Alcinda Abreu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Alcinda Abreu na 2010
Alcinda Abreu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịMozambique Dezie
Aha enyereAlcinda Dezie
aha ezinụlọ yaAbreu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya13 Ọktoba 1953 Dezie
Ebe ọmụmụBuzi District Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of Foreign Affairs, Minister of Environment, Member of the Council of State of Mozambique, Member of the Assembly of the Republic Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity College London Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịFRELIMO Dezie

Alcinda António de Abreu (amụrụ n'afọ 1953) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Mozambik. Ọ bụ Minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi nke Mozambique site n'afọ 2005 ruo n'afọ 2008, ebe ọ bụbu Minista na na-ahụ Maka ọdịmma ọha na eze. N'oge na-adịghị anya, ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista na-ahụ maka gburugburu ebe obibi. Ọ na-arụ ọrụ iji mụba ọrụ ụmụ nwanyị na mgbanwe ihu igwe.

Ndụ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Alcinda António de Abreu na afọ 1953 na Mozambique.[1] Ọ na-arụsi ọrụ ike na Mozambique Youth Association ma jee ozi dị ka osote odeakwụkwọ ukwu ya na ngwụcha afọ 1970 na mmalite afọ 1980. Abreu bụ Minista nke Ọdịmma Ọha site na afo 1994 ruo n'afọ 1997. FRELIMO họpụtara Abreu dị ka onye otu National Elections Commissions (CNEs) nke na-ahụ maka ịhazi ntuli aka ime obodo nke afọ 1998 na ntuli aka afọ 1999 . Na nnọkọ FRELIMO nke afọ 2002, a họpụtara ya na Kọmitii ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mmadụ iri na ise.[2]

Onye isi ala Armando Guebuza họpụtara ya dị ka Minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ọzọ na Febụwarị 3, na afọ 2005, mgbe Guebuza kpọrọ gọọmentị ọhụrụ ya obere oge ka ọ banyere n'ọkwa.[3] Ka e mesịrị n'afọ ahụ, ọ gara leta José Manuel Barroso, Onye isi oche nke European Commission.[4]

Mgbe a gbanwere ọchịchị na Machị 10, na afọ 2008, e weghachiri ya n'ọkwa Minista nke Gburugburu Ebe Obibi; a ṅụrụ ya iyi n'ime ụbọchị 17 ka e mesịrị na ọnwa Machị 27.[5][6][5] O nyere iwu atụmatụ mba maka mmetụta mgbanwe ihu igwe na ụmụ nwanyị nọ na Mozambique, oge mbụ e chepụtara atụmatụ dị otú ahụ n'ebe ọ bụla n'ụwa.[7] Ọ kọwara na ọ dị mkpa ka ọha mmadụ gbanwee atụmatụ ha iji kwe ka ụmụ nwanyị nọ n'ime ime obodo tinye aka na ọrụ mgbanwe ihu igwe, n'ihi mmetụta nke a nwere na ọrụ ugbo.[8]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. The Hon Alcinda António de Abreu. World Parks Congress. Archived from the original on September 28, 2014. Retrieved on 4 November 2016.
  2. "President Guebuza appoints his government", Mozambique News Agency, February 16, 2005. Retrieved on November 4, 2016.
  3. Chale. "Guebuza names cabinet to fight poverty", IOL, February 4, 2005. Retrieved on November 4, 2016.
  4. Visit by Alcinda Abreu, Mozambican Minister of Foreign Affairs and Co-operation, to the EC. European Commission (11 April 2005). Retrieved on 4 November 2016.
  5. 5.0 5.1 "President undertakes major reshuffle", Mozambique News Agency, April 21, 2008. Retrieved on November 4, 2016.
  6. "Moz president 'does it again'", IOL, March 11, 2008. Retrieved on November 4, 2016.
  7. Seager. "Eye of the Storm", The Daily Beast, 11 April 2011. Retrieved on 4 November 2016.
  8. Phakathi. "Las mujeres rurales de Kenia tienen una embajadora en Doha", EuroXpress, 29 November 2012. Retrieved on November 4, 2016.