Jump to content

Anna, Ohio

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Àtụ:Infobox settlementAnna bụ obodo dị na Shelby County, Ohio, United States. Ndị bi na ya dị otu puku, narị anọ na iri asaa na Ọnụ ọgụgụ mmadụ nke afọ 2020 emere.

Akụkọ Mmalite Ya[dezie | dezie ebe o si]

Oge tupu akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Osimiri Teays nke oge ochie gafere Anna nke oge a ihe dị ka ǹdè afọ abụọ gara aga. Osimiri Teays debere ihe ndị na-adịghị n'otu n'elu akara Greenville nke mepụtara nnukwu ebe ala ọma jijiji.   [citation needed]

Oge ụmụ amaala America[dezie | dezie ebe o si]

Dị ka ụmụ amaala America si kwuo, Tecumseh gbalịrị ịmalite njikọ aka ya n'ihe bụ Anna ugbu a. Ọtụtụ agbụrụ Shawnee na Miami jụrụ onyinye ahụ. A na-ekwu na ọ bụrụ ala ahụ ọnụ. Ọbụbụ ọnụ ahụ kwuru na ala ahụ ga-abụ mgbe ọ bụla ịma jijiji ga na-eme na ya.[1]

Ebe obibi[dezie | dezie ebe o si]

E mere ebe obibi mbụ nke ndị ọcha na Anna n'afọ 1830. [2] A kpụrụ Anna n'afọ1868, ma gụọ ya aha Anna Thirkield. E hiwere obodo a n'afọ 1877. [3]

Ala ọma jijiji nke afọ 1937[dezie | dezie ebe o si]

Na Machị 9, 1937, ala ọma jijiji kachasị ukwuu e dekọrọ na Ohio mere ebe ụlọ akwụkwọ sekọndrị na ụlọ akwụkwọ etiti guzo ugbu a. A tụrụ ya n'ihe ọtụtụ Richter magnitude scale, o wee gụọ 5.4 ebe ihe mmebi dị na ike VIII dị ka ihe ọtụtụ Mercalli. intensity Scale dị gosi. E nwere mmetụta nke ọma jijiji a ruo n'ebe dị ezigbo anya dị ka Chicago, Illinois, na Toronto, Ontario. Ọma jijiji ahụ sochiri ihe yiri nke ahụ mana dịtụ fecha fecha nke mere n'otu izu gara aga, na Machị 2. Chọọchị Lutheran na nke Metọdist mebiri nke ukwuu; Chọọchị Lutheran mechara tinye ígwè n'elu ụlọ ya iji chebe ya pụọ na ala ọma jijiji n'ọdịnihu. Ụlọ akwụkwọ ahụ mpaghara ya mebiri ghọziri ihe efu nye obodo ahụ, ewee wughachi ya. Ụlọ nzukọ obodo ahụ mebiri nke ukwuu nke na a katọrọ ụlọ nke elu ya, ejibekwaghị ya mee ihe kemgbe ahụ.

Mpaghara Shelby County enweela ọ dịkarịa ala, ala ọma jijiji dị iri anọ n'ọnụ ọgụ kemgbe 1875. [4]

Ọdịdị ala[dezie | dezie ebe o si]

Dị ka United States Census Bureau si kwuo, obodo ahụ nwere ngụkọta nke 1.03 square miles (2.67km²), ala niile.[5]

Ụlọ ọrụ mmepụta ihe[dezie | dezie ebe o si]

Anna bụ ebe ụlọ ọrụ Honda nke America Manufacturing (HAM) nke na-emepụta injin na ihe ndị ọzọ maka ọtụtụ ụgbọala Honda.

Agumakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Ụlọ akwụkwọ ndị dị na Anna dị n'ụlọ atọ dị iche iche: elementrị n'otu, etiti n'otu, nke sekọndrị n'otu.

Anna nwere ọbá akwụkwọ maka ọha na eze, alaka nke ọbá akwụkwọ Shelby County.[6]

Ọnụ ọgụgụ mmadụ[dezie | dezie ebe o si]

 

Ọnụ ọgụgụ mmadụ nke afọ 2000[dezie | dezie ebe o si]

Ruo mgbe emere ọnụ ọgụgụ nke ndị mmadụ nke afọ 2000, enwere ndị mmadụ dị otu puku, narị atọ na iri na itoolu, ụlọ Obibi dị narị anọ na iri asaa na anọ, na ezinụlọ dị narị atọ na iri isii na ise bi n'obodo ahụ. Ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na nchịkọta bụ ndị mmadụ 1576.7 n'ókere ala square meter obụla (608.8/km²). Enwere ụlọ obibi dị narị anọ na iri asatọ na atọ kna nchịkọta 577.4 kwa ókere ala square meter obụla (222.9/km²).Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:Convert/data' not found. Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:Convert/data' not found.. Agbụrụ ndị mejupụtara obodo ahụ bụụrụ pasentị 96.59 Ndị Ọcha, pasentị 0.38 Ndị America dị oji, pasentị 0.15 Ndị bụ ndị America, pasentị 1.36 Ndị Asia, pasentị 0.23 Pacific Islander, pasentị 0.23 from si agbụrụ ndị ọzọ, na pasentị 1.06 sitere n'òtù agbụrụ maọbu abụọ. Ndị Hispan maọbu ndị Latino nke agbụrụ obụla bụụrụ pasentị 0.53 nke ndị bi n'obodo ahụ.

