Ahmed Mohamed El Hassan

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ahmed Mohamed El Hassan
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịSudan Dezie
Aha ọmụmụAhmed Mohamed El Hassan, أحمد محمد الحسن Dezie
Aha enyereAhmad, Ahmed Dezie
aha ezinụlọ yaAlhassan Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya10 Eprel 1930 Dezie
Ebe ọmụmụBerber Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya10 Novemba 2022 Dezie
Ebe ọ nwụrụKhartoum Dezie
Asụsụ obodoArabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Bekee Dezie
Asụsụ ọ na-edeArabic, Bekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụphysician, pathologist, minister, Odee akwụkwọ Dezie
onye were ọrụKing Faisal University, University of Khartoum, University of Khartoum Faculty of Medicine, Ahfad University for Women Dezie
Ọkwá o jiMinister of Higher Education and Scientific Research Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Khartoum, University of London, University of Edinburgh Dezie

Ahmed Mohamed El Hassan FRCP FTWAS (Àtụ:Lang-ar; 10 Eprel 1930 – 10 Nọvemba 2022) bụ Ọkammụta si mba Sudan n'isi ọmụmụ pathology.

A mụrụ El Hassan ma zụlite ya na Berber, Sudan. Ọ nwetara ọtụtụ ọzụzụ n'isi ọmụmụ ahụike ya na Mahadum Khartoum tupu ọ gụchaa ma nweta nzere PhD ya na Mahadum Edinburgh n'afọ 1965. Mgbe ọ laghachiri Sudan, O duru ngalaba Pathology (1966–1969) nakwa Faculty of Medicine, Kitchener School of Medicine (1969–1971) tupu o duo nwa nkenke oge Àtụ:Ill (1971–1972). Ọ ghọrọ onye isi oche nke Medical Research Council (1972-1977), mgbe ọ na-enye aka iguzobe Ngalaba Pathology na Mahadum King Faisal, Saudi Arabia na Institute of Medical Laboratory Technology, Sudan. Na mgbakwunye, El Hassan bụụrụ onye isi ntọala nke Institute of Endemic Diseases (1993-2000), Sudanese National Academy of Sciences (SNAS) (2005-2011) na Sudanese Cancer Society (2008-2009).

El Hassan lekwasịrị anya na epidemiology na immunopathology nke ọrịa okpomọkụ na ọrịa na-efe efe. N'ihi nke a, Sudan nyere ya nkwanye ùgwù kachasị elu bụ Order of merit, na ụlọ ọgwụ ọrịa okpomọkụ nke steeti Sudan bụ Al Qadarif ka a kpọkwasịrị aha ya. Na mgbakwunye, ọ natara ihe nrite [[w:World Health Organisation|WHO] nke afọ 1987 bụ Shousha Prize, RSTMH n'afọ 1996, Donald Mackay Medal, n'afọ 2017 – 2018 na Sheikh Hamdan bin Mohammed Al Maktoum.

Ndụ na Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Mmalite Ndụ na Agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ El Hassan na Berber, Sudan, na 10 Eprel 1930.[1][2] Dị ka ọtụtụ ndị n'oge ahụ, ọ malitere akwụkwọ ya n'ụlọ akwụkwọ Quran (Khalwa) tupu ọ banye Berber Intermediate School. O mechara kwaga Khartoum iji sonyere Omdurman Secondary School n'afọ 1945.[3] El Hassan gara Kitchener School of Medicine (bụzi ngalaba Medicine, Mahadum Khartoum ugbua).[4] Ọ gụsịrị akwụkwọ nweta nzere ọpụrụiche n'isi ọmụmụ ọgwụ na ịwa ahụ n'afọ 1955 mgbe ọ na-enweta ihe nrite Kitchener Ihe nrite ncheta maka ndị gụsịrị akwụkwọ mahadum nzere ha kacha mma.[3] O sonyeere Ministri Ahụike Sudan maka ọzụzụ, malite dị ka onye dọkịnta gụchara akwụkwọ ọhụrụ n'etiti 1955 na 1957, na onye ọrụ ahụike site n'afọ 1957 ruo 1958 n'ebe dị iche iche na Khartoum, Omdurman na Northern State. Ọ laghachiri na ngalaba Pathology, Mahadum Khartoum dịka onye enyemaka nnyocha.[5][6]

El Hassan gara n'ihu n'ọzụzụ ya na Mahadum London wee nweta nzere diploma n'isi ọmụmụ Clinical Pathology (DCP) n'afọ 1961.[3] Ọ laghachiri na Mahadum Khartoum maka nw'obere oge (1962–1963) dị ka onye nkuzi tupu ọ malite ịchụ nzere doctor of philosophy n'isi ọmụmụ Immunology na Mahadum Edinburgh, nke ọ dechara n'afọ 1965.[7][8]

Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ahịrị mbụ site n'aka ekpe, Mansour Haseeb, HV Morgan na Mohamed Hamad Satti Ahịrị nke abụọ, aka ekpe, El Hassan. ca. 1965

El Hassan laghachiri na Ngalaba Pathology, Mahadum Khartoum dịka onye isi nkuzi tupu ọ ghọọ ọkammụta na onye isi ngalaba ahụ n'afọ 1966.[1] N'afọ 1969, e mere El Hassan ka ọ bụrụ Dean, Ngalaba Ọmụmụ Ọgwụ na osote onyeisi mahadum ahụ.[9][10] El Hassan bụụrụ Minista ntọala nke agụmakwụkwọ dị elu na nnyocha sayensị, Sudan, n'etiti 1971 na 1972, mgbe nke ahụ gasịrị, ọ ghọrọ onye isi oche nke Kansụl Nnyocha (1972-1977). El Hassan sonyeziri Mahadum King Faisal, Saudi Arabia, dị ka ọkammụta n'afọ 1977 wee nye aka guzobe Ngalaba Pathology tupu ọ pụọ n'afọ 1979, ịlaghachi n'afọ 1981 dịka onye nduzi nyocha na Mahadum ahụ ruo afọ 1987.[11][12] N'agbata 1979-1980, El Hassan nọọrọ na Sudan dị ka onye nduzi nke Tropical Diseases Institute, ma guzobe Institute of Medical Laboratory Technology.[1] Mgbe o si Saudi Arabia lọta n'afọ 1988, ọ gara n'ihu na-arụ ọrụ na ngalaba Pathology, ngalaba ọmụmụ ọgwụ, Mahadum Khartoum.[6][10] El Hassan bụụrụ onye nhazi ntọala nke Institute of Endemic Diseases n'etiti afọ 1993 na afọ 2000, wee gaa n'ihu na njikọ ya na ụlọ ọrụ ahụ dị ka ọkammụta Pathology larala ezumike ruo mgbe ọ nwụrụ n'afọ 2022.[13] El Hassan bụụrụ onye isi ntọala nke Sudanese National Academy of Sciences (SNAS) n'afọ 2005, bụrụkwa onye isi oche nke Sudan Cancer Society n'etiti afọ 2008 na 2009.[4][5]

El Hassan bụụrụ Ọkammụta nleta na Mahadum London, Mahadum Copenhagen, Mahadum Ahfad maka ụmụ nwanyị, na Mahadum Ọktoba 6.[1][3] O so na Kọmitii ndị Ndụmọdụ Nnyocha nke World Health Organisation (WHO), strokes na Kọmitii ndị Ndụmọdụ Sayensị na NkànỤzụ nke Nnyocha Ọrịa Tropical, WHO.[3]

Nnyocha Ndị O Mere[dezie | dezie ebe o si]

El Hassan lekwasịrị anya na epidemiology na immunopathology nke ọrịa okpomọkụ na ọrịa na-efe efe, karịsịa leishmaniasis[14][15] na mycetoma,[16] gụnyere nchọpụta, ọgwụgwọ na ọgwụ mgbochi.[17][18] Nnyocha ya lebakwara anya n'ọrịa ekpenta na iba, ma mgbe afọ 2005 gachara, ọ tụgharịrị anya ya tinye ya na nasopharyngeal cancer. O nwetara enyemaka maka nyocha n'ụdị ego n'aka World Health Organisation's Tropical Disease Research, Wellcome Trust, Danish International Development Agency, na The World Academy of Sciences.[3]

Ihe Nrite na Nkwanye ùgwù Ya[dezie | dezie ebe o si]

Gọọmenti Sudan nyere El Hassan ihe nrite ọla edo maka nyocha na sayensị n'afọ 1977, El Neelain Order (Klas nke mbụ) n'afọ 1979, na Order of Merit (Klas nke mbụ) n'afọ 1995.[3][1] O nwetara nzere Honorary Doctor of Science site na Mahadum Ahfad maka ụmụnwaanyị n'afọ 2006.[13] Okammụta Ahmed Mohamed El-Hassan Center for Tropical Medicine na Doka, Al Qadarif State,[19] na EL Hassan Centre for Neglected Tropical Diseases Clinical Trials Research na Soba, Khartoum [20][21] ka akpọrọ aha ya na 2010 na 2016, n'otu n'otu.

