Akothee

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Esther Akoth
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịKenya Dezie
Aha enyereEsther Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya8 Eprel 1980 Dezie
Ebe ọmụmụMigori Dezie
Asụsụ obodoSwahili Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, onye egwu Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2008 Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie
Esther Akoth

Esther Akoth (amụrụ na 8 Eprel 1983), nke a maara nke ọma dị ka Akothee, bụ onye egwu na onye ọchụnta ego Kenya.[1] Ọ bụ onye guzobere Akothee Safaris, ụlọ ọrụ njem nleta nke dị na Kenya, Akothee Foundation, otu na-arụ ọrụ ebere, na Aknotela na Akothee Homes, azụmahịa ụlọ.[2]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Akoth na 1983 na Kisumu County, ọ bụ nwa nwanyị nke nna onye nchịkwa na nne onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, o toro na Migori County.[1] Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị ụmụ nwanyị Nyabisawa, mana ọ hapụrụ mgbe ọ dị afọ iri na anọ ka ya na di ya gbapụ.[1][3]

Ọrụ egwu[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ egwu Akoth malitere n'afọ 2008.[4] Kemgbe ahụ, ọ wepụtala egwu ọ gụrụ naanị ya nakwa ndị o gụrụ na mmekorita ya na ndị ọzọ na-eti egwu nke gụnyere Diamond Platnumz. Egwú ndị ọ wepụtara gụnyere "Oyoyo" nke gosipụtara MC Galaxy, "Give It To Me" nke gosiputara Flavour, "Sweet Love" nke gosiputara Diamond Platnumz, "Benefactor", "Yuko Moyoni", "New Dance" nke gosiputsara Oc, "Osilliation", "Nimechoka", "Pashe", "Katika", "Djele Djele", "Shengerera", "Mama Bougerie", na "Tuchechecheche". Na Machị 2020, Akoth wepụtara "Mwitu asa", abụ edere ma bụọ n'asụsụ Kamba.[1][5]

Onyinye[dezie | dezie ebe o si]

O ritere ọtụtụ ihe nrite, gụnyere "Best Female Artist (East Africa) " na African Muzik Magazine Awards na 2016 na 2019, "Best Video" na African Muzin Magazine Awards na 2016, na "Best Fadies Artist" na African Entertainment Awards USA.[1]

Akoth nwere ihe karịrị otu nde ndị na-eso ụzọ na Instagram, ọ bụkwa ugbu a onye nke iri na otu kachasị soro ndị ama ama n'Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka.[6][7][8]

Ọrụ azụmahịa[dezie | dezie ebe o si]

Akoth guzobere Akothee Safaris, ụlọ ọrụ njem nke dị na Nairobi, Kenya, ma họpụta nwa ya nwanyị dị ka onye nduzi ụlọ ọrụ ahụ.[1] O guzobekwara ọrụ ebere a na-akpọ Akothee Foundation, ma na-elekọta ụlọ ọrụ na-ere ụlọ na ala, Aknotela na Akothee Homes.[4]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Akoth nwere ụmụ ise, ụmụ nwanyị atọ na ụmụ nwoke abụọ.[3][4] O nwere ụlọ na Mombasa, Migori County, na Zurich.[1]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 1.6 Taji (21 August 2018). Akothee biography: husband, family and house. Tuko.co.ke. Retrieved on 13 January 2022.
  2. Nyanga. Controversial Kenyan singer Akothee's secrets: Owning houses worth Sh 300 million and rolling in choppers. Standard Digital News. Retrieved on 16 April 2019.
  3. 3.0 3.1 Okoth (12 August 2015). WCW: 9 things you didn't know about Akothee, 8 is interesting. Citizentv.co.ke. Retrieved on 13 January 2022.
  4. 4.0 4.1 4.2 Thomas (2020-04-30). Akothee Biography, Net Worth – Age, Career, Songs, Family and Husband (en-GB). The East African Feed. Retrieved on 2021-11-12.
  5. Mwangangi (2020-03-05). Akothee wows fans with new Kamba song Mwiitu Asa (en-US). Mauvoo News. Retrieved on 2020-03-08.
  6. Akinyi (23 January 2019). The money shot: Most followed East African celebs on Instagram 2019. Mpasho News. Retrieved on 16 April 2019.
  7. Mwarua (8 April 2019). Akothee claims she is now saved, promises she will not change raunchy wardrobe. Tuko.co.ke – Kenya news.. Retrieved on 16 April 2019.
  8. Nyasio (18 February 2019). Akothee leaves fans speechless after spreading legs wide open while on stage. Tuko.co.ke – Kenya news.. Retrieved on 16 April 2019.