara nzere B.Sc na Electronics Communications n'afọ 1997. Ka afọ abụọ gasịrị, ọ gbakwunyere diploma na Engineering Mathematics (1999) wee gụchaa ma nweta nzere M.Sc na Engineering Mathematics n'afọ 2002. Ọ nwetara akara mmụta doctorate na Engineering Mathematics n'afọ 2006. [3]

Ihe nrite na òtù Ndị O sogasị na ha[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2003, ọ ritere ihe nrite ederede ndị na-eme Master kacha mma (2001-2004) na ngalaba Engineering na Mahadum Cairo, Ijipt.[3] Na 2011, o ritere ihe nrite akwụkwọ nke abụọ kacha mma na ọgbakọ mba ụwa nke microelectronics (ICM) na Tunis.[3] N'afọ 2012, e nyere ya onye òtù gbagotere na IEEE.[3] N'otu afọ ahụ, e nyere ya ihe nrite onye mere ihe ahụrụ anya nke steeti.[1] N'afọ 2013, o ritere nturu ugo Physical Science Award na asọmpi afọ 2013 bụ International Publishing Competition nke Misr El-Khair Institution [3] N'otu afọ ahụ, ọ ritere ihe nrite mmezu nke Mahadum Cairo,[1] N'afọ 2014, ahọpụtara ya dị ka onye so na kansụl sayensị mbụ nke Egypt Center for the Advancement of Science, Technology and Innovation (ECASTI). N'afọ 2016, o ritere nturu ugo Prof. Mohamed Amin Lotfy.[1] N'afọ 2018, o nwetara akara ugo ógó mbụ na mmụta sayensị na nka nke steeti, abịa n'afọ 2019, ọ nata akara ugo mmụta steeti kacha mma ma nwetakwa Scopus Award na ngalaba Injinia na na Teknụzụ.Àtụ:Cn

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Ahmed Gomaa Ahmed Radwan | The AAS. Archived from the original on 2021-02-19. Retrieved on 2023-12-04.
  2. Institute of Electrical and Electronics Engineers.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 3.5 Ahmed Gomaa Ahmed Radwan.