Aisha Rateb
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Egypt |
| Aha n'asụsụ obodo | عائشة راتب |
| Aha enyere | A'isha |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 22 Febụwarị 1928 |
| Ebe ọmụmụ | القاهرة |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 4 Mee 2013 |
| Ebe ọ nwụrụ | الجيزه |
| Ụdị ọnwụ | eke na-akpata |
| Ihe kpatara ọnwụ | cardiovascular disease |
| Asụsụ obodo | Egyptian Arabic |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic, Egyptian Arabic |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye ọka iwu, diplomat, odee akwụkwọ |
| Onye were ọrụ | Cairo University |
| Ọkwá o ji | ambassador of Egypt to Denmark, ambassador of Egypt to Germany |
| Ebe agụmakwụkwọ | Cairo University |
Aisha Rateb (February 22, na afọ 1928, May 4, na afọ 2013) bụ onye ọka iwu Ijipt, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na nwanyị mbụ bụ onye nnọchi anya Ijipt. Ọ bụkwa Onye Ọkachamara nke iwu mba ụwa na Mahadum Cairo .[1]
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Rateb na Cairo n'ezinụlọ gụrụ akwụkwọ.[2]
Agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]Mgbe ọ gara kọleji, ọ malitere ịmụ akwụkwọ na Mahadum Cairo, mana ọ gbanwere na iwu mgbe naanị otu izu nke ọmụmụ gasịrị.[2] Rateb gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Cairo na afọ 1949, gara Paris obere oge maka agụmakwụkwọ ọzọ wee nweta PhD ya na iwu na afọ 1955.[2]
Rateb tinyere akwụkwọ ka ọ bụrụ onye ọka ikpe na Conseil de'Etat (ụlọ ikpe kachasị elu n'Ijipt) na afọ 1949, a jụrụ ya n'ihi okike ya.[3] Praịm minista nke oge ahụ, Hussein Serry Pasha, kwuru na inwe nwanyị ọkàikpe bụ "megidere omenala nke ọha mmadụ".[2] Ọ gbara gọọmentị akwụkwọ n'ihi na e mebiri ikike iwu ya.[4] Ikpe ya bụ nke mbụ n'ụdị ya n'Ijipt, mgbe ọ meriri ikpe ahụ, onye isi nke State Council, Abdel-Razek al-Sanhouri, nabatara ya, na ọ meriri naanị n'ihi ihe ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ọdịbendị, ọ bụghị dabere na iwu Ijipt ma ọ bụ Sharia.[5][6] Ikpe ahụ na echiche edere nke al-Sanhouri gbara ụmụ nwanyị ndị ọzọ ume ịgbaso ya, ọ bụ ezie na ọ dịghị onye ghọrọ ndị ọka ikpe ruo n'afọ 2003, mgbe a họpụtara Tahani al-Gebali dị ka onye ọka ikpe.[7] N'afọ 2010, praịm minista Ijipt nyere iwu ka a nyochaa mkpebi e mere n'oge na-adịbeghị anya megide ikwe ka ụmụ nwanyị bụrụ ndị ọkàikpe.[8] N'ọnwa Julaị, afọ 2015, e mechara ṅụọ iyi ụmụ nwanyị iri abụọ na isii dị ka ndị ọkàikpe.[6]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
[dezie | dezie ebe o si]Rateb so na Central Committee nke Arab Socialist Union na afọ 1971, ebe o nyere aka dee iwu ọhụrụ maka Ijipt.[2] N'ime ndị otu kọmitii niile, ọ bụ naanị ya megidere "ike pụrụ iche nke Iwu nyere onye isi ala nke oge ahụ Anwar al-Sadat".[2]
Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista nke Inshọransị na Mmekọrịta Ọha site na afo 1974 ruo na afọ 1977, ọ bụkwa nwanyị nke abụọ nwere ọkwa ahụ.[9] N'oge ọ nọ n'ebe ahụ, o nwere ike ime mgbanwe maka ụmụ nwanyị na mba ahụ. Rateb nwere ike ime nke a ọbụlagodi mgbe ndị Sheikh na-akwado okpukpe gbalịrị imebi aha ya.[10] Rateb gara n'ihu na-etinye ihe mgbochi na ịlụ karịa otu nwanyị ma hụ na ịgba alụkwaghịm bụ naanị iwu ma ọ bụrụ na onye ọka ikpe hụrụ ya. Ọ rụkwara ọrụ iji nyere ndị dara ogbenye aka, ma mee iwu iji nyere ndị nwere nkwarụ aka were ha n'ọrụ.[2] Mgbe gọọmentị wepụrụ enyemaka maka ihe ndị dị mkpa, nke ga-emetụta ụmụ amaala kacha daa ogbenye n'Ijipt, ọ gbara arụkwaghịm na afọ 1977 n'oge nnupụisi achịcha.[2]
N'afọ 1979, a họpụtara Rateb dị ka nwanyị mbụ bụ onye nnọchi anya Ijipt.[11] Dị ka onye nnọchi anya, ọ duziri Ijipt na "ọnọdụ dị mma n'ụwa nke mmekọrịta mba ụwa dị iche iche".[9] Ọ bụ onye nnọchi anya na Denmark site na afọ 1979 ruo na afọ 1981 na Federal Republic of Germany site na afọ 1981 ruo na afọ 1984.[1]
Rateb katọrọ onye bụbu onye isi ala Ijipt bụ Hosni Mubarak n'ihi na o chere na ọchịchị ya mepụtara nkewa dị ukwuu n'etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye.[9]
Ọnwụ
[dezie | dezie ebe o si]Rateb nwụrụ na Giza mgbe obi kwụsịrị na mberede na afọ 2013.
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Ụmụ nwanyị ndị ọka iwu mbụ gburugburu ụwa
Ebenside
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- 1 2 3 4 5 6 7 8 Reda, Angele (24 May 2013). "Aisha Rateb (1928-2013)". Watani. Retrieved 15 September 2015.
- ↑ Hatem, Mervat F. (1994). "Privatization and the Demise of State Feminism in Egypt". Mortgaging Women's Lives: Feminist Critiques of Structural Adjustment. United Nations. pp. 41. ISBN 1856491013.
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Elbendary, Amina (January 2003). "Women On the Bench". Al-Ahram (620). Retrieved 15 September 2015.
- 1 2 Messieh, Nancy (22 July 2015). "A Win for Women in Egypt's Courts". Atlantic Council. Retrieved 15 September 2015.
- ↑ Khalil, Ashraf (23 September 2003). "Egypt's First Female Judge May Remain 'The Only'". Women's eNews. Retrieved 15 September 2015.
- ↑ Kenyon, Peter (3 April 2010). "Female Judges In Egypt Battle Against Old Ideas". NPR. Retrieved 15 September 2015.
- 1 2 3 Sami, Aziza (9 May 2013). "Obituary: Aisha Rateb (1928-2013) Women's Struggle: One Champion Down". Al-Ahram Weekly (1147). Retrieved 15 September 2015.
- ↑ Sadat, Jehan (1987). A Woman of Egypt. New York: Simon & Schuster. pp. 360. ISBN 0743237080.
- ↑ Sullivan, Earl L. (1986). Women in Egyptian Public Life. Syracuse, New York: Syracuse University Press. pp. 82. ISBN 0815623542.