A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye òtù Royal College of Pathologists, London (FRCPath) n'afọ 1964, onye òtù Royal College of Physicians, London (FRCP) n'afọ 1974, [22] na onye òtù World Academy of Sciences (FTWAS) n'afọ 1996.[23] O nwetara ihe nrite Shousha Prize n'aka Òtù Ahụ Ike Ụwa n'afọ 1987,[24] Donald Mackay Medal sitere na Royal Society of Tropical Medicine and Hygiene n'afọ 1996,[25] na Sheikh Hamdan bin Mohammed Al Maktoum Award for Medical Sciences n'afọ 2017-2018.[10]

Ndụ Onwe Onye na Ọnwụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

El Hassan lụrụ Amal Galal Mohamed n'afọ 1959, ha wee mụọ ụmụ nwanyị anọ.[5] O nwere mmasị dị ukwuu n'ise foto na egwú. O hiwere òtù Medical Photography na Medical Illustration nke mbụ na Sudan. Ọ mụtara ịkpọ ngwá egwú oud wee bipụta akwụkwọ ya Writings on Medicine, Music and Literature n'afọ 2017.[2][3]

El Hassan nwụrụ na 10 Nọvemba 2022 n'ụlọ ya na Al Riyadh, Khartoum site na ihe mkpatara osinachi.[4][8]

Akwụkwọ Ndị O Bipụtara Ahọpụtara[dezie | dezie ebe o si]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Ahmed Elhassan | Naanị saịtị UofK ọzọ. Archived from the original on 2022-11-27. Retrieved on 2023-12-23.
  2. 2.0 2.1 Àtụ:Cite webụ
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 3.5 3.6 3.7 Ahmed El Safi. Ahmed Mohamed El Hassan: Ihe ịrịba ama na ọrịa okpomọkụ, ọrịa ọrịa, nchọpụta ọrịa cancer na mmụta ahụike. ISBN 978-1096419341. 
  4. 4.0 4.1 4.2 Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified (2022-11 -10).
  5. 5.0 5.1 5.2 [https:// www.snas.org.sd/index.php/news-events News & Events].
  6. 6.0 6.1 Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified (ar).
  7. Ahmed Mohamed El Hassan.
  8. 8.0 8.1 Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  9. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  10. 10.0 10.1 10.2 Prof. Ahmed M El Hassan - Sheikh Hamdan Bin Rashid Al Maktoum Award for Medical Sciences - HMA. Archived from the original on 2022-12-02. Retrieved on 2023-12-23.
  11. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named : 3
  12. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  13. 13.0 13.1 Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named : 0
  14. "{{{title}}}". Ọrịa na-efe efe nke Lancet. DOI:10.1016/S1473-3099(03)00517-6. ISSN 1473-3099. PMID 125 ohere-ụbọchị = 20 Nọvemba 2022. 
  15. "{{{title}}}". The Journal of Clinical Investigation. ISSN 0021-9738. PMID 8326000. 
  16. (2014) "Ihe nlere ohuru maka njikwa mycetoma na Sudan". PLOS Lelected Tropical Diseases. DOI:10.1371/journal.pntd.0003271. ISSN 1935-2735. PMID 25356640. 
  17. "{{{title}}}". New England Journal of Medicine. DOI:10.1056/13715. PMID 27332904. 
  18. (1994-12-01) "[https. ://doi.org/10.4269/ajtmh.1994.51.826 Endemic kala-azar n’ebe ọwụwa anyanwụ Sudan: ọmụmụ ogologo oge gbasara ọrịa nke ụlọ ọgwụ na nke subclinical na post-kala-azar dermal leishmaniasis]". The American Journal of Tropical Medicine and Hygiene. DOI:issn=1476-1645 10.4269/ajtmh.1994.51.8 issn=1476-1645. PMID 7810819. 
  19. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  20. EL Hassan Center maka Nleghara Ọrịa Tropical Diseases Nchọpụta nyocha ụlọ ọgwụ..
  21. Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:Citation/CS1/Suggestions' not found.
  22. Àtụ:Cite webụ
  23. el-hassan-ahmed-mohamed El Hassan, Ahmed Mohamed.
  24. WHO | Ihe nrite na ihe nrite ahụike ọha.
  25. { {Cite webụ |title=Medal Donald Mackay | RSTMH |url=https://rstmh.org/medals-awards/donald-mackay-medal |access-date=2022-11-20 |website=rstmh. org | Archive-date=20 Nọvemba 2022 |archive-url=https://web.archive.org/web/20221120175624/https://rstmh.org/medals-awards/donald-mackay-medal |url-status= live }}

Ịgụrụ Gawa[dezie | dezie ebe o si]

Ahmed El Safi. Ahmed Mohamed El Hassan: Milestones in tropical disease, pathology, cancer research & medical education, Sudan Medical Heritage Foundation Publications (2008), Àtụ:ISBN.


Njikọ Mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Portal bar