Amanda Dlamini

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Amanda Dlamini
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha enyereAmanda Dezie
aha ezinụlọ yaDlamini Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Julaị 1988 Dezie
Ebe ọmụmụHarding Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheetiti etiti Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Johannesburg Dezie
onye nsonye òtù egwuregwuDurban Ladies F.C., South Africa women's national association football team Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
so na2012 Summer Olympics, football at the 2016 Summer Olympics Dezie

Amanda Sinegugu Dlamini (amụrụ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Julaị afọ 1988) bụbu onye egwuregwu bọọlụ South Africa . Ọ gbara bọọlụ na JVW FC dị ka onye egwuregwu n'anọ n'etiti. Ọ nọchitere anya otu ụmụ nwanyị South Africa na 2012 na 2016 Summer Olympics .

Mmalite ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ Dlamini na Harding na KwaZulu Natal . Ọ malitere ịgba bọọlụ n'afọ 1999 maka otu ụmụ nwoke, akpọrọ Young Callies .[1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Otu Klọb[dezie | dezie ebe o si]

Na ọkwa klọb, Dlamini agbarala Durban Ladies na Mahadum Johannesburg bọọlụ. Dlamini na-agbara JVW FC bọọlụ ugbu a ma soro n'otu ndị meriri na Sasol League Championship nke afọ 2019 .[2]

Nke Mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Ọ gbara egwuregwu mbụ ya nke ndị otu sịniọ nke mba n'afọ 2007 na mmeri ọkpụ ise anaasataghị otu nke Naịjirịa na asọmpi Olympic. O nyere goolu mbụ ya na mba Netherlands.[1] Ọ bụ onye kachasị nye goolu na egwuregwu Sasol Women's League nke afọ 2008 . O so na ndị otu meriri ọla nchara na ọla ọcha na African Women's Championship nke afọ 2010 na African Women's Championship nke afọ 2012; na asọmpi 2010, a kpọrọ ya onye otu egwuregwu kacha naa uru bụ Most Valuable Player . Ọ bụ onye isi ndị otu mba ahụ n'agbata afọ 2011 na afọ 2013.[2]

Ọ ghọrọ nwanyị bọọlụ nke ise meriri otu narị iko nyere South Africa site n'egwuregwu enyi na enyi megide United States na July 2016, na-esote Janine van Wyk, Nompumelelo Nyandeni, Portia Modise na Noko Matlou . Tupu egwuregwu ahụ, o kwuru "Ọ bụ nrọ m mgbe niile isonye n'egwuregwu nke otu mba, ọ dịtụbeghị mgbe m chọrọ ime ihe ọ bụla ọzọ ma e wezụga igba bọọlụ. Abụ m ihe m bụ taa n'ihi egwuregwu ahụ. Enweela m ọtụtụ ihe n'egwuregwu ahụ ma ịhụ onwe m na nweta okpu otu narị na-eme ka m nwee mmetụta uche. " N'otu egwuregwu ahụ, onye na-eche goolu America bụ Hope Solo meriri okpu nke otu narị ya nke United States.[3]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2012, ọ tọrọ hiwere Amanda Dlamini Girls Foundation na-nzube inye ụmụ agbọghọ nọ n'ime ime obodo enyemaka.[4] Ọ bụzi onye nyocha bọọlụ na Supersport. N'ọnwa Julaị afọ 2021, a họpụtara ya dị ka onye isi njikwa azụmahịa na ahịa nke South African Football Association (SAFA)[5]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Moreotsene. "Amanda inspires Banyana", The New Age, 7 October 2011. Retrieved on 18 November 2016.
  2. 2.0 2.1 Sasol Banyana Banyana Player Profiles. South African Football Association (17 May 2014). Archived from the original on 19 May 2014. Retrieved on 18 November 2016.
  3. Amanda Dlamini closes in on a century of appearances. South African Football Association (8 July 2016). Retrieved on 18 November 2016.
  4. Amanda Dlamini wants to inspire youth through football. Sasol in Sport (11 June 2013). Archived from the original on 18 November 2016. Retrieved on 18 November 2016.
  5. Amanda Dlamini: Ex-Banyana Banyana captain appointed SAFA Senior Manager. Kick Off (2021-07-14). Archived from the original on 2021-11-06. Retrieved on 2021-11-06.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Amanda Dlamini – FIFA competition record (archived)

Àtụ:South Africa squad 2010 African Women's Championship