E nweere ụlọ obibi dị narị anọ na iri asaa na anọ, nke pasentị 46.2 n'ime ha nwere ụmụaka na-erubeghị afọ iri na asatọ ha na ha bi, pasentị 62 bụ ndị di na nwunye bi, pasentị 11.4 nwere nwanyị nwe ụlọ na-enweghị di, ebe pasentị 22.8 bụ ndị na-abụghị ezinụlọ. Pasentị 19.6 nke ezinụlọ niile bụ ndị mmadụ n'otu n'otu, ebe pasentị 6.3 nwere onye bi naanị ya nke dị afọ iri isii na ise ma ọ bụ karịa. Nkezi ọnụ ọgụgụ ezinụlọ bụ 2.78 ebe nkezi ọnụ ọgụgụ ezinaụlọ bụ 3.20.

N'ime obodo ahụ, ndị bi ebe ahụ ka agbasara ọnụ ọgụgụ ha, pasentị 32.3 dị n'okpuru afọ iri na asatọ, pasentị 7.6 sitere na afọ iri na asatọ ruo afọ iri abụọ na anọ, pasentị 33.5 sitere na afọ iri abụọ na ise ruo afọ iri anọ na anọ, pasentị 19.3 site na 45 ruo 64, ebe pasentị 7.4 bụ ndị dị afọ 65 ma ọ bụ karịa. Nkezi afọ ọnọnetiti bụ afọ 31. Maka 100 ụmụ nwanyị ọ bụla, e nwere ụmụ nwoke 99.8. Maka 100 ụmụ nwanyị ọ bụla dị afọ 18 ma ọ bụ karịa, e nwere ụmụ nwoke 94.1.

Nkezi ego ezinụlọ na-enweta n'ime obodo ahụ bụ $48,676, nkezi ego ezinụlọ nwetara bụ $ 51,797. Ndị nwoke nwere ọkara ego nke $ 36,250 na $ 25,463 maka ụmụ nwanyị. Ego otu onye na-enweta n'obodo ahụ bụ $19,835. Ihe dị ka pasentị 3.4 nke ezinụlọ na pasentị 3.6 nke ndị bi na ya nọ n'okpuru akara ịda ogbenye, gụnyere 2.7 nke ndị na-erubeghị afọ iri na asatọ na 3.8% nke ndị dị afọ 65 ma ọ bụ karịa.

Ọnụ ọgụgụ mmadụ nke afọ 2010[dezie | dezie ebe o si]

Ka ọ na-erule ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ [7] nke afọ 2010, e nwere ndị mmadụ 1,567, ọnụ ama 551, na ezinụlọ 429 bi n'ime obodo ahụ. Ọnụ ọgụgụ ndị bi na ya bụ 1,521.4 ndị bi na square mile (587.4/km²). E nwere ụlọ obibi 589 na nkezi nke 571.8 kwa square mile (220.8/km²). Agbụrụ ndị mejupụtara obodo ahụ bụ pasentị 97.4 ndị ọcha, pasentị 0.4 ndị America dị oji, pasentị 0.4 ndị bụ ndị America, pasentị 0.2 ndị Asia, pasentị 0.1 si agbụrụ ndị ọzọ, na pasentị 1.5 si agbụrụ abụọ ma ọ bụ karịa. Ndị Hispanic ma ọ bụ Latino nke agbụrụ ọ bụla bụ pasentị 0.6 nke ndị bi na ya.

E nwere ezinụlọ 551, nke pasentị 47.5 n'ime ha nwere ụmụaka na-erubeghị afọ iri na asatọ ha na ha bi, pasentị 57.4 bụ di na nwunye bi, pasentị 13.8 nwere nwanyị nwe ụlọ na-enweghị di, pasentị 6.7 nwere nwoke nwe ụlọ na na-enweghị nwunye, na pasentị 22.1 bụ ndị na-abụghị ezinụlọ. Pasentị 18.0 nke ezinụlọ niile bụ ndị mmadụ n'otu n'otu, ebe pasentị 6.7 nwere onye bi naanị ya nke dị afọ iri isii na isema ọ bụ karịa. Nkezi ọnụ ọgụgụ ezinụlọ bụ 2.84 na nkezi ọnụ ọgụgụ ezinaụlọ bụ 3.20.

Nkezi afọ ndụ n'ime obodo ahụ bụ afọ 31.1. 33.4% nke ndị bi ebe ahụ erubeghị afọ 18; 7.2% nọ n'agbata afọ 18 na 24; 30.5% nọ site na 25 ruo 44; 21.9% nọ site na 45 ruo 64; na 7.1% dị afọ 65 ma ọ bụ karịa. Mmekọahụ nwoke na nwanyị nke obodo ahụ bụ 48.4% ụmụ nwoke na 51.6% ụmụ nwanyị.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Earthquake. www.anna.k12.oh.us. Archived from the original on May 11, 2015. Retrieved on February 12, 2016.
  2. Overman (1958). Ohio Town Names. Akron, OH: Atlantic Press. 
  3. Hitchcock (1913). History of Shelby County, Ohio, and representative citizens. 
  4. Resources. Ohio Department of Natural Resources. www.dnr.state.oh.us.
  5. US Gazetteer files 2010. United States Census Bureau. Archived from the original on January 25, 2012. Retrieved on January 6, 2013.
  6. Locations. Shelby County Libraries. Archived from the original on March 13, 2018. Retrieved on March 3, 2018.
  7. U.S. Census website. United States Census Bureau. Retrieved on January 6, 2013.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Shelby County, Ohio